Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

2 Chronicles 13 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 In the eighteenth year of King Jeroboam, Abijah became king of Judah. Abija malitere ịbụ eze Juda, nʼafọ iri na asatọ nke ọchịchị eze Jeroboam.
2 He reigned three years in Jerusalem; his mother was Micaiah, Uriel of Gibeah's daughter. Abijah and Jeroboam went to war. Ọ chịrị afọ atọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Maaka, otu nʼime ụmụ nwanyị Uriel, onye Gibea. Agha dịgidere nʼetiti Abija na Jeroboam.
3 Abijah joined battle with an army of 400,000 chosen warriors, mighty in war; Jeroboam lined up against him with 800,000 chosen, mighty warriors. Abija họpụtara ndị ya dị ike nʼagha bụ ndị ọnụọgụgụ ha dị narị puku anọ, ma Jeroboam eze Izrel họpụtara ndị agha ọnụọgụgụ ha dị narị puku asatọ doo ha nʼusoro.
4 Abijah stood on Mount Zemaraim in Ephraim's hill country and said, "Hear me, Jeroboam and all Israel! Abija guzoro nʼugwu Zemaraim nʼala ugwu ugwu Ifrem jiri oke olu sị “Jeroboam na ndị Izrel niile geenụ m ntị!
5 Don't you know our Father, the God of Israel, gave David and his sons Israel's throne forever, by a covenant of salt? Unu amataghị na Onyenwe anyị Chineke nke Izrel esitela nʼọgbụgba ndụ nnu nyefee ọchịchị ala Izrel niile nʼaka Devid na ụmụ ụmụ ya ruo ebighị ebi?
6 But Jeroboam son of Nebat—a servant of Solomon son of David—rose and rebelled against his master. Ma Jeroboam, nwa Nebat, bụ onye ọrụ Solomọn nwa Devid, nupuru isi megide onyenwe ya.
7 Worthless men gathered around him, defying Solomon's son Rehoboam, young and timid, unable to resist them. Ndị efu niile na-abaghị uru chịkọtara onwe ha gbaa ya gburugburu guzogide Rehoboam nwa Solomọn, mgbe ọ bụ nwantakịrị na onye na-enweghị ike inwe mkpebi, onye nʼadịghịkwa ike iguzogide ha.
8 Now you think you can resist our Father's kingdom in David's sons' hands, since you're a huge crowd with the golden calves Jeroboam made as your gods. “Ma ugbu a, unu ejikerela imegide alaeze Onyenwe anyị nke dị nʼaka ụmụ ụmụ Devid. Nʼezie, unu bu igwe ndị agha bara ụba, nʼetiti unu ka ụmụ ehi ọlaedo ahụ dịkwa, bụ nke Jeroboam mere ka ha buru chi unu.
9 Haven't you driven out our Father's priests, Aaron's sons and the Levites, and made your own priests like other nations? Anyone who comes with a young bull and seven rams can become a priest of things that aren't gods. Ma unu achụpụghị ndị nchụaja Onyenwe anyị, bụ ụmụ Erọn, chụpụkwa ndị Livayị ma meere onwe unu ndị nchụaja dịka ndị mba ọzọ na-eme? Onye ọbụla ji nwa oke ehi na ebule asaa bịa ido onwe ya nsọ na-aghọrọ unu onye nchụaja nye ihe ndị ahụ na-abụghị chi.
10 But our Father is ours, and we haven't abandoned him. The priests serving him are Aaron's sons, and the Levites are at their work. “Ma banyere anyị, Onyenwe anyị bụ Chineke anyị, anyị ahapụbeghị ya. Ndị nchụaja na-ejere Onyenwe anyị ozi bụ ụmụ Erọn, ndị Livayị bụkwa ndị na-enyere ha aka.
