Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

1 John 3 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 See what kind of love our Father has given us, that we should be called children of our Father! And we are. The world doesn't know us because it didn't know him. Lee ụdị oke ịhụnanya nke Nna ahụ nwere nʼebe anyị nọ, na-aga akpọ anyị ụmụ Chineke. Nʼezie, nke a bụ ihe anyị bụ. Ihe mere na ụwa amaghị anyị bụ nʼihi na ọ maghị ya.
2 Beloved, we are our Father's children now; what we will become has not yet been shown. But we know that when he appears, we will be like him, since we will see him as he is. Ndị hụrụ nʼanya, ugbu a anyị abụrụla ụmụ Chineke. Ọ bụ ezie na anyị enweghị ike ịghọta ihe ọnọdụ anyị ga-abụ nʼoge dị nʼihu, ma anyị maara nke ọma na mgbe a ga-eme ka ọ pụta ìhè, a ga-emekwa ka anyị bụrụ ndị yiri ya, nʼihi na anyị ga-ahụ ya dịka ọ dị.
3 And everyone who has this hope in him purifies himself, just as he is pure. Onye ọbụla nwere olileanya dị otu a kwesiri idebe onwe ya ọcha, dị ka ya onwe ya dị ọcha.
4 Everyone who keeps committing sin also commits lawlessness; sin is lawlessness. Onye ọbụla na-eme mmehie na-emebi iwu. Nʼezie mmehie bụ mmebi iwu.
5 You know he appeared to take away our sins, and in him is no sin. Unu maara na e mere ka ọ pụta ìhè iwepụ mmehie. Ọ dịkwaghị mmehie ọbụla dị nʼime ya.
6 Whoever remains in him doesn't go on sinning; whoever goes on sinning hasn't seen or known him. Onye ọbụla na-anọgide nʼime ya adịghị ebi ndụ ime mmehie, onye ọbụla nke na-ebi ndụ mmehie ahụbeghị ya anya mgbe ọbụla, ọ matabekwaghị ya.
7 Little children, let no one deceive you. Whoever practices righteousness is righteous, just as he is righteous. Ezigbo ụmụ m, unu ekwela ka onye ọbụla duhie unu, onye ọbụla na-eme ezi ihe bụ onye ezi omume dị ka ya onwe ya bụ onye ezi omume.
8 Whoever keeps on sinning is of the devil, for the devil has been sinning from the beginning. The reason the Son of our Father appeared was to destroy the works of the devil. Onye ọbụla na-eme mmehie bụ nwa ekwensu, nʼihi na ekwensu bụ onye mmehie site na mmalite. Ihe mere Ọkpara Chineke jiri pụta ìhè bụ ka ọ laa ọrụ niile nke ekwensu nʼiyi.
9 No one born of our Father keeps on sinning, because his seed abides in him; and he cannot keep on sinning, because he has been born of our Father. Onye a mụrụ site na Chineke adịghị anọgide na-eme mmehie, nʼihi na mkpụrụ Chineke na-anọgide nʼime ya, ha enweghị ike ịnọgide na-eme mmehie, nʼihi na a mụrụ ha site na Chineke.
10 This shows who our Father's children are, and who the devil's children are: whoever doesn't do what's right isn't from our Father, nor is anyone who doesn't love their brother or sister. Otu a ka anyị si amata ndị bụ ụmụ Chineke, na ndị bụ ụmụ ekwensu: Onye ọbụla na-adịghị eme ihe ziri ezi abụghị nwa Chineke, otu a ka ọ dịkwa onye na-adịghị ahụ ụmụnna ha nʼanya.
11 For this is the message you have heard from the beginning: that we should love one another. Nʼihi na nke a bụ ozi ahụ unu nụrụ site na mmalite, ka anyị hụrịta onwe anyị nʼanya.
