Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

2 Chronicles 15 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 The Spirit of our Father came upon Azariah son of Oded. Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke dakwasịrị Azaraya nwa Oded.
2 He went out to meet Asa and said to him, "Hear me, Asa and all Judah and Benjamin: our Father is with you while you're with him. If you seek him, you will find him; if you abandon him, he will abandon you. Ọ pụrụ jekwuru Asa sị ya, “Geenụ m ntị, gị Asa na ndị Juda niile na Benjamin. Onyenwe anyị ga-anọnyere unu oge niile unu na-eme okwu ya. Unu ga-achọta ya mgbe ọbụla unu chọrọ ya. Ma ọ ga-agbakụta unu azụ oge ọbụla unu nupuru isi nʼiwu ya.
3 For a long time Israel was without our Father, without a teaching priest, and without law. Ma ọtụtụ oge dị anya ndị Izrel nọ na-enweghị Chineke nke ezie, ha enweghịkwa onye nchụaja ga-ezi ihe, ha enweghịkwa iwu Chineke
4 In their distress they turned to our Father, the God of Israel, sought him, and they found him. Ma mgbe ọbụla ha chigharịkwutere Onyenwe anyị, Chineke Izrel tikuo ya nʼime mkpagbu ha, ọ na-enyere ha aka.
5 In those times no one going out or coming in was safe, for great turmoil struck all living in the lands. Nʼoge ahụ, ọ dịghị udo dịrị onye ọbụla na-apụ apụ ịgagharị nʼobodo, maka na ndị niile bi nʼala ahụ nọ nʼọnọdụ oke ọgbaaghara.
6 Nation crushed nation and city crushed city, for our Father troubled them with every kind of distress. Otu obodo na-azọpịa obodo ọzọ ebe otu mba na-emegidekwa mba ọzọ nʼihi na Chineke ji nsogbu dị iche iche megide ha.
7 But you, be strong; do not lose heart, for your work will be rewarded." Ma unu ndị Juda, unu adala mba nʼọrụ ọma unu, nʼihi na a ga-akwụ unu ụgwọ ọrụ unu.”
8 When Asa heard these words, the prophecy of Oded the prophet, he took courage and removed the detestable idols from all the land of Judah and Benjamin, and from the cities he had captured in the Ephraim hill country. He restored the altar of our Father in front of his temple entrance. Mgbe Asa nụrụ okwu ndị a, bụ amụma Azaraya nwa Oded, ọ bụ onye a gbara ume. O wepụrụ ihe arụ niile dị nʼala Juda na Benjamin na nke dị nʼobodo niile ahụ o meriri nʼagha ndị dị nʼugwu Ifrem. Ọ wuziri ebe ịchụ aja Onyenwe anyị, nke dị nʼihu mpụta ọnụ ụlọ ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị.
9 He gathered all Judah and Benjamin, plus those from Ephraim, Manasseh, and Simeon living among them, since many in Israel had crossed over to him when they saw our Father was with him. Mgbe ahụ, Asa kpọrọ ndị Juda na Benjamin niile oku, ha na ndị ọbịa niile si Izrel, nʼihi na ọtụtụ sitere nʼala Ifrem na Manase, na Simiọn gbafeta Juda, mgbe ha hụrụ na Onyenwe anyị Chineke nọnyeere Asa.
10 They assembled at Jerusalem in the third month of the fifteenth year of Asa's reign. Ha niile zukọrọ na Jerusalem nʼọnwa nke atọ nʼafọ nke iri na ise nke ọchịchị eze Asa.
11 That day they sacrificed to our Father from the plunder—700 oxen and 7,000 sheep. Nʼoge ahụ, ha ji narị ehi asaa na puku atụrụ na ewu asaa, chụọrọ Onyenwe anyị aja nʼụbọchị ahụ. Anụmanụ ndị a so nʼihe ha kwatara nʼagha.
12 They covenanted to seek our Father, God of their ancestors, with all their heart and with all their soul. Emesịa, nʼụbọchị ahụ, ha gbara ndụ, kpebie na ọ bụ naanị Onyenwe anyị Chineke nna ha ka ha ga-efe.
13 Whoever would not seek our Father, the God of Israel, was to be put to death, whether small or great, whether man or woman. Ha kpebikwara na onye ọbụla nke na-agaghị efe Onyenwe anyị, Chineke Izrel ga-anwụ, ma onye ahụ ọ bụ nwoke maọbụ nwanyị, nwantakịrị maọbụ okenye.
14 They swore to our Father with a loud voice, with shouting, and with trumpets and horns. Ha niile ji oke olu na iti mkpu na opi na opi ike, ṅụọrọ Onyenwe anyị iyi.
15 All Judah rejoiced over the oath, for they swore with their whole heart, sought him with their whole desire, and found him. And our Father gave them rest on every side. Ndị Juda niile ṅụrịrị ọṅụ nʼihi na ha ji obi ha niile ṅụọ iyi a. Ha jikwa obi ha niile chọọ Chineke. O mere ka ha chọta ya. Onyenwe anyị nyekwara ha udo nʼakụkụ niile.
16 King Asa also removed his mother Maacah from being queen mother, because she had made a detestable image for Asherah; he cut it down, ground it to dust, and burned it in the Kidron Valley. Eze Asa chụdakwara nne nne ya bụ Maaka, site nʼọnọdụ ya dịka nne eze, nʼihi na ọ kpụrụ ihe arụ, ogidi Ashera maka iji fee ya ofufe. Asa gbuturu ya, sụpịa ya, kpọọ ya ọkụ na ndagwurugwu iyi Kidrọn.
17 Though the high places were not removed from Israel, Asa's heart remained wholly devoted throughout his life. Ọ bụ ezie na o wezugaghị ugwu niile dị elu site nʼIzrel, ma Asa ji obi zuruoke jere Onyenwe anyị ozi nʼoge ndụ ya niile
18 He brought into our Father's house his father's dedicated gifts and his own dedicated gifts—silver, gold, and utensils. O webatara nʼime ụlọnsọ ukwu Chineke, ọlaọcha na ọlaedo na ihe niile, nke nna ya na ya onwe ya doro nsọ.
19 And there was no war until the thirty-fifth year of Asa's reign. Ọ dịkwaghị agha ọzọ a lụrụ tutu ruo nʼafọ iri atọ na ise nke ọchịchị eze Asa na Juda.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]