Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

1 John 2 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 My dear children, I write this so you won't sin. But if anyone does sin, we have an advocate before the Father—Jesus Christ, the righteous one. Ezi ụmụntakịrị m, ana m edere unu ihe ndị a ka unu ghara imehie. Ma ọ bụrụ na onye ọbụla emehie, anyị nwere onye na-ekwuchite ọnụ anyị nʼihu Nna ahụ. Ọ bụ Jisọs Kraịst, Onye ezi omume ahụ.
2 He himself is the atoning sacrifice for our sins, and not ours only but also the whole world's. Ọ bụ onye jiri onwe ya chụọ aja nʼihi ikpuchiri anyị mmehie anyị, ma ọ bụghị naanị nʼihi mmehie anyị, ọ bụkwa nʼihi mmehie ụwa niile.
3 By this we know that we have come to know him: if we keep his commandments. Otu a ka anyị si amata na anyị maara onye ọ bụ, ma ọ bụrụ na anyị erube isi nye iwu ya niile.
4 Whoever says, "I know him," yet doesn't keep his commands, is a liar—the truth isn't in him. Onye ahụ na-ekwu sị, “Amaara m ya,” ma ọ dịghị eme ihe o nyere nʼiwu bụ onye okwu ụgha, eziokwu ahụ adịghịkwa nʼime ya.
5 But whoever keeps his word, the love of our Father is truly complete in him. This is how we know we are in him: Ma ọ bụrụ na onye ọbụla na-erube isi nʼokwu ya, nʼezie, ịhụnanya Chineke bụ ihe emere ka o zuo oke nʼime ya. Ọ bụ otu a ka anyị si amata na anyị nọ nʼime ya.
6 Whoever claims to remain in him ought to walk in the very way he walked. Onye ọbụla na-ekwu na ya bi nʼime ya kwesiri ibi ndụ dịka ya.
7 Dear ones, I write you no new command, but an old one, held since the start—the old command is the word you heard. Ndị enyi m hụrụ nʼanya, anaghị m edere unu ihe gbasara iwu ọhụrụ, kama ọ bụ otu iwu ochie ahụ, nke na-adị site na mbụ. Iwu ochie a bụ nke e ziri unu ozi banyere ya.
8 Again, I write you a new command—true in him and in you—because the darkness is passing and the true light already shines. Ma otu ọ dị, ana m edere unu iwu ọhụrụ, nke bụ eziokwu nʼime ya na nʼime unu. Nʼihi na ọchịchịrị na-agafe, ezi ìhè ebidola ịchawapụta.
9 Anyone who says they're in the light but hates their brother or sister is in the dark even now. Onye ọbụla na-asị na ya nọ nʼìhè ma na-akpọ nwanna ya asị, na-anọ nʼọchịchịrị ruo ugbu a.
10 Whoever loves his brother or sister abides in the light, and in him there is no cause for stumbling. Onye ọbụla na-ahụ nwanna ya nʼanya na-ebi nʼime ihe ahụ ọ dịkwaghị ìhè dị nʼime onye dị otu a bụ nke ga-eme ya ka ọ sụọ ngọngọ.
11 But whoever hates his brother or sister is in the dark, walking in the dark, not knowing where he's going—the dark has blinded his eyes. Ma onye ọbụla na-akpọ nwanna ya asị nọ nʼọchịchịrị, na-ejegharịkwa nʼime ọchịchịrị; ọ maghị ebe ọ na-aga nʼihi na ọchịchịrị ahụ emeela ka o kpuo ìsì.
12 I write to you, little children, because your sins are forgiven for his name's sake. Ana m edere unu ihe ndị a ụmụntakịrị m nʼihi na a gbagharala unu mmehie niile site nʼaha ya.
13 I write to you, fathers, because you know the One from the beginning. I write to you, young men, because you have defeated the evil one. Ana m edere unu ndị bụ nna ihe ndị a, nʼihi na unu maara onye ahụ na-adị site na mbụ. Ana m edere unu ụmụ okorobịa, nʼihi na unu emeriela ajọ onye ahụ.
14 Children, I write because you know the Father. Fathers, I write because you know the One from the beginning. Young men, I write because you're strong, and our Father's word lives in you, and you've overcome the evil one. Ana m edere unu ụmụntakịrị, nʼihi na unu maara nna ahụ. Ana m edere unu ndị nna, nʼihi na unu maara onye ahụ na-adị site na mbụ. Ana m edere unu ụmụ okorobịa, nʼihi na unu siri ike, okwu Chineke na-ebikwa nʼime unu, unu emeriekwala ajọ onye ahụ.
15 Do not love the world, or anything in the world. Whoever loves the world, the love of the Father is not in him. Kwụsịnụ ịhụ ụwa nʼanya, ya na ihe niile dị nʼụwa. Ọ bụrụ na onye ọbụla ahụ ụwa nʼanya ịhụnanya nke Nna adịghị nʼime ya.
