Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

2 Chronicles 6 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Then Solomon said, "Our Father has said that he would dwell in thick darkness. Mgbe ahụ, Solomọn sịrị, “Onyenwe anyị ekwuola na ọ ga-ebi nʼoke igwe ojii.
2 But I have built you an exalted house, a place for you to dwell in forever." Ma ewuola m ụlọnsọ pụrụ iche, maa mma nye gị, ebe ị ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi!”
3 Then the king turned and blessed the whole assembly of Israel as they all stood. Dịka ọgbakọ Izrel niile na-eguzo nʼebe ahụ, eze chigharịrị onwe ya chee ha ihu, gọzie ha.
4 He said, "Praise our Father, the God of Israel, whose hand has fulfilled what his mouth promised my father David, saying, Mgbe ahụ ọ sịrị, “Otuto dịrị Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel. Onye ji aka ya abụọ mezuo nkwa ahụ o ji ọnụ ya kwee nna m Devid. Nʼihi na o kwuru sị,
5 'Since the day I brought my people out of Egypt, I chose no city from all the tribes of Israel to build a house for my name to be there, nor any man to rule my people Israel. ‘Site nʼụbọchị ahụ m si nʼala Ijipt kpọpụta ndị m, ahọpụtaghị m obodo ọbụla nʼebo ọbụla nke Izrel, ka e wuru m ụlọnsọ ka Aha m dịrị nʼebe ahụ, maọbụ họpụta onye ọbụla ka ọ bụrụ onyendu ndị m Izrel.
6 But I chose Jerusalem for my name to be there, and I chose David to lead my people Israel.' Ma ugbu a, a họrọla m Jerusalem ka ọ bụrụ ebe Aha m ga-adị, ahọrọkwala m Devid ị bụ onye ga-achị ndị m Izrel.’
7 David my father had it in his heart to build a house for the name of our Father, the God of Israel. “Nna m, Devid bu nʼobi iwu ụlọnsọ ukwu nye Aha Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel.
8 But our Father told David my father, 'Because building a house for my name was in your heart, you did well to intend this. Ma Onyenwe anyị sịrị nna m, Devid, ‘I mere nke ọma ibu nʼobi, iwu ụlọnsọ ukwu nye Aha m.
9 But you will not build the house; your son, from your own body—he will build the house for my name.' Ma otu ọ dị, ọ bụghị gị ga-ewu ya, kama nwa gị nwoke nke si nʼahụ gị pụta ga-ewu ụlọnsọ ahụ nye Aha m.’
10 Now our Father has fulfilled the word he spoke: I have succeeded David my father and sit on Israel's throne, as he promised, and I have built the house for the name of our Father, the God of Israel. “Ugbu a, Onyenwe anyị emezuola nkwa ahụ o kwere. A nọchiela m nna Devid, ana m anọdụ nʼocheeze nke Izrel dịka Onyenwe anyị kwere na nkwa. Ewuokwala m ụlọnsọ ukwu nye Aha Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel.
11 There I placed the ark, holding the covenant our Father made with the people of Israel." Nʼebe ahụ ka m dọbara igbe ọgbụgba ndụ, nʼime ya ka ọgbụgba Onyenwe anyị dị, bụ nke ya na ụmụ Izrel gbara.”
12 Then Solomon stood before our Father's altar in the presence of the whole assembly of Israel and spread out his hands. Mgbe ahụ, Solomọn guzoro nʼihu ebe ịchụ aja Onyenwe anyị, na nʼihu ọgbakọ ụmụ Izrel niile, gbasapụ aka ya abụọ.
13 Solomon had made a bronze platform about seven and a half feet long, seven and a half feet wide, four and a half feet high, and set it in the middle of the court. He stood on it, knelt before the whole assembly of Israel, and spread his hands toward heaven. Solomọn ji bronz kpụọ ihe nrigoro ịnọ gwa ọha mmadụ okwu. Ogologo ihe nrigoro ahụ, obosara ya ruru mita abụọ na ọkara mita abụọ na ọkara. Ịdị elu ya ruru otu mita na ọkara. O debere ya nʼetiti ebe mpụta nke ogige ụlọnsọ ukwu ahụ. O guzoro nʼelu ihe nrigo ahụ, nʼihu ọgbakọ Izrel niile, gbuo ikpere nʼala, gbasaa aka ya abụọ chilie ha elu.
