Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

1 Chronicles 5 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 The sons of Reuben, Israel's firstborn—he was indeed the firstborn, but since he violated his father's bed, his birthright went to the sons of Joseph son of Israel, so he could not be listed as the firstborn in the genealogy. Ọkpara Izrel bụ Ruben. Ma nʼihi na ọ merụrụ ihe ndina nna ya site na idinakwuru nwunye nna ya, a napụrụ ya ọnọdụ ọkpara ya were ya nye ụmụ nwanne ya Josef mụtara. Nʼihi ya, akwụkwọ akụkọ usoro ọmụmụ ụmụ Izrel akpọghị Ruben ọkpara.
2 Though Judah grew strong among his brothers and a ruler came from him, the birthright was Joseph's. Ọ bụ ezie na Juda dị ike karịa ụmụnna ya, bụrụkwa eziokwu na onyendu si na Juda pụta, maọbụ Josef ka e nyere oke ruuru ọkpara.
3 The sons of Reuben the firstborn of Israel: Hanoch, Pallu, Hezron, and Carmi. Ruben, ọkpara Izrel mụrụ ndị ikom ndị a: Hanok, na Palu, na Hezrọn, na Kami.
4 The sons of Joel: Shemaiah his son, Gog his son, Shimei his son, Juel mụrụ Shemaya, nna Gog, Gog mụrụ Shimei.
5 Micah his son, Reaiah his son, Baal his son, Shimei mụrụ Maịka, Maịka amụọ Reaya. Reaya amụọ Baal.
6 and Beerah his son, whom Tiglath-pileser king of Assyria exiled—he led the Reubenites. Baal mụrụ Beera, onye Tiglat-Pilesa eze ndị Asịrịa dọtara nʼagha. Beera bụkwa onyendu ndị Ruben.
7 His relatives by their clans, as listed in the genealogical records: Jeiel the chief, Zechariah, Ndị ụmụnna ha dịka agbụrụ niile ha si dị, bụ ndị e depụtara aha ha dịka usoro ọmụmụ ha si dị; Jeiel onyeisi, na Zekaraya,
8 and Bela son of Azaz, son of Shema, son of Joel. They settled in Aroer, to Nebo and Baal-meon. na Bela nwa Azaz nwa Shema, nwa Juel. Ha nwere ebe obibi ha site nʼAroea ruo nʼugwu Nebo, rukwaa Baal-Meon.
9 They also settled eastward to the edge of the desert that stretches to the Euphrates, since their livestock had multiplied in Gilead. Ha bụ ndị ọzụzụ atụrụ, nwekwa ọtụtụ igwe anụ ụlọ. Ọ bụkwa nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, nʼọnụ ọzara ruo nʼosimiri Yufretis ka ha na-azụ ha, nʼihi na anụ ụlọ ha nwere bara ụba na Gilead.
10 In Saul's days they fought the Hagrites, who fell to them; they lived in the Hagrites' tents across the whole region east of Gilead. Nʼoge Sọl bụ eze Izrel, ụmụ Ruben meriri ndị Haga nʼagha, bichie ala ha niile dị nʼọwụwa anyanwụ Gilead.
11 The sons of Gad lived next to them in the land of Bashan as far as Salcah: Ụmụ Gad bi nʼakụkụ ha site na Bashan ruo Saleka.
12 Joel the chief, Shapham the second-in-command, then Janai and Shaphat in Bashan. Juel bụ onyendu na Bashan, Shafam na-esote ya, ya na Janai na Shafat.
13 Their relatives, by their fathers' households, were Michael, Meshullam, Sheba, Jorai, Jacan, Zia, and Eber—seven. Ụmụnna ha, ndị bụ ndị ndu ikwu asaa a bụ, Maikel, na Meshulam, na Sheba, na Jorai, na Jakan, na Zia, na Eba.
14 These were sons of Abihail son of Huri, son of Jaroah, son of Gilead, son of Michael, son of Jeshishai, son of Jahdo, son of Buz. Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Abihail, nwa Huri, nwa Jaroa, nwa Gilead, nwa Maikel, nwa Jehishai, nwa Jado, nwa Buz.
15 Ahi son of Abdiel, son of Guni, was the head of their fathers' households. Ahi nwa Abdiel, nwa Guni bụ onyeisi nʼetiti ụmụnna ya.
