Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

1 Chronicles 4 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 The descendants of Judah: Perez, Hezron, Carmi, Hur, and Shobal. Ndị ikwu Juda bụ Perez, Hezrọn, Kami, Hua na Shobal.
2 Reaiah son of Shobal fathered Jahath; Jahath fathered Ahumai and Lahad—the clans of the Zorathites. Shobal mụrụ Reaya, onye bụ nna Jahat. Jahat bụ nna Ahumai na Lahad, ndị a bụ ndị ikwu Zorat.
3 These were the sons of Etam: Jezreel, Ishma, and Idbash; and their sister's name was Hazzelelponi. Ndị a bụ ụmụ Etam: Jezril, na Ishma, na Idbash, aha nwanne ha nwanyị bụ Hazelelponi.
4 Penuel fathered Gedor, and Ezer fathered Hushah. These were sons of Hur, firstborn of Ephrathah, father of Bethlehem. Penuel bụ nna Gedoa, Eza bụ nna Husha. Ndị a bụ ụmụ Hua, bụ ọkpara Efrata, nna Betlehem.
5 Ashhur the father of Tekoa had two wives, Helah and Naarah. Ashua nna Tekoa lụrụ ndị nwunye abụọ: Hela na Naara.
6 Naarah gave birth to Ahuzzam, Hepher, Temeni, and Haahashtari. These were Naarah's sons. Naara mụtaara ya Ahuzam, na Hefa, na Temeni, na Haahashitari. Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Naara.
7 The sons of Helah: Zereth, Zohar, and Ethnan. Ụmụ ndị ikom Hela mụtara bụ Zeret, Zoha, Etnan
8 Koz fathered Anub and Zobebah, and the clans of Aharhel son of Harum. na Koz, onye bụ nna Anub na Hazobeba, nakwa nke ikwu Ahahel, nwa Harum.
9 Jabez was more honored than his brothers; his mother named him Jabez, saying, "Because I bore him in pain." Jabez bụ nwoke a na-asọpụrụ karịa ụmụnne ya ndị ikom niile. Nne ya kpọrọ aha ya Jabez, sị, “A mụrụ m ya nʼihe mgbu.”
10 Jabez called out to our Father of Israel: "Oh, that you would truly bless me and enlarge my territory! Let your hand be with me, and keep me from harm so that I suffer no pain." And our Father granted his request. Jabez tikuru Chineke Izrel mkpu akwa sị ya, “Biko gọzie m, mee ka oke ala m saa mbara. Kwere ka aka gị dịkwasị m, ma wezuga m site nʼihe mmerụ ahụ ọbụla, ka m si otu a gbanarị ihe mgbu.” Chineke zara ekpere ya meere ya ihe ọ rịọrọ.
11 Chelub the brother of Shuhah fathered Mehir, who was the father of Eshton. Kelub, nwanne nwoke Shua mụrụ Mehia, nna Eshton,
12 Eshton fathered Beth-rapha, Paseah, and Tehinnah the father of Ir-nahash. These were the men of Recah. Eshton mụrụ Bet-Raafa, na Pasea, na Tihina. Tihina mụrụ Ir Nahash. Ndị a niile bụ ndị ikwu Reka.
13 The sons of Kenaz: Othniel and Seraiah; and the sons of Othniel: Hathath and Meonothai. Ụmụ ndị ikom Kenaz mụtara bụ, Otniel na Seraya. Otniel amụta Hatat na Meonotai.
14 Meonothai fathered Ophrah. Seraiah fathered Joab, father of Ge-harashim, the Craftsmen's Valley—its people were craftsmen. Meonotai bụ nna Ofra. Seraya bụ nna Joab, Joab bụ nna Ge Harashim. A kpọrọ ha Ge Harashim nʼihi na ha bụ ndị ǹka.
