Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Numbers 8 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Our Father spoke to Moses, saying: Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
2 "Say to Aaron: When you mount the lamps, the seven must shine before the lampstand." “Gwa Erọn okwu sị ya, ‘Mgbe ọbụla ị mụnyere oriọna asaa nke iheọkụ, ị ga-edozi ha ka ìhè ha na-enwupụta naanị nʼihu iheọkụ ahụ.’ ”
3 Aaron did so, lighting its lamps to shine toward the lampstand's front, as our Father commanded Moses. Erọn mere otu a. O doziri oriọna ndị ahụ ka ha chee ihu nʼihe ịdọba oriọna, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
4 The lampstand's work: hammered gold, hammered from base to blossoms—made exactly as our Father showed Moses. Otu a ka esi mee ihe ịdọba oriọna ahụ. Ọ bụ naanị ọlaedo ka e ji kpụọ iheọkụ ahụ, site nʼụkwụ ya ruo nʼokooko niile e ji chọọ ya mma. A kpụrụ iheọkụ ahụ nʼusoro dịka oyiyi Onyenwe anyị gosiri Mosis si dị.
5 Our Father spoke to Moses, saying: Mgbe ahụ Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
6 "Take the Levites from among the people of Israel and cleanse them. “Ugbu a, site nʼetiti ụmụ Izrel, kpọpụta ụmụ Livayị, doo ha iche, mee ha ka ha dịrị ọcha.
7 To cleanse them, do this: sprinkle purification water on them, run a razor over their whole body, wash their clothes, and be clean. Ime ka ha dị ọcha, lee ihe ị ga-eme. Fesa ha mmiri na-asachapụ mmehie. Hụkwa na ha kpụchapụrụ ajị niile dị ha nʼahụ, ma sachaa uwe ha. Si otu a mee ka ha bụrụ ndị dị ọcha.
8 Let them take a young bull from the herd, its grain offering of fine flour mixed with oil, and you are to take a second young bull from the herd for a sin offering. Gwa ha ka ha weta nwa oke ehi na onyinye mkpụrụ ọka, bụ ụtụ ọka a gwara mmanụ. Ha ga-ewetakwa nwa oke ehi ọzọ; ka ọ bụrụ ihe ha ji achụ aja mmehie.
9 Bring the Levites before the tent of meeting, and gather the whole community of Israel's people. Emesịa, kpọbata ụmụ Livayị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ. Meekwa ka ọgbakọ ndị Izrel niile zukọọ nʼebe ahụ.
10 When you present the Levites before me, Israelites are to lay hands on the Levites, Kpọpụta ndị Livayị nʼihu Onyenwe anyị, ma mee ka ndị Izrel niile bikwasị ha aka ha.
11 Aaron is to wave the Levites before me, an offering from the Israelites, to do my service. Mgbe ahụ, Erọn ga-ewere ndị Livayị chee Onyenwe anyị nʼihu dịka onyinye mfufe ndị Izrel niile na-enye ya. Nʼụzọ dị otu a, ụmụ Livayị niile ga-abụ ndị jikere ijere Onyenwe anyị ozi.
12 The Levites will lay their hands on the bulls' heads; offer one as a sin offering, one as a burnt offering to me, to atone for the Levites. “Emesịa, ndị Livayị ga-abịa bikwasị aka ha nʼisi oke ehi abụọ ndị ahụ jiri otu nʼime oke ehi abụọ ndị ahụ chụọ aja mmehie nye Onyenwe anyị, jiri nke ọzọ chụọ aja nsure ọkụ, maka ikpuchi mmehie ndị Livayị.
13 Set the Levites before Aaron and his sons, and present them to me as a wave offering. Mgbe ahụ, mee ka ndị Livayị guzo nʼihu Erọn na ụmụ ndị ikom, werekwa ha nyefee Onyenwe anyị nʼaka dịka a ga-asị na ha bụ onyinye mfufe a na-enye Onyenwe anyị.
