Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

2 Chronicles 8 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 After twenty years, in which Solomon built the house of our Father and his own palace, Nʼọgwụgwụ iri afọ abụọ, mgbe Solomọn ji wuo ụlọnsọ Onyenwe anyị na ụlọeze nke ya onwe ya,
2 Solomon rebuilt the cities that Huram had given him, and settled the people of Israel in them. Solomọn wugharịrị obodo ndị ahụ Hiram nyere ya, mee ka ndị Izrel biri nʼime ha.
3 Then Solomon marched against Hamath-zobah and overpowered it. Solomọn gara Hamat-Zoba, merie ha.
4 He built Tadmor in the wilderness, along with all the storage cities he built in Hamath. O wuru obodo Tadmọ nke dị nʼọzara na ọtụtụ obodo nchịkọba ihe na Hamat.
5 He also rebuilt Upper Beth-horon and Lower Beth-horon as fortified cities, with walls, gates, and bars, O wugharịkwara obodo Bet-Horon nke dị nʼelu elu, wuokwa Ndịda Bet-Horon ka ọ ghọọ obodo e wusiri ike nke nwere mgbidi, ibo ọnụ ụzọ ama na mkpọrọ e ji kpọchie ha.
6 Baalath, all Solomon's supply cities, his chariot and horsemen cities, and all he desired to build in Jerusalem, Lebanon, and his whole realm. O wukwara obodo Baalat na obodo niile nke ebe ịchịkọba ihe, na obodo niile ebe idebe ụgbọ agha na ịnyịnya ya niile. O wuru ihe ọbụla gụrụ obi ya agụụ iwu na Jerusalem, Lebanọn na nʼoke ala ahụ niile ọ na-achị.
7 There were still people left from the Hittites, Amorites, Perizzites, Hivites, and Jebusites, who were not Israelites. Ndị niile fọdụrụ ndụ nʼetiti ndị Het, ndị Amọrait, ndị Periz, ndị Hiv na Jebus (ndị a abụghị ndị Izrel),
8 Their descendants still living in the land, whom Israel had not destroyed, Solomon conscripted for forced labor, as they still are today. ndị ụmụ ụmụ ha fọdụrụ nʼala ahụ, ndị ahụ ndị Izrel na-ebibighị, ndị a ka Solomọn mere ndị ọrụ mmanye na ndị ohu, nke a bụkwa ọnọdụ ha ruo taa.
9 Solomon enslaved no Israelites for his work; they were soldiers, commanders of his officers, and commanders of his chariots and horsemen. Ma Solomọn emeghị ka onye Izrel ọbụla bụrụ ohu, maka ọrụ ya, kama ha bụ ndị ikom agha, ndịisi ndị ọchịagha ya, ndịisi ụgbọ agha na ndị na-agba ịnyịnya agha ya.
10 These were King Solomon's chief officers: 250 who supervised the people. Ha bụkwa ndịisi ozi nke eze Solomọn, narị ndị ikom abụọ na iri ise bụ ndịisi na-elekọta ndị mmadụ.
11 Solomon brought Pharaoh's daughter from the City of David to the house he built her, saying, "No wife of mine will live in David king of Israel's house, for holy is wherever our Father's ark has entered." Solomọn kpọpụtara ada Fero site nʼobodo Devid, gaa nʼụlọeze nke o wuuru ya, nʼihi na ọ sịrị, “Nwunye m agaghị ebi nʼụlọeze Devid, bụ eze Izrel, nʼihi na ebe ọbụla igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị banyere abụrụla ebe dị nsọ.”
12 Then Solomon offered burnt offerings to our Father on the altar he built before the portico, Emesịa, Solomọn chụrụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, nʼelu ebe ịchụ aja Onyenwe anyị, nke o wuru nʼihu mpụta ọnụ ụlọ ụlọnsọ ukwu ahụ,
13 daily as required, by Moses' command: Sabbaths, New Moons, and three yearly festivals—the Feast of Unleavened Bread, the Feast of Weeks, and the Feast of Tabernacles. ọbụladị dịka iwu metụtara aja e kwesiri ịchụ kwa ụbọchị si dị, bụ nke Mosis nyere nʼiwu. Aja ndị a bụ maka Ụbọchị Izuike, Ọnwa Ọhụrụ na ụdị mmemme atọ a na-eme nʼafọ, ndị bụ mmemme achịcha ekoghị eko, mmemme izu ụka asaa na mmemme ụlọ Ikwu.
14 Following his father David's rules, he set priestly divisions for service, Levite divisions to praise and serve before the priests as each day required, and gatekeeper divisions at each gate, for David the man of our Father had commanded it. O sitere nʼusoro ije ozi nke Devid, họpụtara otu ndị nchụaja ọrụ dị iche iche ha na-arụ ụbọchị niile. O nyekwara ndị Livayị ọrụ idu nʼotuto a na-enye Chineke na inyere ndị nchụaja aka ime ihe ụbọchị ọbụla nʼụbọchị ya. Kenyekwa ndị na-eche ọnụ ụzọ ụlọnsọ ahụ niile nche oke ọrụ ha nʼotu nʼotu, nʼihi na nke a bụ ihe Devid, onye nke Chineke nyere nʼiwu.
15 They followed the king's orders to the priests and Levites exactly, down to the storerooms. Ha ewezugaghị onwe ha nʼiso iwu niile eze nyere ndị nchụaja maọbụ ndị Livayị banyere ihe ọbụla na ihe gbasakwara ụlọakụ niile.
16 All Solomon's work was finished, from the day our Father's house was founded until its completion; our Father's house was complete. A rụzuru ọrụ niile Solomọn zubere ịrụ, site nʼụbọchị a tọrọ ntọala ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị tutu ruo mgbe ewuchara ya. Ya mere, e wuchara ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
17 Then Solomon went to Ezion-geber and Eloth on the seacoast in the land of Edom. Mgbe ahụ, Solomọn gara Eziọn Geba na Elat nke dị nʼọnụ osimiri, nʼala Edọm.
18 Huram sent him ships by his servants, with sailors who knew the sea; they sailed with Solomon's servants to Ophir, took about seventeen tons of gold, and brought it to King Solomon. Hiram zigaara ya ọtụtụ ụgbọ mmiri nke ndị ikom ya na-anya ụgbọ mmiri na-edu, bụ ndị maara ihe banyere ime njem nʼosimiri nke ọma. Ndị a, ha na ndị ikom Solomọn nyaara ụgbọ gaa Ọfịa site nʼebe ahụ bulatara eze Solomọn, ọlaedo ịdị arọ ya ruru puku kilogram iri na ise na narị atọ.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]