15 Sons of Caleb son of Jephunneh: Iru, Elah, and Naam; and the son of Elah: Kenaz. Kaleb nwa Jefune mụrụ Iru, Elaa na Naam. Ma Elaa mụrụ Kenaz.
16 The sons of Jehallelel: Ziph, Ziphah, Tiria, and Asarel. Ụmụ ndị ikom Jehalelel mụrụ bụ ndị a: Zif, Zifa, Tiria na Asarel.
17 Ezrah's sons: Jether, Mered, Epher, and Jalon. Mered's wife bore Miriam, Shammai, and Ishbah, father of Eshtemoa. Ụmụ Ezra bụ Jeta, Mered, Efaa na Jalon. Otu nʼime ndị nwunye Mered lụrụ mụtara Miriam, Shamai na Ishba, bụ nna Eshtemoa.
18 His Judean wife bore Jered father of Gedor, Heber father of Soco, and Jekuthiel father of Zanoah—sons of Bithiah, Pharaoh's daughter, whom Mered married. Ndị a bụkwa ụmụ ndị ikom Bitaya, bụ nwa nwanyị Fero, nke Mered lụrụ. Nwunye ya nke si nʼebo Juda mụrụ Jered bụ nna Gedoa, Heba nna Soko na Jekutiel nna Zanoa.
19 The sons of Hodiah's wife, the sister of Naham, fathered Keilah the Garmite and Eshtemoa the Maacathite. Ụmụ ndị ikom nwunye Hodia, nwanne nwanyị Naham, bụ nna Keila onye Gam na Eshtemoa onye Maaka.
20 The sons of Shimon: Amnon, Rinnah, Ben-hanan, and Tilon. The sons of Ishi: Zoheth and Ben-zoheth. Ụmụ ndị ikom Shimon mụrụ bụ Amnọn, Rina, Ben-Hanan na Tilon. Ishi mụrụ Zohet na Ben-Zohet.
21 Sons of Shelah son of Judah: Er father of Lecah, Laadah father of Mareshah, and the linen-worker clans of Beth-ashbea. Ụmụ Shela nwa Juda mụrụ bụ Ịa, nna Leka, Laada, nna Maresha, na ikwu ndị ọrụ ịkpa ezi akwa ọcha nọ na Bet Ashbea
22 Jokim, the men of Cozeba, Joash, and Saraph, who ruled in Moab, then returned to Bethlehem—these records are ancient. na Jokim, ndị ikom Koziba, na Joash na Saraf, ndị chịrị na Moab na Jashubi Lehem. Aha ndị a sitere nʼakwụkwọ akụkọ mgbe ochie.
23 These were the potters living at Netaim and Gederah, staying there to work for the king. Ha bụ ndị ọkpụ ite, ndị biri na Netaim ya na Gedera. Ha biri nʼebe ahụ nʼihi ịrụrụ eze ọrụ.
24 The sons of Simeon: Nemuel, Jamin, Jarib, Zerah, and Shaul; Simiọn mụrụ Nemuel, Jamin, Jarib, Zera na Shaul.
25 Shallum his son, Mibsam his son, Mishma his son. Shaul mụrụ Shalum nna Mibsam. Mibsam bụkwa nna Mishma.
26 The sons of Mishma: Hammuel his son, Zaccur his son, Shimei his son. Ụmụ Mishma mụrụ bụ Hamuel nwa ya, Zakua nwa ya na Shimei nwa ya.
27 Shimei had sixteen sons and six daughters, but his brothers had few children, and their clan never grew as numerous as Judah's. Shimei mụrụ ndị ikom iri na isii, na ndị inyom isii. Ụmụnne ya ndị ikom enweghị ọtụtụ ụmụ dịka ya onwe ya. Nʼihi ya, ndị ikwu ya adịghị ukwu nʼọnụọgụgụ dịka ndị ọzọ na Juda.