14 He said, O my Father, God of Israel, no Father is like you in heaven or on earth, keeping covenant and showing loyal love to your servants who walk before you wholeheartedly. Ọ sịrị, “Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel, ọ dịghị Chineke dịka gị nʼeluigwe maọbụ nʼụwa. Gị onye na-edebe ọgbụgba ndụ ịhụnanya gị na ndị ohu gị, bụ ndị ji obi ha niile na-eso ụzọ gị.
15 You kept your promise to your servant David my father; what you spoke with your mouth you fulfilled with your hand today. I mezuokwala nkwa niile i kwere nna m Devid, bụ ohu gị. I ji ọnụ gị kwee nkwa a, ma taa, i jirila aka gị mezuo ya.
16 So now, my Father, God of Israel, keep for your servant David my father what you promised: "You will never lack a man before me on Israel's throne, if only your sons watch their way to walk in my law, as you have walked before me." “Ugbu a, O! Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel, mezukwaa nkwa niile i kwere Devid nna m, mgbe ị sịrị, ‘Ọ bụrụ na ụmụ ụmụ gị elezie anya bie ndụ dịka iwu m si dị nʼihu m, nʼihe niile ha na-eme, dịka gị onwe gị mere, agaghị achọ onye ga-anọ nʼihu nʼocheeze Izrel nʼime ha.’
17 And now, my Father, God of Israel, let the word you spoke to your servant David be confirmed. Ma ugbu a, Onyenwe anyị bụ Chineke nke Izrel, ka okwu gị, bụ nkwa nke i kwere ohu gị Devid bịa na mmezu.
18 But will our Father really live with people on earth? The heavens and highest heavens can't hold you—how much less this house I built. “Ma ọ bụ ezie na Chineke ga-ebinyere ụmụ mmadụ nʼelu ụwa? Lee, eluigwe, ọbụladị ebe kachasị elu nke eluigwe ezughị ịba gị. Olee otu ụlọ a nke m wuru ga-esi bata gị!
19 Yet hear the prayer of your servant and his plea, O my Father, and hear the cry and prayer your servant prays before you. Ma Onyenwe anyị Chineke m, ṅaa ntị nʼekpere ohu gị, na arịrịọ ọ na-arịọ maka ebere. Nụrụ akwa na ekpere nke ohu gị na-ekpe nʼihu gị.
20 May your eyes be open toward this house day and night, toward the place where you said you'd put your name, to hear the prayer your servant prays toward this place. Biko, mee ka anya gị abụọ ghere oghe nʼebe ụlọnsọ ukwu a dị, ehihie na nʼabalị, bụ ebe a i kwuru sị, na i ga-akpọkwasị Aha gị nʼebe ahụ. Biko, ka ị nụrụ ekpere ohu gị ga-ekpe banyere ebe a.
21 Hear your servant's and your people Israel's pleas when they pray toward this place. Hear from heaven, your dwelling; and when you hear, forgive. Nụrụkwa arịrịọ niile nke ohu gị na nke ndị gị Izrel niile, mgbe ọbụla ha chere ihu ha nʼebe a nʼekpere. Biko, site nʼeluigwe bụ ebe obibi gị nụrụ, mgbe ị nụrụ biko, gbagharakwa.
22 If a man sins against his neighbor and must swear an oath, and he comes and swears his oath before your altar in this house, “Mgbe onye ọbụla mehiere mmadụ ibe ya, a kpọọ ya oku ka ọ bịa ṅụọ iyi, onye dị otu a bịa guzo nʼebe a, nʼihu ebe ịchụ aja gị a, ṅụọ iyi ahụ,
23 then hear from heaven and act. Judge your servants: pay back the guilty for their deeds, and clear the righteous, rewarding them by their righteousness. mgbe ahụ, nụrụ olu ya nʼeluigwe ma mee ihe ziri ezi, kpeekwa ikpe nʼetiti ndị ohu gị. Maa onye mejọrọ ikpe site nʼịtụkwasị nʼisi ha ihe o metara, meekwa ka onye aka ya dị ọcha nwere onwe ya, site nʼimeso ha dịka ezi omume ha si dị.
