Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

2 Chronicles 17 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 His son Jehoshaphat became king in his place and strengthened himself against Israel. Jehoshafat nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya, o mere onwe ya ka ọ dị ike imegide Izrel.
2 He stationed troops in all Judah's fortified cities and garrisons in the land of Judah and in the cities of Ephraim that his father Asa had captured. O tinyere ụfọdụ ndị agha ya nʼobodo niile dị na Juda e wusiri ike, tinyekwa ụfọdụ nʼobodo ndị ọzọ dị nʼIfrem, na ebe ndị ọzọ niile nke nna ya, Asa meriri nʼagha.
3 Our Father was with Jehoshaphat, for he walked his father David's earlier ways, not seeking the Baals. Onyenwe anyị nọnyeere Jehoshafat nʼihi na o sooro nzọ ụkwụ nna ya, bụ Devid, onye buuru ya ụzọ chịa. Ọ jụghị ase site nʼaka Baal,
4 Instead, he sought the Father his father served, obeyed his commandments, and not the practices of Israel. kama ọ chọrọ Onyenwe anyị, Chineke nna ya, dobekwa iwu ya niile, ọ bụghịkwa dịka omume ndị Izrel si dị.
5 So our Father secured the kingdom in his hand; all Judah brought gifts to Jehoshaphat, and he had great wealth and honor. Nʼihi nke a Onyenwe anyị mere ka ọchịchị ya guzosie ike. Ndị Juda niile tụkwara ụtụ ha dịka o kwesiri wetara Jehoshafat, nke a mere ka o nwee akụnụba ebe ọ dị ukwuu, nwekwa nsọpụrụ.
6 His heart was devoted to our Father's ways; he removed the high places and Asherah poles from Judah. O ji obi ya niile gbasoo ụzọ Onyenwe anyị. Ọzọkwa, o sitere na Juda wezuga ebe niile dị elu nakwa ogidi Ashera niile.
7 In his reign's third year he sent his officials Ben-hail, Obadiah, Zechariah, Nethanel, and Micaiah to teach in Judah's cities, Nʼafọ nke atọ nke ọchịchị ya, o zipụrụ ndịisi ọchịchị alaeze ya ndị a, Ben-Hail, Ọbadaya, Zekaraya, Netanel na Mikaya ka ha gaa zie ndị mmadụ ihe nʼobodo niile nke Juda.
8 and the Levites with them: Shemaiah, Nethaniah, Zebadiah, Asahel, Shemiramoth, Jehonathan, Adonijah, Tobijah, Tob-adonijah; and with them the priests Elishama, Jehoram. Ụfọdụ ndị Livayị ndị a sokwa gaa: Shemaya, Netanaya, Zebadaya, Asahel, Shemiramot, Jehonatan, Adonaịja, Tobaija, Tob-Adonaịja na ndị nchụaja ụfọdụ, ndị dị ka Elishama na Jehoram.
9 They taught throughout Judah, carrying the Book of our Father's Instruction, going to all Judah's cities, teaching the people. Ha ji akwụkwọ iwu Onyenwe anyị, zie ihe na Juda. Ha jere gburugburu obodo niile nke Juda na-ezi ndị mmadụ ihe.
10 The dread of our Father fell on all the kingdoms around Judah, so they made no war on Jehoshaphat. Egwu Onyenwe anyị dakwasịrị alaeze niile dị gburugburu Juda, nʼihi ya, ha ebukwaghị agha megide Jehoshafat.
11 Some Philistines brought Jehoshaphat gifts and silver tribute; the Arabs brought flocks: 7,700 rams, 7,700 male goats. Ụfọdụ nʼime ndị Filistia wetaara ya onyinye na ọlaọcha kwa afọ nʼụzọ ịkwanyere ya ugwu, ma ndị Arab, wetaara ya igwe anụ ụlọ dị puku ebule asaa na narị asaa, na puku mkpi asaa na narị asaa.
12 Jehoshaphat grew more and more powerful, and he built fortresses and storage cities in Judah. Ya mere, Jehoshafat ghọrọ eze dị ike. O wusiri obodo ndị dị na Juda ike, wukwaa obodo ịchịkọba ihe.
13 He had large supplies in the cities of Judah, and mighty warriors in Jerusalem. O nwekwara ihe ndị ọ chịkọbara nʼọtụtụ obodo Juda. O debekwara ndị agha ibu agha doro anya nʼime Jerusalem.
14 Their enrollment by ancestral house: from Judah, commanders of thousands—Adnah the commander, with him 300,000 mighty warriors; Ngụkọta ha dịka e si dekọọ ya nʼezinaụlọ si dị: Ndị si Juda, ndịisi agha na-achị puku ndị agha (1,000), Adna, onyeisi agha, na-achị narị puku ndị agha atọ (300,000),
15 next to him was Jehohanan the commander, and with him 280,000; onye na-eso ya bụ Jehohanan, onyeisi agha, na-achị narị puku ndị agha abụọ na iri puku asatọ (280,000),
16 next Amasiah son of Zichri, who volunteered for our Father, with him 200,000 mighty warriors. ọzọ, Amasiya nwa Zikri, onye ji afọ ofufu nye onwe ya maka ọrụ Onyenwe anyị, na-achị narị puku ndị agha abụọ (200,000).
17 From Benjamin: Eliada, a mighty warrior, and with him 200,000 armed with bow and shield; Ndị si Benjamin, Eliada, dimkpa nʼagha, na-achị narị puku ndị agha abụọ (200,000), ndị ji akụ na ụta, na ọta ebu agha.
18 next to him Jehozabad, and with him 180,000 equipped for war. Onye ọzọ bụ Jehozabad, onye na-achị narị puku ndị agha na iri puku asatọ (180,000), ndị jikeere ibu agha.
19 These men served the king, besides those he stationed in the fortified cities throughout Judah. Ndị a bụ ndị ikom na-ejere eze ozi, nʼagụnyeghị ndị ahụ o tinyere ka ha nọdụ nʼobodo niile e wusiri ike dị nʼime Juda.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]