28 They lived in Beersheba, Moladah, Hazar-shual, Ha biri na Bịasheba, Molada, Haza Shual,
29 Bilhah, Ezem, Tolad, Bilha, Ezem, Tolad,
30 Bethuel, Hormah, Ziklag, Betuel, Homa, Ziklag,
31 Beth-marcaboth, Hazar-susim, Beth-biri, and Shaaraim. These were their towns until David became king. Bet-Makabot, Haza-Susim, Bet-Biri na Shaaraim. Ọ bụ ha bi nʼobodo ndị a niile tutu ruo nʼoge ọchịchị Devid.
32 Their surrounding villages were Etam, Ain, Rimmon, Tochen, and Ashan—five towns, Obodo gbara ha gburugburu bụ Etam, Ain, Rimọn, Token na Ashan, obodo ise,
33 and all their villages around these towns, as far as Baal. These were their settlements, and they kept their own genealogical records. tinyere obodo nta niile gbara obodo ndị a gburugburu ruo na Baalat. Ndị a bụ ebe obibi ha. Ha nwekwara akwụkwọ usoro ọmụmụ.
34 Meshobab, Jamlech, Joshah the son of Amaziah, Meshobab, Jamlek, Josha nwa Amazaya,
35 Joel, Jehu the son of Joshibiah, the son of Seraiah, the son of Asiel, Juel, Jehu nwa Joshibaya, nwa Seraya, nwa Asiel,
36 Elioenai, Jaakobah, Jeshohaiah, Asaiah, Adiel, Jesimiel, Benaiah, nakwa Elioenai, Jaakoba, Jeshohaya, Asaya, Adiel, Jesimiel na Benaya,
37 and Ziza the son of Shiphi, the son of Allon, the son of Jedaiah, the son of Shimri, the son of Shemaiah. na Ziza nwa Shifi, nwa Alon, nwa Jedaya, nwa Shimri, nwa Shemaya.
38 These men listed by name were leaders in their clans, and their families grew greatly in number. Ndị ikom ndị a e depụtara aha ha bụ ndị ndu ikwu ha. Ezinaụlọ ha mụbara nke ukwuu,
39 They went to Gedor's entrance, east of the valley, seeking pasture for their flocks. ha gakwara na mpụta Gedoa nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ndagwurugwu ịchọrọ igwe anụ ụlọ ha ebe ịta nri.
40 They found rich, good pasture; the land was wide, quiet, and peaceful, for its earlier residents were from Ham. Ha chọtara ebe ịta ahịhịa anụ ụlọ mara mma, nke sara mbara, nke dị jụụ, bụrụkwa ebe nsogbu na-adịghị. Ụfọdụ nʼime ụmụ Ham ebiela nʼebe ahụ na mbụ.
41 These men, recorded by name, came in the days of Hezekiah king of Judah, attacked the Hamites' tents and the Meunites found there, destroyed them completely to this day, and settled in their place, since there was pasture there for their flocks. Ndị ikom ndị a e dere aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ bịara nʼoge Hezekaya na-achị dịka eze Juda. Ha busoro ụmụ Ham agha nʼebe obibi ha, busokwa ndị Meunim bi nʼebe ahụ agha, bibie ha kpamkpam, dịka ọ dị ruo taa. Emesịa ha bichiri ebe ahụ nʼihi na ebe ịta ahịhịa nke igwe anụ ụlọ ha nʼebe ahụ.
42 Some Simeonites—500, led by Ishi's sons Pelatiah, Neariah, Rephaiah, and Uzziel—went to Mount Seir. Ọzọkwa, narị ndị ikom ise nʼime ndị a si nʼebo Simiọn, ndị ndu ha bụ Pelataya, Nearaya, Refaya na Uziel, ụmụ Ishi busoro obodo ugwu ugwu Sia agha.
43 They struck down the surviving remnant of the Amalekites and have lived there to this day. Ha gburu ndị Amalek fọdụrụ ndụ nʼebe ahụ, bichie ala ahụ ruo taa.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]