16 Everything in the world—the craving of the flesh, the craving of the eyes, and the pride of life—is not from the Father but from the world. Nʼihi na ihe niile dị nʼụwa, ihe ndị ahụ niile anụ ahụ anyị, na anya anyị na-achọ, ya na ịnya isi mmadụ banyere ihe ọ bụ na ihe o nwere, esiteghị nʼebe Nna nọ, kama ha sitere nʼụwa.
17 The world and its cravings are passing away, but whoever does the will of our Father remains forever. Ụwa na ọchịchọ ọjọọ ya niile na-agafe agafe, ma onye ahụ na-eme uche Chineke ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.
18 Children, it is the last hour. As you heard antichrist comes, so now many antichrists have come; by this we know it's the last hour. Ụmụ m, nke a bụ oge awa nke ikpeazụ. Dịka unu nụrụ na otu onye na-emegide Kraịst na-abịa, ọ bụladị ugbu a, ọtụtụ ndị na-emegide Kraịst abịala. Otu a ka anyị si amata na ọ bụ oge awa nke ikpeazụ.
19 They went out from us, but were not of us; if they had been of us, they would have stayed with us. But they left, to show that none of them belonged to us. Ha si nʼetiti anyị pụọ, ma ha abụghị ndị nke anyị nʼezie. Nʼihi na a sị na anyị na ha bụ otu, ha gaara aga nʼihu soro anyị nọdụ. Ma ọpụpụ ha pụrụ na-egosi na ọ dịghị onye nʼime ha sonyere anyị.
20 But you have an anointing from the Holy One, and you all know the truth. Ma unu nwere otite mmanụ sitere nʼOnye Nsọ ahụ, unu niile matakwara ihe niile.
21 I write to you not because you don't know the truth, but because you do—and no lie comes from the truth. Ya mere, anaghị m edegara unu akwụkwọ a dịka ndị na-amaghị eziokwu kama nʼihi na unu maara ya na nʼihi na ọ dịghị okwu ụgha ọbụla na-esi nʼeziokwu ahụ apụta.
22 Who is the liar, if not the one denying Jesus is the Christ? This is the antichrist, denying the Father and the Son. Onye bụ onye okwu ụgha? Ọ bụ onye ahụ na-asị na Jisọs abụghị Kraịst ahụ. Onye dị otu a bụ onye na-emegide Kraịst, nʼihi na ọ nabataghị Nna ahụ na Ọkpara ya.
23 No one who denies the Son has the Father. Whoever confesses the Son has the Father also. Onye ọbụla jụrụ Ọkpara ahụ enwekwaghị Nna ahụ; ma onye ọbụla nabatara Ọkpara ahụ nwekwara Nna ahụ.
24 You—let what you heard from the start remain in you. If what you heard from the start remains in you, you too will remain in the Son and the Father. Hụnụ na ihe unu nụrụ site na mmalite na-anọgide nʼime unu. Ọ bụrụ na ihe unu nụrụ na mbido ebiri nʼime unu, unu ga-anọgide nʼime Ọkpara ahụ na nʼime Nna ahụ.
25 And this is the promise that he himself made to us—eternal life. Ihe o kwere anyị na nkwa bụ nke a, ndụ ebighị ebi.
26 I write these things to you about those who are trying to lead you astray. Ana m edere unu ihe ndị a banyere ndị ahụ na-agbalị iduhie unu.
27 As for you, the anointing you received from him remains in you, and you don't need anyone to teach you. But since his anointing teaches you about everything—true, not a lie—remain in him, just as it taught you. Ma unu onwe unu, otite mmanụ ahụ unu natara nʼaka ya na-anọgide nʼime unu, nʼihi nke a, onye ozizi ọzọ adịghị unu mkpa. Dịka otite mmanụ ya na-ezi unu ihe banyere ihe niile, bụrụkwa eziokwu, ọ bụghị okwu ụgha. Ya mere, dịka o zikwara unu, na-anọgidenụ nʼime ya.
28 And now, little children, remain in him, so that when he appears we may have confidence and not shrink from him in shame at his coming. Ugbu a ụmụntakịrị m, nọgidesienụ ike nʼime ya, ka ọ ga-abụ mgbe e mere ka ọ pụta ìhè, anyị ga-abụ ndị obi siri ike, ndị ihere na-agaghị eme, nʼihu ya mgbe ọ bịara.
29 If you know he's righteous, you also know that all who do right are born of him. Ọ bụrụ na unu matara na ọ bụ onye ezi omume, unu maara na onye ọbụla nke na-eme ihe ziri ezi bụ onye a mụrụ site na ya.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]