Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

2 Chronicles 7 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 When Solomon finished praying, fire fell from heaven and consumed the burnt offering and sacrifices, and our Father's glory filled the house. Ngwangwa, mgbe Solomọn kpesịrị ekpere a, ọkụ sitere nʼeluigwe daa repịa aja nsure ọkụ ahụ na aja ahụ niile. Ebube Onyenwe anyị jupụtakwara nʼụlọnsọ ukwu ahụ,
2 The priests couldn't enter our Father's house, because our Father's glory filled it. Ndị nchụaja enweghị ike ịbanye nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị nʼihi ebube Onyenwe anyị nke jupụtara ụlọnsọ ahụ.
3 When all the Israelites saw the fire fall and our Father's glory on the house, they knelt, faces to the ground on the pavement, worshiping and thanking our Father: "He is good; his faithful love endures forever." Mgbe ọha ndị Izrel niile hụrụ ọkụ ahụ si nʼelu daa, hụkwa ebube Onyenwe anyị ka o guzo nʼelu ụlọnsọ ukwu ahụ, ha dara nʼala kpọọ isiala nye Onyenwe anyị, kelee ya ekele sị: “Nʼihi na Ọ dị mma ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.”
4 Then the king and all the people offered sacrifices before our Father. Mgbe ahụ, eze na ndị a niile chụrụ aja dị iche iche nʼihu Onyenwe anyị.
5 King Solomon sacrificed 22,000 oxen and 120,000 sheep; the king and all the people dedicated the house of our Father. Eze Solomọn chụrụ aja ehi nke dị puku iri abụọ na abụọ, na ewu na atụrụ dị narị puku na iri abụọ. Ya mere, Eze na ndị ahụ niile si otu a doo ụlọnsọ Chineke nsọ.
6 The priests stood at their posts; the Levites stood with the musical instruments for our Father that King David made for giving thanks to our Father—"for his faithful love endures forever"—whenever David praised through the instruments. Opposite them the priests blew the trumpets, and all Israel stood. Ndị nchụaja guzo nʼihu ọrụ ha, ha na ndị Livayị. Ha jiri ngwa egwu Onyenwe anyị nke eze Devid mere maka ị na-eto Onyenwe anyị, bụkwa nke o ji mgbe o nyere ekele, na-asị, “Ịhụnanya ya na-adị ruo ebighị ebi.” Na ncherita ihu ndị Livayị, ndị nchụaja fụrụ opi ike ha mgbe ndị Izrel guzooro ọtọ.
7 Solomon dedicated the courtyard's middle, in front of our Father's house, for there he offered the burnt offerings and fat of the peace offerings, since the bronze altar he had made could not hold the burnt offering, grain offering, and fat. Mgbe ahụ, Solomọn doro etiti ogige dị nʼihu ụlọnsọ Onyenwe anyị ahụ nsọ. Nʼebe ahụ ka ọ nọ chụọ aja nsure ọkụ, aja onyinye mkpụrụ ọka na aja abụba udo. O mere nke a nʼihi na ebe ịchụ aja bronz nke ọ rụrụ enweghị ike ịbata aja nsure ọkụ niile, aja mkpụrụ ọka niile nakwa aja abụba ndị ahụ.
8 At that time Solomon kept the feast seven days, and all Israel with him—a vast assembly—from Lebo-hamath to the Brook of Egypt. Ya mere, Solomọn mere mmemme a nʼoge ahụ, ụbọchị asaa, ya na ndị Izrel niile. Ọ bụ nzukọ dị ukwuu. Ndị mmadụ bịara sitere na Lebo Hamat ruo na mmiri iyi Ijipt.
9 On the eighth day they held a closing assembly, having kept the altar's dedication seven days and the feast seven days. Nʼụbọchị nke asatọ, ha nwere ọgbakọ, nʼihi na ha mere mmemme nke ido ebe ịchụ aja nsọ nʼime ụbọchị asaa, meekwa mmemme ahụ abalị asaa ọzọ.
10 On the twenty-third day of the seventh month, he sent the people home, joyful and glad at heart for the goodness our Father showed to David, to Solomon, and to Israel his people. Ya mere, nʼụbọchị nke iri abụọ na atọ nʼọnwa nke asaa, o zilagara ndị ahụ niile nʼụlọ ha, nʼịṅụrị ọṅụ na obi ụtọ nʼihi ihe ọma niile nke Onyenwe anyị Devid na Solomọn na ndị ya Izrel.
