Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

2 Chronicles 14 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Abijah rested with his ancestors; they buried him in the City of David. His son Asa became king, and the land had peace ten years. Abija sooro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼobodo Devid. Asa, nwa ya nwoke ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. Udo dịkwa afọ iri nʼụbọchị ịbụ eze ya.
2 Asa did what was good and right in the sight of our Father. Asa mere ihe dị mma na nke ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị bụ Chineke ya.
3 He removed the foreign altars and high places, smashed the sacred pillars, and cut down the Asherah poles. Ọ wezugakwara ebe ịchụ aja nke chi ọzọ niile dị nʼugwu, tipịa ogidi nsọ niile, gbujasịakwa ogidi Ashera.
4 He commanded Judah to seek our Father, the God of their ancestors, and keep the law and commandment. O nyere Juda iwu ka ha chọọ Onyenwe anyị Chineke nke nna ha, ka ha debekwa iwu ya na ụkpụrụ ya niile.
5 He also removed the high places and incense altars from all Judah's cities, and the kingdom was at peace under him. O wezugakwara ebe niile a na-efe arụsị nʼelu ugwu, bibiekwa ebe niile a na-esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼobodo Juda. Alaeze ahụ nwekwara udo nʼokpuru ọchịchị ya.
6 He built fortified cities in Judah, for the land was at peace. He fought no war those years, because our Father gave him rest. O wuru ọtụtụ obodo e ji mgbidi gbaa gburugburu nʼala Juda niile. O nweghị onye busoro ya agha, nʼihi na Onyenwe anyị nyere ya udo.
7 He told Judah, "Let us build these cities and surround them with walls, towers, gates, and bars. The land is still ours, because we sought our Father; we sought him, and he gave us rest all around." So they built and thrived. Nʼihi nke a, ọ gwara ndị Juda sị ha, “Ugbu a ka anyị kwesiri iwu obodo ndị a. Ka anyị wuokwa mgbidi gburugburu ha, wuokwa ụlọ elu nche, tinyesịa ha niile ibo ọnụ ụzọ ama, na mkpọrọ e ji akpọchi ya, ala a bụ nke anyị, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke onye anyị ji obi anyị chọsie ike enyela anyị udo.” Ya mere, ha wuru ihe ndị a niile nwekwa ọganihu.
8 Asa had an army of 300,000 from Judah with large shields and spears, and 280,000 from Benjamin with shields and bows—all mighty warriors. Ọnụọgụgụ ndị agha Asa ndị si Juda nʼoge ahụ bụ narị puku atọ. Ngwa agha ha ji bụ ọta ukwu na ùbe. Ndị agha ya ọzọ si Benjamin dị narị puku abụọ na iri puku mmadụ asatọ. Ndị a jikwa ọta na ụta. Ndị agha ndị a niile bụ ndị a zụziri azụzi, bụrụkwa ndị dị ike.
9 Zerah the Cushite marched against them with a million troops and 300 chariots, advancing to Mareshah. Zera, bụ onye Kush duru puku kwụrụ puku, na narị ụgbọ agha atọ, bịaruo Maresha ibuso Juda agha.
10 Asa marched out against him, and they lined up for battle in the Valley of Zephathah at Mareshah. Asa pụrụ izute ya. Ha doro onwe ha nʼusoro ibu agha na Ndagwurugwu Zefata nke dị Maresha nso.
11 Then Asa cried to our Father his God: "Father, only you can help the powerless against the mighty. Help us, our God, for we rely on you, and in your name we face this vast horde. You are our God; let no mere man prevail against you." Mgbe ahụ, Asa kpọkuru Onyenwe anyị Chineke ya, si, “Onyenwe anyị ọ dịghị onye dịka gị nʼinyere onye na-adịghị ike aka nʼihu onye dị ike nke ukwuu. Nyere anyị aka, O Onyenwe anyị Chineke anyị, nʼihi na anyị dabere na gị. Ọ bụkwa nʼaha gị ka anyị na-apụ ibuso igwe a agha. O Onyenwe anyị i bụ Chineke anyị. Ekwela ka ọ bụrụ na mmadụ efu meriri gị.”
12 So our Father struck down the Cushites before Asa and before Judah, and the Cushites fled. Onyenwe anyị tigbukwara ndị Kush niile ahụ nʼihu Asa na Juda. Ndị Kush gbakwara ọsọ.
13 Asa and his people pursued them to Gerar, and the Cushites fell until none survived, for they were shattered before our Father and his army. Judah's men carried off great plunder. Asa na ndị agha ya chụrụ ha ọsọ chụruo ha obodo Gera ebe ọtụtụ ndị Kush dara, ruo na o nwekwaghị onye fọdụrụ ndụ nʼime ha. E tigburu ha nʼihu Onyenwe anyị na ndị agha ya. Ndị Juda bukọọrọ ọtụtụ ihe nkwata nʼagha dị iche iche.
14 They struck down all the cities around Gerar, for the terror of our Father had fallen on them. They looted all the cities, since much plunder was in them. Ha bibiri obodo niile gbara Gera gburugburu, nʼihi na egwu Onyenwe anyị dakwasịrị obodo ndị ahụ niile. Ndị Juda bukọọrọ ọtụtụ ihe nkwata nʼihi na ọtụtụ ihe dị nʼobodo ndị ahụ.
15 They also attacked the herdsmen's tents, carried off many sheep and camels, and returned to Jerusalem. Ha busokwara ebe obibi ndị na-azụ anụ ụlọ agha, chikọrọ igwe atụrụ na ewu na ịnyịnya kamel. Emesịa ha laghachiri Jerusalem.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]