Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Numbers 9 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Our Father spoke to Moses in the Sinai wilderness, in the first month of the second year after they left Egypt: Onyenwe anyị gwara Mosis okwu ndị a nʼọzara Saịnaị nʼọnwa mbụ nʼafọ nke abụọ site nʼoge ha hapụrụ ala Ijipt. Ọ sịrị ya,
2 "Let the people of Israel keep the Passover at its appointed time. “Gwa ụmụ Izrel ka ha mee Mmemme Ngabiga nʼoge a kara aka.
3 On this month's fourteenth day, at twilight, observe it at its set time, by all its statutes and all its rules." Ha mee ya nʼoge a kara aka, malite nʼuhuruchi abalị iri na anọ nke ọnwa a. Ha ga-eme ya nʼusoro dịka iwu na ụkpụrụ e ji eme ya si dị.”
4 So Moses told the people of Israel that they should keep the Passover. Ya mere, Mosis gwara ndị Izrel sị ha mee Mmemme Ngabiga.
5 In the wilderness of Sinai, they kept the Passover on day fourteen of the first month, at twilight, as our Father commanded Moses; so the children of Israel did. Ha mekwara ya nʼọzara Saịnaị malite nʼuhuruchi abalị iri na anọ nke ọnwa mbụ. Ndị Izrel mere ihe niile nʼusoro dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.
6 Some men were unclean from touching a corpse and could not observe Passover that day, so they came before Moses and Aaron that day. Ma ụfọdụ nʼime ụmụ Izrel esoghị mee Mmemme Ngabiga ahụ nʼihi na ha rụrụ arụ site nʼịnọ ozu nso. Nʼihi ya, ha bịakwutere Mosis na Erọn nʼụbọchị ahụ,
7 Those men said to him, "We are unclean from a dead body. Why must we be kept from presenting our Father's offering at its appointed time among the Israelites?" sị Mosis, “Anyị ghọrọ ndị rụrụ arụ nʼihi ịnọ ozu mmadụ nso. Gịnị ga-egbochi anyị iso ndị Izrel ndị ọzọ iwetara Onyenwe anyị onyinye nʼoge a kara aka?”
8 And Moses said to them, "Wait here until I hear what our Father will command about this." Mosis zara sị ha, “Cherenụ ka m ga jụta Onyenwe anyị ihe bụ uche ya banyere mkpa unu.”
9 Our Father spoke to Moses, saying, Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
10 "Tell the Israelites: if any of you or your descendants is unclean from a corpse, or off on a distant journey, he may still keep the Passover to our Father. “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Ọ bụrụ na e nwee onye Izrel ọbụla nke merụrụ onwe ya nʼoge Mmemme Ngabiga site nʼịnọ ozu mmadụ nso, maọbụ site nʼịnọ nʼije, ha nwekwara ike iso mee Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị.
11 In month two, on day fourteen, at twilight, they must keep it, eating it with unleavened bread and bitter herbs. Kama ha ga-eme ya nʼuhuruchi abalị iri na anọ nke ọnwa abụọ. Ha ga-eri nwa atụrụ ha, achịcha na-ekoghị eko, na ahịhịa ilu.
12 They are to leave none of it until morning, break no bone of it, and keep it by every statute of the Passover. Ha agaghị erifọ ihe ọbụla nʼime ya ruo chi ọbụbọ ụbọchị so ya. Ha agaghị agbaji ọkpụkpụ ọbụla nke nwa atụrụ ahụ. Mgbe ha mere Mmemme Ngabiga, ha ga-esorokwa ụzọ niile e si eme mmemme ahụ mee nke ha.
13 But if a man is clean and not traveling, yet does not keep the Passover, that person must be cut off from his people, because he failed to bring our Father's offering at its set time; that man will bear his sin. Ma ọbụla nọ nʼọnọdụ ịdị ọcha, onye nke na-anọghị nʼije nʼoge Mmemme Ngabiga ma kpachapụrụ anya hapụ isoro ndị ọzọ nʼoge mmemme a, a ga-ewezuga ya site nʼetiti ụmụ Izrel niile, nʼihi na ọ jụrụ iwetara Onyenwe anyị onyinye nʼoge a kara aka. Onye dị otu a ga-ebu ahụhụ mmehie ya nʼisi ya.