11 Solomon finished the house of our Father and the royal palace. Everything Solomon set his heart to do in the house of our Father and his own house, he did successfully. Mgbe Solomọn rụchara ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na ụlọeze, mezukwaa ihe niile bụ nke o bu nʼobi ime nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nakwa nʼụlọeze nke ya onwe ya.
12 Then our Father appeared to Solomon at night and said to him: "I have heard your prayer and chosen this place for myself as a house of sacrifice. Onyenwe anyị mere ka ọ hụ ya nʼọhụ abalị sị ya, “Anụla m ekpere gị, ahọrọkwala m ebe a nye onwe m, ka ọ bụrụ ebe ịchụ aja.
13 "If I shut the skies so no rain falls, or command locusts to devour the land, or send a plague among my children, “Mgbe ọbụla m mere ka mmiri ghara izo, maọbụ zidata igurube ka ha bịa bibie ihe ubi unu, maọbụ zidata ọrịa nʼetiti unu,
14 if my children—who bear my name—humble themselves, pray, seek my face, and turn from their evil ways, I will hear from heaven, forgive their sin, and heal their land. ọ bụrụ na ndị m ndị a kpọkwasịrị aha m, ewedata onwe ha nʼala, kpee ekpere, chọsie ihu m ike, sitekwa na mmehie ha chigharịa, aga m esite nʼeluigwe za ekpere ha, gbaghara ha mmehie ha, mee ka ala ha dịrị ndu.
15 Now my eyes will be open and my ears attentive to the prayer offered in this place. Anya m ga-eghere oghe mgbe niile; otu a kwa, ntị m ga-egherekwa oghe ịhụ na ịnụ ekpere niile a na-ekpe nʼụlọnsọ a.
16 Now I have chosen and dedicated this house, so my name remains there forever; my eyes and heart will be there always. Edoola m ụlọnsọ a nsọ nye onwe m, ka Aha m dị nʼebe ahụ ruo ebighị ebi; anya m abụọ na obi m ga-adịkwa nʼebe ahụ ụbọchị niile.
17 As for you—if you walk before me as David your father walked, doing all I commanded you and keeping my statutes and judgments, “Ma gị onwe gị, bie ndụ nʼikwesị ntụkwasị obi nʼihu m dịka Devid nna gị mere, na-eme ihe niile m nyere nʼiwu, debe ụkpụrụ m na iwu m niile.
18 then I will confirm your kingdom's throne, as I covenanted with David your father: "A man of yours will always rule over Israel." Aga m eme ka ocheeze ọchịchị gị guzosie ike, dịka mụ na nna gị Devid gbara na ndụ, mgbe m sịrị, ‘Ị ghaghị inwe onye nnọchite anya nʼocheeze nke ga-achị Izrel.’
19 But if you turn away, abandon my statutes and commands I set before you, and go serve other gods and worship them, “Ma ọ bụrụ unu alaghachi azụ, gbakụta ụkpụrụ na iwu niile, bụ nke m nyere unu azụ, pụọ gbasoro chi ndị ọzọ ife ha ofufe, na ịkpọ isiala nye ha,
20 then I will uproot Israel from my land I gave them, cast from my sight this temple I set apart for my name, and make it an example and taunt among all peoples. mgbe ahụ, aga m esite nʼala m, bụ nke m nyere ha, hopu Izrel. Aga m ajụkwa ụlọnsọ a m doro nsọ nye Aha m, meekwa ka ọ ghọọ ihe e ji atụ ilu na ihe ịkpa ọchị nʼetiti ndị niile.
21 This house, once so exalted, will leave everyone who passes by appalled, saying, "Why did the LORD do this to this land and this house? Ọ bụ ezie na ụlọnsọ ukwu a kachasị elu ugbu a, ma ọnọdụ ya ga-eju ndị niile ga-esi nʼakụkụ ya gafee anya, ha ga-asị, ‘Gịnị mere Onyenwe anyị ji mee ala a na ụlọnsọ a, ihe dị otu a?’
22 They will answer, "Because they abandoned the LORD, God of their ancestors, who brought them out of the land of Egypt, and clung to other gods, bowing and serving them—that's why he brought all this disaster on them." Ndị mmadụ ga-aza, ‘Ọ bụ nʼihi na ha gbakụtara Onyenwe anyị, Chineke nna nna ha, onye kpọpụtara ha site nʼala Ijipt azụ, makụọ chi ndị ọzọ, na-akpọ isiala na-efekwa ha ofufe. Ọ bụ nʼihi nke a ka O ji mee ka ihe ọjọọ niile ndị a bịakwasị ha.’ ”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]