Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

2 Chronicles 12 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 When Rehoboam's reign was secure and strong, he abandoned our Father's law, and all Israel with him. Ma mgbe e mere ka alaeze Rehoboam guzosie ike, mgbe ọ dịkwa ike, ọ hapụrụ iwu Onyenwe anyị ya na ndị Izrel niile.
2 In Rehoboam's fifth year, because they were unfaithful to our Father, Shishak king of Egypt attacked Jerusalem. Nʼihi na ha ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị, Shishak eze Ijipt busoro Jerusalem agha nʼafọ nke ise nke ọchịchị eze Rehoboam.
3 He came with 1,200 chariots, 60,000 horsemen, and countless troops from Egypt: Libyans, Sukkites, and Cushites. O ji otu puku ụgbọ agha na narị abụọ, na ndị agha na-agba ịnyịnya dị puku iri isii, na ndị agha ụkwụ ala, ndị a na-apụghị ịgụta ọnụ, ndị agha si Libịa, Sukim na Kush, ndị sooro ya site nʼala Ijipt.
4 He captured the fortified cities of Judah and came as far as Jerusalem. O merikwara obodo niile e wusiri ike nke Juda ma bịarukwaa Jerusalem.
5 Shemaiah the prophet came to Rehoboam and Judah's leaders, gathered in Jerusalem because of Shishak: "So says our Father: You abandoned me, so I abandon you to Shishak." Mgbe ahụ, Shemaya onye amụma bịakwutere Rehoboam na ndịisi Juda niile, ndị zukọtara na Jerusalem nʼihi egwu Shishak, sị ha, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, ‘Unu ahapụla m, nʼihi ya, ahapụkwala m unu, nyefee unu nʼaka Shishak.’ ”
6 Then the leaders of Israel and the king humbled themselves and said, "Our Father is righteous." Ndị ndu Izrel na eze wedara onwe ha nʼala sị, “Onye ezi omume ka Onyenwe anyị bụ.”
7 When our Father saw they had humbled themselves, our Father's word came to Shemaiah: "They've humbled themselves; I won't destroy them, but grant them a little rescue, and my anger won't pour out on Jerusalem through Shishak. Mgbe Onyenwe anyị hụrụ otu ha si weda onwe ha nʼala, okwu Onyenwe anyị bịakwutere Shemaya, sị, “Ebe ọ bụ na ha ewedala onwe ha nʼala, agakwaghị m ebibi ha kama aga m eme ka ha nwe nzọpụta ngwangwa. Agakwaghị m eji Shishak gosi Jerusalem oke iwe m.
8 But they will be Shishak's servants, to know my service and the service of earthly kingdoms." Ma otu ọ dị, ha ga-abụrụ ya ohu, ka ha nwe ike mata ọ dị iche dị nʼetiti ijere m ozi na ijere ndị eze ala ọzọ dị iche iche ozi.”
9 Shishak king of Egypt attacked Jerusalem and took everything—the treasures of our Father's house, the royal palace, including the gold shields Solomon made. Mgbe Shishak eze Ijipt busoro Jerusalem nʼagha; o bukọrọ akụ niile dị nʼime ụlọ Onyenwe anyị, na akụ niile dịkwa nʼụlọeze. Ọ kwakọọrọ ihe niile, werekwa ọta ọlaedo ndị ahụ Solomọn kpụrụ.
10 Rehoboam replaced them with bronze shields, entrusted to the guard commanders watching the entrance to the king's house. Ma eze Rehoboam kpụrụ ọta bronz i ji dochie ndị ahụ, nyefee ha nʼaka ndịisi ndị nche, bụ ndị na-eche nʼọnụ ụzọ ụlọeze nche ka a lekọta ha anya.
11 Whenever the king entered our Father's house, the guards carried the shields, then returned them to the guard chamber. Mgbe ọbụla eze na-aga nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ndị nche na-eso ya buru ọta ndị ahụ, emesịa, ha na-ebughachikwa ha nʼime ụlọ ndị nche.
12 When Rehoboam humbled himself, our Father's anger turned from him, not destroying him completely; good things remained in Judah too. Mgbe eze wedara onwe ya nʼala, iwe Onyenwe anyị na-eweso ya dajụrụ, Ọ laghịkwa ya nʼiyi kpamkpam. Nʼezie, ezi ihe fọdụkwara na Juda.
13 King Rehoboam strengthened himself in Jerusalem and reigned; forty-one when he became king, he reigned seventeen years in Jerusalem, the city our Father chose from all the tribes of Israel to place his name there. His mother was Naamah, an Ammonite. Eze Rehoboam mere onwe ya ka ọ dị ike na Jerusalem na-achịkwa ka eze. Ọ gbara iri afọ anọ na otu mgbe ọ malitere ịbụ eze, ọ chịrị afọ iri na asaa na Jerusalem, bụ obodo ahụ Onyenwe anyị họọrọ site nʼetiti ebo niile nke Izrel, bụ ebe ọ ga-akpọkwasị Aha ya. Aha nne ya bụ Naama, onye Amọn.
14 He did evil, because he did not set his heart to seek our Father. O mere ihe ọjọọ, nʼihi na ọ dịghị mgbe ọbụla o kpebiri nʼobi ya ịchọ Onyenwe anyị.
15 Rehoboam's deeds, first to last, appear in the records of Shemaiah the prophet and Iddo the seer, listing genealogies. Rehoboam and Jeroboam warred continually. Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Rehoboam, site na mmalite ruo ọgwụgwụ, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ nke Shemaya onye amụma na nke Ido onye ọhụ ụzọ, nke na-ahụ maka ihe banyere usoro ọmụmụ niile? Agha dịgidere nʼetiti Rehoboam na Jeroboam ụbọchị niile nke ndụ ha.
16 Rehoboam rested with his ancestors, buried in the City of David; his son Abijah reigned instead. Rehoboam sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼobodo Devid. Abija nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]