Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Numbers 10 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Our Father spoke to Moses, saying: Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
2 "Make yourself two silver trumpets, hammered work; use them to call the community and to move the camps. “Kpụọ opi ọlaọcha abụọ, jiri ha na-akpọ mkpọkọta nzukọ ụmụ Izrel na ime ka ha mara mgbe mbuli ije nke ọmụma ụlọ ikwu ruru.
3 When both sound, the whole community must gather to you at the entrance to the tent of meeting. Mgbe a fụrụ opi abụọ ahụ, nzukọ Izrel niile ga-ezukọta nʼihu gị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute.
4 But if only one is blown, the leaders—heads of Israel's clans—are to gather to you. Ma ọ bụrụ naanị otu opi ka a fụrụ, ọ bụ ndị ndu, ndịisi ikwu Izrel niile ga-ezukọta bịakwute gị.
5 When you sound a blast, the camps on the east side are to set out. Otu ụda opi ike ga-egosi na ebo Izrel niile mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ga-ebuli ije.
6 Sound a second blast: camps on the south side set out. Sound a blast for their setting out. Opi ike ahụ daa ụda nke ugboro abụọ, ọ na-egosi na ndị mara ụlọ ikwu ha na ndịda ga-ebuli ije. Ịda ụda nke opi ike bụ ihe e ji amata na oge ibuli ije eruola.
7 But when you call the assembly together, blow a steady note, not an alarm. Mgbe a ga-akpọkọta ndị Izrel niile a ga-egbu opi, kama ụda ya ga-adị iche.
8 Aaron's sons, the priests, are to blow the trumpets—a lasting law for you throughout your generations. “Ọ bụ naanị ụmụ ndị ikom Erọn, ndị nchụaja ga-egbu opi ndị a. Nke a bụ iwu ga-adịgide nye unu site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ niile.
9 When you go to war in your land against the enemy crushing you, sound an alarm on the trumpets—you will be remembered before me and saved from your enemies. Mgbe unu gara ibu agha nʼala unu imegide onye iro na-akpagbu unu, fụọnụ opi ike. Nke a ga-eme ka Onyenwe anyị Chineke unu cheta unu, ma napụta unu site nʼaka ndị iro unu.
10 Also on your day of joy, at your appointed feasts and new moons, blow the trumpets over your burnt offerings and over your peace offerings—a memorial for you before our Father. I am your Father." Unu ga-egbukwa opi ndị a nʼoge aṅụrị, nʼoge mmemme unu a kara aka, na nʼoge mmemme ọnwa ọhụrụ niile. Gbukwaanụ opi mgbe unu na-achụ aja nsure ọkụ unu, na aja udo unu niile. Ka ọ bụrụ ihe a ga-eji na-echeta unu nʼihu Chineke unu. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.”
11 In the second year, second month, on the twentieth day, the cloud lifted from over the tabernacle of the testimony. Nʼụbọchị iri abụọ, nʼime ọnwa nke abụọ, nʼafọ nke abụọ, igwe ojii ahụ biliri site nʼelu ụlọ nzute nke igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ.
12 The Israelites set out from the Sinai wilderness, stage by stage; the cloud settled in the Paran wilderness. Mgbe ahụ, ụmụ Izrel biliri ije site nʼọzara Saịnaị jegharịa site nʼotu ebe ruo nʼebe ọzọ tutu igwe ojii ahụ akwụsị nʼọzara Paran.
13 This was their first setting out, at our Father's command through Moses. Nke a bụ njem mbụ ha mere dịka Onyenwe anyị si nye Mosis iwu banyere ije ha.
14 Judah's camp banner set out first, by their divisions, Nahshon son of Amminadab over his division. Usuu ọmụma ụlọ ikwu nke ebo Juda buru ụzọ bulie ije a, nʼokpuru ọkọlọtọ ha. Nashọn, nwa Aminadab, bụ onyendu ha.
15 Nethanel son of Zuar was over the division of the tribe of Issachar, Netanel nwa Zua bụ onyendu usuu ebo Isaka.
16 and Eliab son of Helon was over the division of the tribe of Zebulun. Eliab nwa Helọn bụ onyendu usuu ebo Zebụlọn
17 The tabernacle was taken down, and the sons of Gershon and sons of Merari set out, carrying it. Mgbe ahụ, e wedara ụlọ nzute ahụ. Ụmụ Geshọn na Merari buru ya, bilikwaa ije ha.
18 Reuben's camp standard set out by divisions, Elizur son of Shedeur over its division. Usuu ọmụma ụlọ ikwu ebo Ruben biliri ije, nʼokpuru ọkọlọtọ ha. Elizọ nwa Shedeua bụ onyendu ha.