24 If your people Israel, defeated by enemies for sinning against you, turn back to praise your name, pray, and plead with you in this house, “Mgbe ndị iro meriri ndị gị Izrel, nʼihi na ha mehiere megide gị, ọ bụrụ na ha alọghachite, too aha gị, na-ekpe ekpere, na-arịọ arịrịọ nʼihu gị nʼụlọnsọ ukwu a,
25 then hear from heaven, forgive the sin of your people Israel, and bring them back to the land you gave to them and their ancestors. biko, site nʼeluigwe nụrụ ekpere ha, gbaghara mmehie ndị gị Izrel. Meekwa ka ha lọghachita nʼala ahụ nke i nyere ha na nna nna ha.
26 When the sky is shut with no rain because they sinned against you, if they pray toward this place, praise your name, and turn from their sin when you make them suffer, “Mgbe e gbochiri eluigwe, mee na mmiri adịghị ezokwa, nʼihi na ndị gị emehiela megide gị, ọ bụrụ na ha echee ihu nʼebe a kpee ekpere, too aha gị, si na mmehie ha chegharịa, nʼihi na ịtaala ha ahụhụ,
27 then hear from heaven, forgive your servants' sin, your people Israel, when you teach them the good path to walk, and send rain on your land, which you gave your people as their inheritance. biko, site nʼeluigwe nụrụ ma gbagharakwa mmehie ndị ohu gị, ndị gị Izrel. Kuziere ha ezi ụzọ ha ga-esi bie ndụ ma zidata mmiri ozuzo nʼala ahụ nke i nyere ndị gị ka ọ bụrụ ihe nketa ha.
28 If famine, plague, blight, mildew, locust, or caterpillar strikes the land; if enemies besiege them in their towns—whatever plague or sickness comes, “Mgbe ụnwụ, maọbụ ajọ ọrịa na-efe efe ga-adakwasị ala a, maọbụ ọrịa na-eripịa ihe ubi, maọbụ ọmụma ebu; maọbụ igurube, maọbụ ụkpana, maọbụ mgbe ndị iro ga-anọchibido ha nʼobodo ha niile, ihe mbibi niile maọbụ ọrịa ọbụla,
29 whatever prayer or plea anyone or all your people Israel makes, each knowing his own suffering and pain and spreading his hands toward this house, ekpere ọbụla maọbụ arịrịọ nke onye ọbụla nʼetiti ndị gị Izrel kpere ma rịọọ, nʼihi ịghọta ihe otiti na ihe mgbu niile, ha gbasapụ aka ha, ma chee ihu ha nʼebe ụlọnsọ ukwu dị;
30 then hear from heaven, your home, and forgive, and repay each according to all his ways, since you know his heart—for you alone know every human heart, mgbe ahụ, site nʼeluigwe bụ ebe obibi gị nụrụ arịrịọ ha. Gbaghara ma meekwa; mesoo onye ọbụla dịka ihe niile ha na-eme si dị, ebe ọ bụ na ị maara obi ha niile (nʼihi na naanị gị maara obi ụmụ mmadụ),
31 so they may fear you and walk in your ways as long as they live on the land you gave our ancestors. ka ha tụọ egwu gị, jeekwa ije nʼirubere gị isi nʼoge niile ha na-ebi nʼala ahụ nke i nyere nna nna anyị ha.
