Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

2 Chronicles 9 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Hearing Solomon's fame, the queen of Sheba came to Jerusalem to test him with hard questions—a huge retinue, camels bearing spices, much gold, precious stones. Reaching Solomon, she told him all on her mind. Mgbe eze nwanyị Sheba nụrụ akụkọ Solomọn, ọ bịara Jerusalem ka o were ọtụtụ ajụjụ siri ike nwalee ya. O du ọtụtụ ndị ozi bara ụba bịa, tinyere ọtụtụ ịnyịnya kamel ndị bu ụda dị iche iche, ọtụtụ ọlaedo na ọtụtụ nkume dị oke ọnụahịa dị iche iche. Ọ bịakwutere Solomọn, ya na ya kparịtara ụka banyere ihe niile nke dị ya nʼobi.
2 Solomon answered all her questions; nothing was too hard for him to explain to her. Solomọn zara ya ajụjụ ya niile. Ọ dịkwaghị ihe siiri ya ike ịkọwara ya.
3 When the queen of Sheba had seen the wisdom of Solomon, and the palace he had built, Mgbe eze nwanyị Sheba hụrụ amamihe Solomọn, ma hụkwa ụlọeze o wuru,
4 the food on his table, his officials seated, his servants attending, their clothing, his cupbearers and theirs, and the burnt offerings at the house of our Father—it took her breath away. na ihe oriri a na-adọkwasị nʼelu tebul ya, usoro ọnọdụ nke ndịisi ọchịchị ya, na ndị guzo na-ejere ya ozi nʼuwe ha yi, ndị na-ebu iko ihe ọṅụṅụ nʼuwe ha, na aja nsure ọkụ niile ọ na-achụ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. Ọ dịkwaghị ihe ọzọ ọ maara ọ ga-eme, maọbụ kwuo.
5 She told the king, "The report I heard in my own land about your words and your wisdom was true. Ọ sịrị eze, “Akụkọ niile m nọ nʼala nụ banyere ihe niile ị rụpụtara na amamihe gị bụ eziokwu.
6 I didn't believe the reports until I came and saw for myself. Not half the greatness of your wisdom was told me; you surpass the report I heard. Ma ekwenyeghị m ihe ha kwuru tutu ruo mgbe m bịara jiri anya m abụọ hụ ha. Nʼezie, ihe m nụrụ erughị ọkara nke ịdị ukwuu amamihe gị. Ị tụkwasịla ihe nʼakụkọ m nụrụ.
7 How happy your people! How happy these servants who stand before you always, hearing your wisdom! Lee, ụdị ọṅụ ndị gị na-enwe. Lee, ụdị ọṅụ nke ndị ozi na-enwe, bụ ndị na-eguzo nʼihu gị mgbe niile na-anụ okwu amamihe gị.
8 Blessed be the LORD your God, who delighted in you and set you on his throne as king for the LORD your God! Because your God loved Israel, establishing them forever, he made you king to do justice and righteousness." Ngọzị dịrị Onyenwe anyị Chineke gị, onye nwere mmasị nʼebe ị nọ. O debere gị nʼocheeze ya dịka eze ịchị nʼaha Onyenwe anyị bụ Chineke gị. Nʼihi ịhụnanya nke Chineke gị nwere nʼebe Izrel nọ, na mmasị ya ime ka ha guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi. O meela gị eze ha, ka ị debe ikpe ziri ezi na ezi omume.”
9 She gave the king about 9,000 pounds of gold, great quantities of spices, and precious stones. No spice ever matched what the queen of Sheba gave King Solomon. Emesịa, O nyere Solomọn onyinye ọlaedo ịdị arọ ya dị puku kilogram anọ, nyekwa ya ụda dị iche iche, na nkume oke ọnụahịa dị iche iche. Enwebeghị ụdị ụda dịka ndị ahụ eze nwanyị Sheba nyere eze Solomọn.
