Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

2 Chronicles 10 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Rehoboam went to Shechem, for all Israel had come to Shechem to make him king. Rehoboam gara Shekem nʼihi na Izrel niile zukọrọ ebe ahụ ime ya eze.
2 When Jeroboam son of Nebat heard of it—he was in Egypt, having fled from King Solomon—Jeroboam returned from Egypt. Mgbe Jeroboam nwa Nebat nụrụ nke a (ọ nọ nʼIjipt ebe ọ gbagara ọsọ ndụ site nʼaka eze Solomọn) o sitere Ijipt lọta.
3 So they sent for him, and Jeroboam and all Israel came and said to Rehoboam, Ya mere, ha ziri ozi kpọọ Jeroboam, ya na ndị Izrel niile jekwuru Rehoboam sị ya:
4 "Your father made our yoke heavy. Now lighten your father's hard service and the heavy yoke he put on us, and we will serve you." “Nna gị boro anyị ibu arọ, ma ugbu a mee ka ibu arọ na ịyagba arọ a nke o bokwasịrị anyị dị mfe, anyị ga-ejere gị ozi.”
5 He said to them, "Come back to me in three days." So the people went away. Rehoboam zara ha sị, “Bịaghachikwutenụ m mgbe ụbọchị atọ gasịrị.” Nʼihi ya ndị ahụ lara.
6 Then King Rehoboam consulted the elders who had served his father Solomon during his lifetime: "How do you advise me to answer these people?" Mgbe ahụ, eze Rehoboam gara ịnata ndụmọdụ nʼaka ndị okenye, bụ ndị jeere nna ya Solomọn ozi nʼoge ọ dị ndụ ya, sị ha, “Olee ndụmọdụ unu ga-enye m maka mụ inye ndị a ọsịsa?”
7 They replied, "If you are good to these people, please them, and speak kindly, they will always be your servants." Ha zara ya, “Ọ bụrụ na ị ga-emere ha ihe ọma, mee ihe ga-atọ ha ụtọ, nyekwa ha ọsịsa dị mma, ha ga-anọgide bụrụ ndị ohu gị mgbe niile.”
8 But he rejected the elders' advice and consulted the young men who grew up with him and served him. Ma ọ nabataghị ndụmọdụ ndị okenye nyere ya, ọ gakwuru ụmụ okorobịa ndị ya na ha tokọrọ, bụkwa ndị na-ejere ya ozi, ka ha nye ya ndụmọdụ.
9 He asked them, "What do you advise? How should we answer these people asking me to lighten the yoke my father put on us?" Rehoboam jụrụ ha sị, “Gịnị bụ ndụmọdụ unu? Gịnị bụ ọsịsa anyị ga-enye ndị a na-asị, ‘Mee ka ibu arọ nna gị bokwasịrị anyị dị mfe’? ”
10 The young men who grew up with him replied, "Tell the people who told you, 'Your father made our yoke heavy; lighten it for us'—tell them: 'My little finger is thicker than my father's waist.' Ụmụ okorobịa ahụ, bụ ndị ya na ha tokọrọ, zaghachiri sị, “Gwa ndị ahụ sịrị gị, ‘Nna gị bokwasịrị anyị ibu arọ, ma mee ka ibu anyị dị mfe,’ ị ga-agwa ha, sị, ‘Mkpịsịaka nta dị nʼaka m gbara okpotokpo karịa ukwu nna m.
11 My father put a heavy yoke on you; I'll add to it. My father disciplined you with whips; I will discipline you with scorpions.'" Nna m boro unu ibu arọ; aga m atụkwasị ihe nʼibu ahụ mee ka ọ dị arọ karịa. Nna m ji apịpịa dọọ unu aka na ntị, maọbụ akpị ka m ga-eji mekpaa unu ahụ.’ ”
12 So Jeroboam and all the people came to Rehoboam on the third day, as the king had said, "Come back to me on the third day." Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, Jeroboam na ndị Izrel niile bịaghachiri ịnụrụ ọsịsa Rehoboam, dịka eze kwuru, sị, “Laghachitenụ nʼụbọchị nke atọ.”
13 The king answered them harshly. King Rehoboam rejected the advice of the elders, Eze sara ha okwu nʼolu dị ike. Ọ jụrụ ndụmọdụ ndị okenye
14 and spoke to them as the young men advised: "My father made your yoke heavy; I will make it heavier. My father disciplined you with whips; I will discipline you with scorpions." ma gbasoro ndụmọdụ nke ụmụ okorobịa nyere, ọ sịrị, “Nna m mere ka ibu unu dị arọ, aga m eme ka ibu unu dị arọ karịa. Nna m ji apịpịa dọọ unu aka na ntị, aga m eji akpị mekpaa unu ahụ.”
15 So the king did not listen to the people, for this turn came from our Father, to fulfill the word our Father spoke through Ahijah the Shilonite to Jeroboam son of Nebat. Ya mere, eze aṅaghị ndị ahụ ntị, nʼihi mgbanwe nke ọnọdụ niile a sitere nʼebe Chineke nọ, ka e mezuo okwu ahụ Onyenwe anyị gwara Jeroboam nwa Nebat site nʼọnụ Ahija onye Shilo.
16 When all Israel saw the king would not listen to them, the people answered him: "What share do we have in David? No inheritance in Jesse's son! To your tents, Israel! Look to your own house, David!" So all Israel went home to their tents. Mgbe Izrel niile hụrụ na eze jụrụ ige ha ntị, ha zaghachiri ya sị, “Olee oke anyị nwere nʼime Devid? Olee ihe nketa anyị nwere nʼime nwa Jesi? Ndị Izrel, laanụ nʼụlọ ikwu unu! Gị Devid lekọtakwa ụlọ nke gị.” Nke a mere, ka ndị Izrel niile laa nʼụlọ ha.
17 But Rehoboam still reigned over the Israelites who lived in the cities of Judah. Ma banyere ndị Izrel bi nʼobodo niile nke Juda, Rehoboam gara nʼihu bụrụ eze ha.
18 Then King Rehoboam sent Hadoram, in charge of the forced labor, but the Israelites stoned him to death. King Rehoboam himself jumped into his chariot and fled to Jerusalem. Eze Rehoboam zipụrụ Adoniram onyeisi na-elekọta ndị ọrụ mmanye ma ndị Izrel ji nkume tugbuo ya. Ma eze Rehoboam jisiri ike gbaba nʼime ụgbọ agha ya, gbalaga laa Jerusalem.
19 So Israel has been in rebellion against the house of David to this day. Ya mere, Izrel nọ na nnupu isi megide ụlọ Devid ruo taa.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]