19 Shelumiel son of Zurishaddai was over the division of the tribe of Simeon, Shelumiel nwa Zurishadai bụ onyendu usuu ebo Simiọn.
20 and Eliasaph son of Deuel was over the division of the tribe of Gad. Eliasaf nwa Deuel bụ onyendu usuu ebo Gad.
21 The Kohathites set out carrying the holy things, and the tabernacle was set up before they arrived. Mgbe ahụ, ụmụ Kohat ndị bu ihe nsọ ndị ahụ niile, biliri ije ha. Tutu ha erute, e guzobere ụlọ nzute ahụ nʼebe o kwesiri ịdị.
22 Ephraim's camp standard set out by division, Elishama son of Ammihud over its division. Usuu ọmụma ụlọ ikwu ebo Ifrem biliri ije nʼokpuru ọkọlọtọ ha. Elishama nwa Amihud bụ onyendu ha.
23 Gamaliel son of Pedahzur was over the division of the tribe of Manasseh, Gamaliel nwa Pedazo bụ onyendu usuu ebo Manase.
24 and Abidan son of Gideoni was over the division of the tribe of Benjamin. Abidan nwa Gidiọni bụ onyendu usuu ebo Benjamin.
25 Dan's camp standard set out, rear guard of all the camps, by their divisions, with Ahiezer son of Ammishaddai over its division. Na ngwụsị usoro ahụ, usuu ọmụma ụlọ ikwu ebo Dan biliri ije nʼokpuru ọkọlọtọ ha. Onyendu ha bụ Ahieza nwa Amishadai.
26 Pagiel son of Ochran was over the division of the tribe of Asher, Pagịel nwa Okran bụ onyendu usuu ebo Asha.
27 and Ahira son of Enan was over the division of the tribe of Naphtali. Ahira nwa Enan bụ onyendu usuu ebo Naftalị.
28 This was the order of march for the Israelites by their divisions as they set out. Nke a bụ usoro usuu ụmụ Izrel si bilie ije ha.
29 Moses said to Hobab son of Reuel the Midianite, his father-in-law, "We are traveling to the place our Father said, 'I will give it to you.' Come with us; we will treat you well, for our Father has promised good to Israel." Mosis gwara Hobab nwa Reuel, nna nwunye ya onye Midia okwu sị, “Anyị ebiliela ije ịga ebe ahụ Onyenwe anyị gwara anyị sị, ‘Aga m enye unu.’ Bịa ka ị soro anyị. Anyị ga-emezi gị nke ọma nʼihi na Onyenwe anyị ekwela Izrel nkwa ọtụtụ ezi ihe.”
30 But Hobab said to him, "I will not go; I am returning to my own land and my own people." Ma ọ zara sị, “E e, agaghị m eso unu. Ana m alaghachi nʼala nke aka m ịlaghachikwuru ụmụnna m.”
31 Moses said, "Please don't leave us, since you know where we should camp in the wilderness, and you'll be our eyes. Ma Mosis zara sị ya, “Biko ahapụla anyị nʼihi na ị maara ebe anyị nwere ike kwụsị zuo ike nʼọzara. Ị ga-abụrụ anyị anya anyị ji ahụ ụzọ.
32 If you come with us, whatever good our Father does for us, we'll do the same for you." Ọ bụrụ na i soro anyị, anyị ga-ekenye gị ihe ọma ọbụla Onyenwe anyị ga-enye anyị.”
33 They set out from the mountain of our Father on a three-day journey, and the ark of our Father's covenant went ahead of them that three-day journey, seeking a resting place for them. Ya mere ha sitere nʼugwu Onyenwe anyị bilie ije. Jeekwa ije abalị atọ. Igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na-aga ha nʼihu ụbọchị atọ ndị ahụ niile ịchọtara ha ebe ha ga-akwụsị zuo ike.
34 The cloud of our Father was over them by day as they left the camp. Igwe ojii Onyenwe anyị dị nʼelu ha nʼehihie mgbe ha si nʼọmụma ụlọ ikwu ha bilie ije.
35 Whenever the ark set out, Moses said, "Rise, O Father! Let your enemies be scattered; let those who hate you flee before you." Mgbe ọbụla igbe ọgbụgba ndụ ahụ biliri ije, Mosis na-ekwu sị, “Bilie O Onyenwe anyị, ka ndị iro ya bụrụ ndị a chụsasịrị; ka ndị iro gị niile site nʼihu gị gbalaga.”
36 Whenever it rested, he'd say, "Return, O Father, to Israel's countless thousands." Ma mgbe ọbụla igbe ọgbụgba ndụ bịara ebe izuike, Mosis na-ekwukwa sị, “Lọghachi O Onyenwe anyị, bịakwute ọtụtụ mmadụ ndị a, bụ imerime puku ndị Izrel.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]