32 Also, when a foreigner not of your people Israel comes from a distant land for your great name, your mighty hand, and your outstretched arm—when they come and pray toward this house, “Ma banyere onye mba ọzọ, onye na-esonyeghị na ndị gị Izrel, kama o si nʼala ebe dị anya bịa nʼihi ukwu gị, nʼaka gị dị ike na ogwe aka gị e setipụrụ esetipụ. Mgbe ha bịara kpee ekpere nʼụlọnsọ a,
33 then hear from heaven where you live, and do all the foreigner asks, so all the earth's peoples may know your name and fear you, as your people Israel do, and know this house I built bears your name. mgbe ahụ, site nʼeluigwe ebe obibi gị nụrụ arịrịọ ha. Mekwaa ihe niile nke onye mba ọzọ ahụ na-arịọ nʼekpere, ka ndị niile nke ụwa mara aha gị, tụọkwa egwu gị, dịka ndị nke gị bụ Izrel na-eme. Ka ha matakwa na-akpọkwasịrị Aha gị nʼụlọ a nke m wuru.
34 If your people go to war against their enemies wherever you send them, and pray to you toward this city you have chosen and the house I built for your name, “Mgbe ndị gị ga-aga ibu agha megide ndị iro ha, nʼebe ọbụla ị na-eziga ha, mgbe ha chere ihu ha nʼụzọ obodo a nke ị họpụtara na nʼụlọnsọ ukwu a m wuru nye Aha gị, kpee ekpere,
35 then hear from heaven their prayer and their plea, and uphold their cause. mgbe ahụ, site nʼeluigwe nụrụ ekpere na arịrịọ amara ha, mezukwa ihe ha na-arịọ.
36 If they sin against you—for no one is without sin—and you are angry with them and hand them to an enemy who takes them captive to a land far or near, “Mgbe ha mehiere megide gị, nʼihi na ọ dịghị mmadụ ọbụla na-adịghị emehie, ị wee iwe megide ha, rara ha nyefee nʼaka ndị iro, ndị ga-adọkpụrụ ha nʼagha gaa nʼobodo ọzọ, maọbụ obodo dị anya maọbụ nke dị nso;
37 yet if in the land of their captivity they take it to heart, and turn back and plead with you there, saying, "We have sinned, we did wrong, we acted evilly," ọ bụrụ na ha anọrọ nʼala ahụ a dọkpụrụ ha gaa, chegharịa nʼobi ha, nọrọ nʼala ebe a dọtara ha nʼagha, rịọọ gị, sị, ‘Anyị emehiela, anyị emeela ihe nʼadịghị mma, meekwa ajọ omume.’
38 if they turn back to you with all their heart and soul in the land of their captivity where they were taken, and pray toward their land you gave their ancestors, the city you chose, and the house I built for your name, Ọ bụrụ na ha ejiri obi ha na mmụọ ha niile chegharịa, nʼala ebe ndọta nʼagha ha, bụ ebe a kpọrọ ha gaa, ma kpee ekpere nye gị chee ihu ha nʼụzọ ala a nke i nyere nna nna ha, nʼobodo a nke ị họpụtara, ya na nʼụlọnsọ ukwu a m wuru nye Aha gị
39 then hear from heaven, your dwelling place, their prayer and pleas, uphold their cause, and forgive your people who sinned against you. mgbe ahụ, site nʼeluigwe, ebe obibi gị, nụrụ ekpere ha na arịrịọ ha niile, nyekwara ha aka. Gbaghara ndị gị, bụ ndị mehiere megide gị.
40 Now, my Father, let your eyes be open and your ears attentive to the prayer of this place. “Ugbu a, Chineke m, biko ka anya gị na ntị gị ghere oghe nʼekpere niile a na-ekpe nʼebe a.
41 And now arise, my Father, and come to your resting place, you and the ark of your might. Let your priests, my Father, be clothed with salvation, and let your faithful ones rejoice in your goodness. “Ma ugbu a, bilie, O Onyenwe anyị Chineke, bata nʼebe izuike gị, gị na igbe ọgbụgba ndụ nke ike gị. Ka ndị nchụaja gị, O Onyenwe anyị Chineke, yiri nzọpụta dịka uwe. Ka ndị gị kwesiri ntụkwasị obi ṅụrịa ọṅụ nʼihi ịdị mma gị.
42 My Father, do not reject your anointed one. Remember your covenant love for David your servant. O Onyenwe anyị Chineke, agbakụtala onye gị e tere mmanụ azụ. Chetakwa oke ịhụnanya nke ị kwere Devid bụ ohu gị na nkwa.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]