16 They lived in Gilead, in Bashan and its villages, and across all Sharon's pasturelands to their borders. Ndị Gad nwere ebe obibi na Gilead nʼime Bashan, na nʼobodo nta niile gbara ya gburugburu. Ha bikwa nʼebe ahịhịa anụ ụlọ na-ata jupụtara na Sharọn ruo nʼebe oke ala ha kwụsịrị.
17 All these were listed in genealogies during the reigns of Jotham king of Judah and Jeroboam king of Israel. E denyere aha ndị a niile nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ nʼoge Jotam bụ eze Juda, na nʼoge Jeroboam bụ eze Izrel.
18 The Reubenites, Gadites, and half-tribe of Manasseh had capable men bearing shield and sword, drawing the bow, trained for war—44,760 ready for battle. Ndị Ruben na ndị Gad, na ọkara ebo Manase nwere iri puku mmadụ anọ na anọ na narị asaa na iri isii (44,760) ndị jikeere ije agha, ndị dị ike, ndị a zụrụ iji ọta na mma agha, na ụta ibu agha.
19 They waged war against the Hagrites, and against Jetur, Naphish, and Nodab. Ha busoro ndị Haga, na Jetua, na Nafish na ndị Nodab agha.
20 They were helped against them; the Hagrites and all their allies were given into their hand, because they cried out to our Father in battle. He answered them, for they trusted in him. E nyeere ha aka ibuso ha agha, Chineke nyefere ndị Haga na ndị niile na-enyere ha aka nʼaka ha, nʼihi na ha kpọkuru ya nʼoge ọgụ ahụ. Ọ zara ekpere ha nʼihi na ha tụkwasịrị ya obi.
21 They captured the Hagrites' livestock: 50,000 camels, 250,000 sheep, 2,000 donkeys, and 100,000 people. Ha ji ike chịkọrọ anụ ụlọ ndị Haga, dị iri puku ịnyịnya kamel ise, narị puku atụrụ abụọ na iri puku ise, puku ịnyịnya ibu abụọ. Ha dọkpụkwara narị puku ndị mmadụ nʼagha.
22 Many fell dead, for the battle was our Father's; they lived there until the exile. E gbukwara ọtụtụ ndị mmadụ nʼihi na agha ahụ bụ nke Chineke lụrụ nʼonwe ya. Ha bichiri ala ahụ tutu ruo mgbe a dọọrọ Izrel niile nʼagha.
23 Manasseh's half-tribe lived in the land, growing numerous from Bashan to Baal-hermon, Senir, and Mount Hermon. Ọkara ebo Manase dị ukwuu nʼọnụọgụgụ; ha nwere ebe obibi ha site nʼala Bashan ruo Baal-Hemon, ya bụ, ruo Senia, ugwu Hemon.
24 Heads of their fathers' households: Epher, Ishi, Eliel, Azriel, Jeremiah, Hodaviah, and Jahdiel—mighty warriors, famous men, heads of their fathers' households. Ndịisi ikwu ha niile bụ ndị a: Efaa, Ishi, Eliel, Azriel, Jeremaya, Hodavaya na Jadiel. Ndị a niile bụ dimkpa nʼagha, ndị a ma ama na ndịisi ezinaụlọ.
25 But they were unfaithful to their ancestors' God and prostituted themselves to the gods of the land's peoples, whom our Father had destroyed before them. Ma ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Chineke nna nna ha. Kama ha merụrụ onwe ha site nʼife chi niile nke ndị bi nʼala ahụ na mbụ, bụ ndị Chineke lara nʼiyi nʼihu ha.
26 So our Father of Israel stirred up the spirit of Pul king of Assyria—Tiglath-pileser king of Assyria—and he exiled the Reubenites, Gadites, and half-tribe of Manasseh to Halah, Habor, Hara, and the river Gozan, where they remain to this day. Nʼihi nke a, Chineke nke Izrel kpaliri mmụọ Pul, bụ eze Asịrịa (ya bụ Tiglat-Pilesa eze ndị Asịrịa), ka o bilie megide ndị Ruben, ndị Gad na ọkara ebo Manase, dọta ha nʼagha, buru ha gaa Hala, na Hoboa, na Hara na osimiri Gozan, ebe ha nọ ruo taa.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]