Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

2 Chronicles 11 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Rehoboam came to Jerusalem and assembled the house of Judah and Benjamin—180,000 chosen warriors—to fight against Israel and restore the kingdom to Rehoboam. Mgbe Rehoboam bịarutere Jerusalem, ọ kpọkọtara ndị ụlọ Juda niile na ndị ebo Benjamin, ha dị narị puku na iri asatọ nʼọnụọgụgụ, ụmụ okorobịa ndị tozuru ịga agha, ka ha gaa buso ụlọ Izrel agha ma weghachitekwa alaeze nʼokpuru ọchịchị Rehoboam.
2 But the word of our Father came to Shemaiah, the man of our Father, saying: Ma okwu Onyenwe anyị rutere Shemaya, onye nke Chineke ntị:
3 "Say to Rehoboam son of Solomon, king of Judah, and to all Israel in Judah and Benjamin: “Gwa Rehoboam, nwa Solomọn eze Juda, na Izrel niile nọ na Juda na Benjamin,
4 This is what our Father says: Don't go up or fight against your brothers. Go home, each of you—this came from me." So they obeyed the words of our Father and turned back from advancing against Jeroboam. Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Unu agakwala gaa buso ndị Izrel ibe unu agha. Laghachinụ, nwoke ọbụla nʼụlọ ya, nʼihi na ọ bụ m na-eme ihe ndị a.’ ” Ya mere, ha rubere isi nʼokwu niile nke Onyenwe anyị. Ha tụgharịrị laghachi azụ nʼịga megide Jeroboam.
5 Rehoboam lived in Jerusalem and built up cities for defense in Judah. Rehoboam bigidere na Jerusalem wusie obodo ndị dị na Juda ike nʼihi nchedo.
6 He built Bethlehem, Etam, and Tekoa, Obodo ndị a bụ Betlehem, Etam, Tekoa,
7 Beth-zur, Soco, Adullam, Bet Zoa, Soko, Adulam,
8 Gath, Mareshah, Ziph, Gat, Maresha, Zif,
9 Adoraim, Lachish, Azekah, na Adoraim, Lakish, Azeka
10 Zorah, Aijalon, and Hebron, the fortified cities in Judah and Benjamin. Zora, Aijalon na Hebrọn. Obodo ndị a bụkwa obodo ndị Juda na Benjamin e wusiri ike.
11 He strengthened the fortresses and put commanders in them, along with stores of food, oil, and wine. O wusiri ha ike tinye ndịisi agha nʼime ha, tinyekwa ihe oriri na mmanụ oliv na mmanya.
12 In every city he placed shields and spears, strengthening them greatly. So Judah and Benjamin remained his. O tinyere ọta na ùbe nʼebe niile a na-edebe ngwa agha nʼobodo niile, nʼihi iche obodo ya nke ọma, ebe ọ bụ naanị Juda na Benjamin nọ nʼokpuru ya.
13 The priests and the Levites who were throughout all Israel came to him from all their territory, Ma ndị nchụaja niile na ndị Livayị ndị sitere nʼakụkụ niile nke Izrel dịnyere ya.
14 for the Levites left their pasturelands and property, going to Judah and Jerusalem, since Jeroboam and his sons turned them away from serving as priests of our Father. Ndị Livayị hapụchara ebe ịta nri anụ ụlọ ha na ihe niile ha nwere bịa biri na Juda na Jerusalem, nʼihi na Jeroboam na ụmụ ya ndị ikom jụrụ ha dịka ndị nchụaja Onyenwe anyị.
15 He appointed his own priests for the high places, for the goat idols, and for the calf idols he had made. Ọ họpụtara ndị nchụaja nke aka ya, maka ebe niile dị elu, nakwa ife arụsị ewu na nwa ehi ndị ahụ ọ kpụrụ.
16 From every tribe of Israel, those who set their heart on seeking our Father, the God of Israel, followed the Levites to Jerusalem to sacrifice to our Father, the God of their ancestors. Ndị si nʼebo niile nke Izrel, ndị kpebiri nʼobi ha ịchọ Onyenwe anyị, Chineke Izrel sooro ndị Livayị bịa Jerusalem ịchụ aja nye Onyenwe anyị Chineke nna nna ha.
17 They strengthened Judah's kingdom, supporting Rehoboam son of Solomon three years, for they walked in the way of David and Solomon three years. Ha mere ka alaeze Juda sie ike. Ha kwagidekwara Rehoboam nwa Solomọn afọ atọ, na-agbasokwa nʼụzọ niile nke Devid na Solomọn nʼoge a.
18 Rehoboam married Mahalath, the daughter of Jerimoth son of David and of Abihail the daughter of Eliab son of Jesse. Rehoboam, lụrụ Mahalat, bụ nwa nwanyị Jerimot nwa Devid, na Abihail, nwa nwanyị Eliab, nwa Jesi.
19 She bore him sons: Jeush, Shemariah, and Zaham. Ọ mụtaara ya ụmụ ndị ikom atọ ndị a: Jeush, na Shemaraya, na Zaham.
20 After her, he married Maacah the daughter of Absalom, who bore him Abijah, Attai, Ziza, and Shelomith. Emesịa, ọ lụkwara nwunye ọzọ aha ya bụ Maaka, nwa nwanyị Absalọm. Ụmụ ha mụtara bụ Abija, na Atai, na Ziza, na Shelomit.
21 Rehoboam loved Maacah daughter of Absalom more than his other wives and concubines, since he had eighteen wives, sixty concubines, twenty-eight sons, and sixty daughters. Rehoboam hụrụ Maaka nwa nwanyị Absalọm nʼanya karịa ndị nwunye ya na ndị iko ya nwanyị niile. O nwere ndị nwunye iri na asatọ, nweekwa iri ndị iko nwanyị isii. Ọ mụtara iri ndị ikom abụọ na asatọ, na iri ụmụ nwanyị isii.
22 Rehoboam made Abijah, son of Maacah, chief leader among his brothers, intending to make him king. Rehoboam mere Abija nwa Maaka onyeisi nʼetiti ụmụ eze niile nʼihi na ọ chọrọ ime ya eze.
23 He acted wisely, spreading some of his sons through every district of Judah and Benjamin, to each fortified city, giving them abundant provisions and seeking many wives for them. O ji ezi uche zipụchaa ụmụ ya ndị ikom gaa nʼala ndị Juda na Benjamin, nakwa nʼobodo ndị ahụ e wusiri ike. O nyere ha ihe e ji elekọta ndụ nʼebe ọ bara ụba ma lụọkwara ha ọtụtụ ndị inyom.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]