12 Not like Cain, who belonged to the evil one and killed his brother. Why did he kill him? Because his own deeds were evil and his brother's were righteous. Ka anyị hapụ ịdị ka Ken, onye bụ nke ajọ onye ahụ, na onye gburu nwanne ya. Gịnị mere o ji gbuo ya? Ọ bụ nʼihi na ọrụ ya jọrọ njọ, ma nke nwanne ya ziri ezi.
13 Do not be surprised, brothers and sisters, if the world hates you. Ka ọ gharakwa iju unu anya ụmụnna m, na ụwa kpọrọ unu asị.
14 We know we've passed from death to life, because we love each other. Whoever doesn't love remains in death. Anyị matara na anyị esitela nʼọnwụ baa na ndụ nʼihi na anyị na-ahụ ụmụnna anyị nʼanya. Onye ọbụla na-adịghị ahụ ibe ya nʼanya na-anọgide nʼọnwụ.
15 Everyone who hates his brother or sister is a murderer, and you know no murderer has eternal life remaining in him. Onye ọbụla na-akpọ nwanna ya asị bụ ogbu mmadụ, unu matakwara na o nweghị onye ọbụla bụ ogbu mmadụ nwere ndụ ebighị ebi nʼime ya.
16 This is how we know love: Christ laid down his life for us; we too should lay down our lives for one another. Ọ bụ otu a ka anyị sị mata ihe bụ ịhụnanya, na Jisọs tọgbọrọ ndụ ya nʼihi anyị. Anyị kwesikwara ịtọgbọ ndụ anyị nʼihi ụmụnna anyị.
17 But if anyone has the world's goods and sees his brother or sister in need, yet closes his heart to them, how does our Father's love remain in him? Ọ bụrụ na onye ọbụla nwere akụ nke ụwa, ahụ nwanna ya ka ọ nọ na mkpa ma o nweghị obi ebere nʼebe ọ nọ, olee otu ịhụnanya Chineke si dịrị nʼime ya?
18 Little children, let us not love with words or talk, but in deed and in truth. Ụmụntakịrị m, ka ịhụnanya anyị ghara ịbụ naanị nʼegbugbere ọnụ maọbụ nke okwu efu, kama ka ọ bụrụ nke sitere nʼeziokwu nakwa nʼomume anyị.
19 By this we'll know we come from the truth, and settle our heart before him, Anyị ga-esitekwa na nke a mata na anyị bụ ndị nke eziokwu ahụ ma matakwa otu anyị ga-esi mee ka obi anyị kwenye nʼihu ya.
20 whenever our heart condemns us; for our Father is greater than our heart, and he knows everything. Nʼihi na ọ bụrụ na obi anyị amaa anyị ikpe, Chineke dị ukwuu karịa obi anyị, ọ mazukwara ihe niile.
21 Beloved, if our heart does not condemn us, we have confidence before our Father; Ndị m hụrụ nʼanya, ọ bụrụ na obi anyị amaghị anyị ikpe, anyị nwere nkwuwa okwu nʼihu Chineke
22 whatever we ask, we receive from him, because we keep his commands and do what pleases him. na-anatakwa ya ihe ọbụla anyị rịọrọ nʼihi na anyị na-erube isi nʼiwu ya, na-emekwa ihe na-atọ ya ụtọ.
23 This is his command: believe in his Son Jesus Christ's name, and love one another as he commanded us. Nke a bụkwa iwu ya: ka anyị kwere nʼaha Ọkpara ya Jisọs Kraịst, ya na ịhụrịta ibe anyị nʼanya dịka o nyere anyị nʼiwu.
24 Whoever keeps his commands remains in our Father, and our Father in them. This is how we know he remains in us: by the Holy Spirit he gave us. Ndị niile na-erube isi nye iwu ya na-anọgidesikwa ike nʼime ya, ya onwe ya na-anọgidesikwa ike nʼime ndị ahụ! Otu a ka anyị si mara na ọ na-anọgidesike nʼime anyị: Ọ bụ site na Mmụọ nke o nyere anyị.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]