Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

2 Chronicles 5 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Solomon completed all the work for the house of our Father. He then brought in his father David's dedicated things—silver, gold, all the vessels—and put them in the storerooms of the house of our Father. Mgbe a rụzuru ọrụ niile nke eze Solomọn nwere ịrụ maka ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ, o webatara ihe niile Devid bụ nna ya doro nsọ nʼime ya, ya bụ ọlaọcha, ọlaedo na ngwongwo ndị ọzọ niile. O tinyere ha nʼụlọakụ dị nʼụlọnsọ Chineke.
2 Solomon then gathered Israel's elders, all tribal heads, and leaders of Israel's ancestral families in Jerusalem, to bring up the ark of the covenant of our Father from the City of David, also called Zion. Mgbe ahụ, Solomọn kpọkọtara ndị okenye Izrel niile, na ndịisi ebo Izrel niile, na ndịisi ezinaụlọ Izrel niile na Jerusalem, maka ị site na Zayọn, bụ obodo Devid bugota igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị.
3 So all the men of Israel gathered before the king at the feast in the seventh month. Ndị Izrel niile gbakọtara bịakwute eze nʼoge a na-eme mmemme nʼọnwa Etanim, nke bụ ọnwa asaa nʼafọ.
4 When all the elders of Israel had come, the Levites took up the ark. Mgbe ndị okenye Izrel niile bịarutere, ndị Livayị buliri igbe ọgbụgba ndụ ahụ.
5 The priests and Levites brought up the ark, the tent of meeting, and all the holy vessels in it. Ha bugotara igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, ya na ụlọ nzute, na ngwongwo niile dị nsọ dị nʼime ya. Ndị nchụaja bụ ndị Livayị buliri ha elu.
6 King Solomon and all Israel's assembly who had gathered before him stood before the ark, sacrificing sheep and cattle too many to count or number. Eze Solomọn na ọgbakọ Izrel niile, bụ ndị zukọtara nʼebe ọ nọ, nọ nʼihu igbe ọgbụgba ndụ ahụ, na-achụ aja ọtụtụ atụrụ na ọtụtụ ehi nke a na-apụghị ịgụta ọnụ maọbụ gbakọta ọnụọgụgụ ha nʼihi ịba ụba.
7 The priests brought our Father's covenant ark to its place, the house's inner sanctuary, the Most Holy Place, beneath the cherubim's wings. Ndị nchụaja bubatara igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ nʼime ime ụlọnsọ ukwu ahụ, nʼime Ebe Kachasị Nsọ, dọba ya nʼokpuru nku cherubim ahụ.
8 For the cherubim spread their wings over the ark's place, covering it and its poles from above. Cherubim ndị ahụ gbasara nku ha nʼelu igbe ọgbụgba ndụ ahụ, kpuchie ya na okporo osisi ndị ahụ e ji ebu ya.
9 The poles were long enough that their ends showed from the ark before the inner sanctuary, but not outside; they remain there to this day. Okporo osisi ndị a dị oke ogologo, na isi ha sitere nʼigbe ọgbụgba ndụ ahụ na-apụta, na e nwere ike ị site nʼihu ime ime ebe nsọ ahụ hụ ha anya, ma onye na-anọghị nʼEbe Nsọ ahụ adịghị ahụ ha. Ha ka dịkwa nʼebe ahụ ruo taa
10 The ark held nothing but the two tablets Moses placed there at Horeb, where our Father made a covenant with the Israelites when they left Egypt. O nweghị ihe dị nʼime igbe ọgbụgba ndụ ahụ, karịakwa mbadamba nkume abụọ ahụ Mosis tinyere nʼime ya nʼugwu Horeb, nʼebe Onyenwe anyị na ụmụ Izrel gbara ndụ, mgbe ha si nʼala Ijipt pụta.
11 Then the priests left the holy place. (All priests present had made themselves holy, regardless of their divisions, Mgbe ndị nchụaja sitere nʼEbe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ pụta, nʼihi na ndị nchụaja ahụ niile doro onwe ha nsọ nʼagbanyeghị usuu nke onye ọbụla nʼime ha si pụta.
12 and all the Levite singers—Asaph, Heman, Jeduthun, their sons and relatives—stood east of the altar in fine linen, playing cymbals, harps, and lyres, with 120 priests blowing trumpets.). Ma ndị Livayị bụ ndị ọbụ abụ, ya bụ Asaf, Heman, Jedutun na ụmụ ha ndị ikom na ndị ikwu ha guzoro onwe ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ebe ịchụ aja. Ha yi uwe ezi akwa ọcha ma na-akpọ ụbọ akwara, na-akụkwa ogene ọla. Ndị nchụaja dị otu narị na iri abụọ (120) nʼọnụọgụgụ. Ndị na-afụ opi sokwa ha.
13 The trumpeters and singers, united, praised and thanked our Father with one voice—raising their voices with the trumpets, cymbals, and instruments, they praised him: "He is good; his covenant love endures forever." Then a cloud filled our Father's house, Ndị ọbụ abụ ahụ na ndị na-afụ opi jikọrọ onwe ha ọnụ were otu olu bụkuo Onyenwe anyị abụ ekele na otuto. Ndị na-afụ opi, na ndị na-akụ ọla na-ada ụda, na ndị ji ngwa egwu ndị ọzọ sonyeere ha, welie olu ha elu too Onyenwe anyị nʼabụ sị: “Nʼihi na Ọ dị mma Ịhụnanya ya na-adị ruo ebighị ebi.” Mgbe ahụ igwe ojii jupụtara nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị,
14 so the priests couldn't stand to serve because of the cloud, for the glory of our Father filled the house of our Father. nke mere na ndị nchụaja enwekwaghị ike jee ozi ha, nʼihi igwe ojii ahụ, nʼihi na ebube Onyenwe anyị jupụtara nʼime ụlọnsọ Chineke.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]