10 Huram's and Solomon's servants, who brought gold from Ophir, also brought sandalwood and precious stones. Ndị ohu Hiram na ndị ohu Solomọn bubatara ọlaedo site nʼỌfịa. Ha butekwara osisi algụm, na nkume dị oke ọnụahịa dị iche iche.
11 From the sandalwood the king made steps for our Father's house and his palace, and lyres and harps for the singers—none like them ever seen in Judah. Eze ji osisi algụm ndị ahụ mee nkwasa nrigo nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, na nke ụlọeze. O jikwa ya meere ndị na-abụ abụ ụbọ akwara na une. O nwebeghị oge ọzọ e nwere ụdị ngwa egwu e ji osisi ọma dị otu a kwaa nʼala Juda niile.
12 King Solomon gave the queen of Sheba all she desired, whatever she asked, more than she had brought him. Then she returned to her own land with her servants. Eze Solomọn nyekwara eze nwanyị Sheba ihe niile ọ chọrọ na ihe niile bụ nke ọ rịọrọ. O nyere ya karịa ihe niile o wetaara ya. Emesịa, ọ hapụrụ laghachi nʼala nke aka ya, ya na ndị na-ejere ya ozi.
13 The weight of gold that came to Solomon in a single year was about twenty-five tons, Ọtụtụ ịdị arọ nke ọlaedo Solomọn na-enweta kwa afọ bụ puku kilogram iri abụọ na atọ,
14 besides what traders and merchants brought; all the kings of Arabia and governors of the land brought gold and silver to Solomon. na-agụnyeghị uru nke na-esi nʼaka ndị na-atụ mgbereahịa na ndị na-azụ ahịa. Ọzọkwa, ndị eze niile nke dị Arebịa na ndịisi na-achị obodo niile nke ala ahụ, na-enwetara Solomọn ọlaọcha na ọlaedo.
15 King Solomon made 200 large shields of hammered gold, each with about fifteen pounds of gold. Eze Solomọn kpụrụ narị ọta ọlaedo ukwu abụọ site nʼọlaedo etipịara etipịa. Ọ bụ ọlaedo ịdị arọ ya ruru kilogram isii ka e ji kpụọ ọta ọbụla.
16 He made 300 smaller shields of hammered gold, about seven and a half pounds each. The king put them in the House of the Forest of Lebanon. Ọ kpụkwara narị ọta nta atọ, nke sitere na ọlaedo etipịara etipịa. Ọ bụ ọlaedo ịdị arọ ya ruru kilogram atọ na ọkara ka eji kpụọ ọta ọbụla. Eze debere ha nʼụlọeze nʼOke Ọhịa Lebanọn.
17 The king made a large ivory throne and covered it with pure gold. Eze mekwara ocheeze dị ukwu nke e ji ọdụ enyi na ọlaedo a nụchara anụcha machie
18 The throne had six steps with a gold footstool attached to it; armrests flanked the seat, with two lions standing beside them, Ocheeze ahụ nwere ihe nrigo isii na ihe ịtụkwasị ụkwụ eji ọlaọcha rụọ nke ejikọtara nʼahụ ya. E nwere ebe ntụkwasị aka nʼakụkụ abụọ ya, nke nwere oyiyi ọdụm abụọ guzo nʼakụkụ nke ọbụla nʼime ha.
19 and twelve lions stood there, one at either end of each of the six steps. Nothing like it was ever made for any kingdom. Ọdụm iri na abụọ na-eguzo nʼelu ihe nrigo isii ahụ, otu nʼakụkụ isi abụọ nke ihe nrigo ọbụla. Ọ dịkwaghị alaeze ọzọ dị nke e mere ihe dị otu a nye.
