Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

2 Chronicles 16 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 In Asa's thirty-sixth year, Baasha king of Israel invaded Judah, fortifying Ramah to keep anyone from leaving or entering Asa king of Judah's territory. Nʼafọ nke iri atọ na isii nke ọchịchị Asa, Baasha eze Izrel, busoro Juda agha, wuchie Rema igbochi onye ọbụla na-apụ apụ maọbụ onye na-abata abata nʼoke ala Asa, eze Juda.
2 Asa took silver and gold from the storerooms of our Father's house and the royal house, and sent them to Ben-Hadad king of Aram, living in Damascus, with this message: Mgbe ahụ, Asa chịịrị ọlaọcha na ọlaedo niile dị nʼụlọakụ ụlọnsọ Onyenwe anyị, na ndị dị nʼụlọeze ya, zigara Ben-Hadad, eze Aram, onye na-achị na Damaskọs, sị,
3 "Let there be a treaty between me and you, as there was between my father and your father. See, I'm sending you silver and gold. Go now and break your treaty with Baasha king of Israel, so he withdraws from me." “Biko, ka anyị gbaa ndụ dịka nna m na nna gị mere. Lee, ana m ezitere gị ọlaọcha na ọlaedo. Ugbu a, mebie ọgbụgba ndụ dị nʼetiti gị na Baasha, bụ eze Izrel, ka o si nʼebe m nọ wezuga onwe ya.”
4 Ben-Hadad agreed with King Asa and sent his army commanders against Israel's cities. They struck down Ijon, Dan, Abel-maim, and all Naphtali's store cities. Ben-Hadad kwenyere eze Asa, zipụ ndị ọchịagha ndị agha ya ka ha gaa buso obodo Izrel niile agha. Ha lụgburu Ijon, Dan, Ebel-Maim na obodo niile a na-achịkọbata ihe dị na Naftalị.
5 When Baasha heard of it, he stopped fortifying Ramah and abandoned his work. Mgbe Baasha nụrụ nke a, ọ kwụsịrị iwu Rema, hapụkwa ọrụ ya.
6 King Asa mustered all Judah; they carried off the stones and timber Baasha had fortified Ramah with, and with them he fortified Geba and Mizpah. Mgbe ahụ, eze Asa chịịrị ndị ikom niile nke Juda. Ha bịara bupusịa nkume na osisi niile dị na Rema, nke Baasha ji na-ewu ihe. O ji ihe ndị a wulie Geba na Mizpa.
7 Then Hanani the seer came to Asa king of Judah and said to him, "Because you relied on Aram's king and not your Father, his army escaped your hand. Nʼoge ahụ Hanani, bụ onye ọhụ ụzọ bịakwutere Asa, bụ eze Juda sị ya, “Ebe ọ bụ na ị hapụrụ Onyenwe anyị Chineke gị, tụkwasị eze Aram obi, lee na usuu ndị agha Siria esitela nʼaka gị wezuga onwe ha.
8 Weren't Cushites and Libyans a vast army with countless chariots and horsemen? Because you relied on your Father, he gave them to you. Ndị Kush na ndị Libịa, ha abụghị usuu ndị agha ji ọtụtụ ụgbọ agha, na ndị na-agba ịnyịnya? Ma mgbe ị dabeere na Onyenwe anyị, o nyefere ha nʼaka gị.
9 For our Father's eyes scan the whole earth, to strengthen those whose heart is fully devoted to him. You acted foolishly in this; from now on you will have wars." Nʼihi na anya Onyenwe anyị na-agazu ụwa niile, ịgba ha ume bụ ndị obi ha zuruoke nʼebe ọ nọ. I meela omume nzuzu na nke a, site ugbu a gaa nʼihu ị ga na-enwe agha.”
10 Asa raged at the seer for this and jailed him in the stocks, for he was furious with him about it; he also brutally oppressed some people at that time. Iwe were Asa megide onye ọhụ ụzọ a nʼihi nke a; iwe were ya nke ukwuu nke mere na ọ tụnyere Hanani nʼụlọ mkpọrọ. Sitekwa nʼoge ahụ, Asa bidoro imekpa ụfọdụ nʼime ndị ya ahụ.
11 Asa's acts, first to last, are written in the Book of the Kings of Judah and Israel. Ihe banyere ihe ọzọ niile nʼoge ọchịchị Asa, site na mmalite ruo ọgwụgwụ ka e dere nʼime akwụkwọ ndị eze Juda na Izrel.
12 In his thirty-ninth year of reign, Asa's feet grew diseased, the disease severe. Yet even in his illness he did not seek our Father, but only the doctors. Nʼime iri afọ atọ na itoolu nke ọchịchị ya, eze Asa rịara ọrịa nke metụtara ụkwụ ya abụọ. Ọ bụ ezie na ọrịa a siri nọọ ike ma nʼime ọnọdụ ya ọ chọghị enyemaka site nʼaka Onyenwe anyị kama ọ bụ naanị ndị dibịa ka o jekwuru.
13 Then Asa rested with his fathers, dying in the forty-first year of his reign. Asa nwụrụ nʼiri afọ anọ na otu nke ọchịchị eze ya, sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ.
14 They buried him in his own tomb, cut for himself in the City of David, laid him on a funeral bed covered with spices and various blended perfumes prepared by skilled perfumers, and lit a great fire for him. Ha liri ya nʼili nke ọ waara onwe ya nʼobodo Devid. Ha dobere ya nʼelu ihe ịdọba ozu nke jupụtara na ụda dị iche iche, na mmanụ na-esi isi ụtọ nke a gwọkọtara nke ọma, surekwara ya ihe nsure ọkụ nʼebe ọ dị ukwuu iji kwanyere ya ugwu.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]