11 Every morning and evening they burn to our Father burnt offerings and fragrant incense; they set rows of bread on the pure gold table and tend the gold lampstand, lit every evening. We keep our Father's charge, but you have abandoned him. Ha na-achụ aja nye Onyenwe anyị kwa ụtụtụ na anyasị niile, na-esurekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ; ma na-edobekwa achịcha edoro nsọ nʼelu tebul ahụ dị ọcha. Ha na-amụnyekwa ọkụ nʼiheọkụ ndị ahụ dị nʼelu ihe ịdọba oriọna ọlaedo kwa abalị niile. Nʼihi na anyị onwe anyị na-edebe iwu Onyenwe anyị Chineke anyị; ma unu onwe unu ahapụla ya, gbakụta ya azụ.
12 Look, our Father is with us at our head, and his priests have trumpets to sound alarm against you. Israelites, do not fight our Father, the God of your ancestors, for you will not prevail." Chineke nọnyeere anyị. Ọ bụkwa onyendu anyị. Ndị nchụaja ya ga-eji ịfụ opi ike tie mkpu agha megide unu. Unu ndị Izrel, unu alụsokwala Onyenwe anyị bụ Chineke nna unu ha ọgụ nʼihi na mmeri agaghị abụ nke unu!”
13 Jeroboam had sent an ambush around, to come from behind them; his forces faced Judah, the ambush behind them. Ma Jeroboam ezipụlarị ụfọdụ ndị agha ya ka ha ga ndị agha Juda nʼazụ. Mgbe Jeroboam nọ nʼihu ndị Juda, ụfọdụ ndị agha ya nọkwa ndị Juda nʼazụ.
14 Judah turned, saw battle facing them front and back, cried to our Father; the priests blew the trumpets. Mgbe ndị agha Juda tụgharịrị hụ na agha dị ha nʼihu dịkwa nʼazụ, ha tikuru Onyenwe anyị mkpu nzọpụta, ndị nchụaja fụkwara opi ike ha.
15 Judah's men shouted the war cry, and as they shouted, our Father struck Jeroboam and all Israel before Abijah and Judah. Ndị Juda tiri oke mkpu agha. Mgbe ha na-eti mkpu a, Chineke mere ka Abija na ndị Juda merie Jeroboam na ndị Izrel.
16 The people of Israel fled before Judah, and our Father handed them over to Judah. Ndị agha Izrel gbara ọsọ nʼihu ndị Juda, Chineke nyefere ha nʼaka ndị Juda.
17 Abijah and his army struck them a heavy blow; 500,000 chosen men of Israel fell dead. Abija na ndị agha ya gburu narị puku ndị Izrel ise nʼụbọchị ahụ.
18 So Israel was humbled then, and Judah prevailed because they relied on our Father, God of their ancestors. Ya mere, ntụkwasị obi nke Juda nwere nʼime Onyenwe anyị Chineke nna ha mere ka ha merie Jeroboam na ndị Izrel.
19 Abijah chased Jeroboam, capturing cities from him—Bethel and its villages, Jeshanah and its villages, Ephron and its villages. Abija chụkwara Jeroboam na ndị agha ya ọsọ dọta obodo ndị a nʼagha: Betel, na Jeshana, na Efrọn, na obodo niile gbara ha gburugburu.
20 Jeroboam never regained his strength during Abijah's lifetime, and our Father struck him down, and he died. Jeroboam enwetakwaghị ike ya ọzọ oge niile Abija nọ dịka eze. Ma ọ dịghị anya Onyenwe anyị tidara ya tigbuo ya.
21 But Abijah grew strong. He married fourteen wives and had twenty-two sons and sixteen daughters. Ma Abija gara nʼihu bụrụ onye dị ike, ọ lụrụ nwunye iri na anọ, mụọ iri ụmụ nwoke abụọ na abụọ, na ụmụ ndị nwanyị iri na isii.
22 The rest of Abijah's acts, his ways and sayings, are written in the prophet Iddo's commentary. Akụkọ niile banyere ọchịchị Abija, ihe o mere na ihe o kwuru, dị nʼakwụkwọ akụkọ nke Ido onye amụma dere.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]