20 All King Solomon's cups were gold, and every vessel of the House of the Forest of Lebanon was pure gold. Silver counted as nothing in Solomon's days, Ihe niile Solomọn nwere nke e ji aṅụ ihe bụ ọlaedo ka e ji mee ha. Ngwongwo niile nke dị nʼime ụlọeze nʼOke Ọhịa Lebanọn bụkwa ọlaedo a nụchara anụcha ka e ji kpụọ ha. Ọ dịghị ihe e ji ọlaọcha kpụọ, nʼihi na-agụnyeghị ọlaọcha dịka ihe ọbụla nʼoge Solomọn.
21 for the king's ships sailed to Tarshish with Huram's servants; every three years the Tarshish ships returned with gold, silver, ivory, apes, and peacocks. Eze nwere ọtụtụ ụgbọ mmiri e ji azụ ahịa nke ndị ohu Hiram na-elekọta. Otu ugbo nʼafọ atọ, ka ụgbọ ndị a na-alọta buru ọlaedo, ọlaọcha na ọdụ enyi, enwe na adaka dị iche iche bata.
22 So King Solomon surpassed all the kings of the earth in riches and wisdom. Eze Solomọn bara ụba nʼakụ, nweekwa amamihe karịa ndị eze niile dị nʼụwa.
23 All the kings of the earth sought Solomon's presence to hear the wisdom our Father put in his heart. Ndị eze niile nke ụwa na-achọ ihu Solomọn, ka ha nụta okwu amamihe nke Chineke tinyere nʼobi ya.
24 Each brought his gift—silver and gold articles, garments, weapons, spices, horses, and mules—year after year. Onye ọbụla bịakwutere ya na-ebutere ya onyinye ịnata ihuọma, ya bụ ngwa ọlaọcha na ọlaedo, na uwe dị iche iche, ngwa agha, ụda dị iche iche, ịnyịnya na ịnyịnya muul, nke a bụ kwa afọ, kwa afọ.
25 Solomon had 4,000 horse-and-chariot stalls and 12,000 horsemen, kept in the chariot cities and with the king in Jerusalem. Solomọn nwere ụlọ anụmanụ dị puku anọ maka ịnyịnya na ụgbọ agha, nwekwa puku ịnyịnya iri na abụọ ndị o dobere nʼobodo ụgbọ agha dị iche iche, na nʼebe eze nọ na Jerusalem.
26 He ruled all the kings from the Euphrates to the land of the Philistines, to Egypt's border. Ọ chịrị ndị eze niile site nʼosimiri Yufretis ruo nʼala ndị Filistia, rukwaa oke ala ndị Ijipt.
27 The king made silver in Jerusalem like stones, and cedar as plentiful as foothill sycamore-figs. Eze mere ka ọlaọcha baa ụba na Jerusalem, dịka nkume efu. O mekwara ka osisi sida dịka osisi sikamọ nke dị nʼala ala ugwu dị iche iche.
28 Horses were imported for Solomon from Egypt and from all the lands. A na-esite nʼIjipt na nʼala ndị ọzọ dị iche iche atụbatara Solomọn ịnyịnya.
29 Solomon's other deeds, first to last—aren't they recorded in the words of Nathan the prophet, Ahijah of Shiloh's prophecy, and the visions of Iddo the seer about Jeroboam son of Nebat? Ma banyere Ihe ndị ọzọ mere nʼoge ọchịchị Solomọn, site na mmalite ruo nʼọgwụgwụ, ọ bụ na-edeghị ha nʼakwụkwọ Netan onye amụma, nʼime akwụkwọ amụma Ahija, onye Shilo, nakwa nʼọhụ Ido onye ọhụ ụzọ, banyere Jeroboam nwa Nebat?
30 Solomon reigned in Jerusalem over all Israel forty years. Solomọn chịrị Izrel niile iri afọ anọ na Jerusalem.
31 Solomon rested with his ancestors, buried in the city of David his father. His son Rehoboam reigned in his place. O sooro nna nna ya ha dina nʼọnwụ. E lie ya nʼobodo Devid bụ nna ya. Rehoboam nwa ya ghọkwara eze nʼọnọdụ ya.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]