14 "If a foreigner living among you wants to keep the Passover to our Father, he must follow the Passover's statute and rule. One statute applies to both foreigner and native of the land." “ ‘Onye ọbịa bi nʼetiti unu chọrọ iso na Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị, ọ ga-eme ya nʼusoro dịka iwu na ụkpụrụ e nyere si dị. Unu ga-enwe otu iwu ahụ nye onye amụrụ nʼala na mbịarambịa.’ ”
15 When the tabernacle—the tent of the testimony—was set up, the cloud covered it; from evening until morning it looked like fire over the tabernacle. Nʼụbọchị ahụ e guzobere ụlọ nzute ahụ bụ ụlọ ikwu nke igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ, igwe ojii kpuchiri ya. Site nʼuhuruchi ruo nʼụtụtụ igwe ojii ahụ dị nʼelu ụlọ nzute ahụ dịka ọkụ nʼile anya.
16 So it was continually: the cloud covered it by day, and the appearance of fire by night. Otu a ka ọ dịgidere mgbe niile. Igwe ojii kpuchigidere ya, ma nʼabalị ọ na-acha dị ka ọkụ.
17 Whenever the cloud lifted from over the tent, the Israelites set out; wherever it settled, the Israelites camped. Mgbe ọ bụla igwe ojii ahụ si nʼelu ụlọ nzute ahụ bilie, ụmụ Izrel na-ebuli njem, ma mgbe ọbụla igwe ojii ahụ na-anọgide, ha na-anọgidekwa.
18 At our Father's command Israel's people set out; at our Father's command they camped. As long as the cloud rested over the tabernacle, they remained camped. Mgbe Onyenwe anyị nyekwara iwu, ha na-akwụsị, maa ụlọ ikwu ha. Oge niile igwe ojii nọgidere nʼelu ụlọ nzute ahụ ka ụmụ Izrel na-anọgidekwa nʼụlọ ikwu ha.
19 When the cloud lingered over the tabernacle many days, the Israelites kept our Father's charge and did not set out. Ọ bụrụ na igwe ojii ahụ anọọtee anya, ụmụ Izrel nʼonwe ha na-erube isi nʼiwu Onyenwe anyị hapụ ịga nʼihu nʼije ha.
20 Sometimes the cloud stayed on the dwelling only a few days: at the command of our Father they camped, at the command of our Father they set out. Oge ụfọdụ, igwe ojii ahụ na-anọgide naanị abalị ole na ole. Dịka iwu Onyenwe anyị si dị, ha na-ama ụlọ ikwu ha, maọbụ bulie njem ha.
21 Sometimes the cloud stayed from evening to morning; when it lifted in the morning, they set out. Whether by day or night, when the cloud lifted, they set out. Oge ụfọdụ, igwe ojii ahụ na-anọgide naanị site nʼuhuruchi ruo nʼụtụtụ. Mgbe o si nʼelu ụlọ nzute ahụ bilie nʼụtụtụ, ụmụ Izrel na-ebuli njem ha. Ọ bụrụ nʼehihie, maọbụ nʼabalị, mgbe ọbụla igwe ojii ahụ biliri, ụmụ Izrel na-ebuli njem ha.
22 Whether two days, a month, or longer, while the cloud remained over the tabernacle, Israel stayed in camp and did not set out; when it lifted, they set out. Ọ bụrụ na igwe ojii ahụ anọdụ nʼelu ụlọ nzute ahụ abalị abụọ, maọbụ otu ọnwa, maọbụ otu afọ, ụmụ Izrel na-anọgide nʼụlọ ikwu ha. Ma ngwangwa igwe ojii ahụ biliri, ha onwe ha na-ebulikwa njem ha.
23 At our Father's command they camped; at his command they set out. They kept his charge, at our Father's command through Moses. Site nʼiwu Onyenwe anyị na-enye, ha na-ama ụlọ ikwu ha, sitekwa nʼiwu Onyenwe anyị nyere ha, ha na-ebili njem. Ha mere ihe niile Onyenwe anyị kwuru nʼusoro dịka iwu o nyere ha site nʼọnụ Mosis si dị.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]