14 Separate the Levites from among Israel's people; the Levites are mine. Otu a ka ị ga-esi doo ndị Livayị nsọ ime ka ha dịrị iche site nʼigwe ụmụ Izrel ndị ọzọ. Ọ bụ m nwe ndị Livayị.
15 Then the Levites will enter to serve the tent of meeting, once you've cleansed and waved them as a wave offering. “Mgbe i dosiri ndị Livayị nsọ, cheekwa ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe, ha ga-abịa nʼime ụlọ nzute ahụ ije ozi dịrị ha.
16 For they are fully given to me from among Israel's sons, in place of every womb-opener—firstborn of all Israel's sons—I took them for myself. Ha bụ nke m site nʼetiti ụmụ Izrel niile. Anarala m ha ka ha bụrụ nke m nʼọnọdụ ụmụ niile e bụ ụzọ mụọ, nwa nwoke nke nwanyị ọbụla nʼIzrel.
17 All Israel's firstborn, human or animal, are mine; the day I struck all Egypt's firstborn, I set them apart for myself. Nʼihi na nwa nwoke mbụ ọbụla a mụrụ nʼetiti ndị Izrel bụ nke m, ma mmadụ ma anụmanụ niile. Edoro m ha nsọ nye onwe m, site nʼabalị ụbọchị ahụ m tigbusiri ụmụ niile e bụ ụzọ mụọ nʼIjipt.
18 And I have taken the Levites in place of all the firstborn among the people of Israel. Ewerela m ndị Livayị nʼọnọdụ ụmụ nwoke mbụ niile a mụrụ nʼIzrel.
19 I have given the Levites to Aaron and his sons, a gift from Israel's people, to serve Israel's people at the tent of meeting, atone for Israel's people, so no plague strikes Israel's people nearing the sanctuary." Site nʼetiti ndị Izrel niile, ewerela m ndị Livayị nye Erọn na ụmụ ya ndị ikom dịka onyinye, ka ha rụọ ọrụ niile dị nʼime ụlọ nzute ahụ nʼọnọdụ ụmụ Izrel. Ka ha kpuchiere ha mmehie ha niile ka ihe otiti nke nrịa nrịa ghara ịbịakwasị ụmụ Izrel, mgbe ọbụla ha bịara nso ebe nsọ ahụ.”
20 Moses, Aaron, and Israel's whole assembly did to the Levites all our Father commanded Moses about the Levites; Israel's people did to them. Ya mere, Mosis na Erọn na nzukọ niile nke ụmụ Izrel chere ụmụ Livayị nʼihu Onyenwe anyị, nʼusoro dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
21 The Levites purified themselves from sin, washed their clothes; Aaron offered them as a wave offering before our Father, atoned for them to cleanse them. Ndị Livayị niile doro onwe ha ọcha, sachakwaa uwe ha niile. Erọn chere ha nʼihu Onyenwe anyị dịka onyinye aja mfufe, chụọrọ ha aja ikpuchi mmehie, ime ka ha dị ọcha.
22 After that, the Levites came to serve in the tent of meeting before Aaron and his sons; they did to the Levites as our Father commanded Moses. Nʼikpeazụ, ndị Livayị bịara ije ozi ha nʼụlọ nzute nʼokpuru Erọn na ụmụ ya ndị ikom. Ha nyekwara ndị Livayị ọrụ dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
23 Our Father spoke to Moses, saying: Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
24 "This applies to the Levites: from age twenty-five, they are to come to serve in the work at the tent of meeting. “Iwu m ndị a metụtara ndị Livayị niile. Nwoke onye Livayị ọbụla ga-ebido ịrụ ọrụ nʼụlọ nzute m mgbe ọ gbara iri afọ abụọ na ise.
25 From age fifty they must retire from service work and serve no longer. Ọ ga-akwụsịkwa ịrụ ọrụ nʼime ya mgbe ọ gbara iri afọ ise, mgbe oge ezumike ọrụ ya ga-amalite.
26 They may assist their brothers at the tent of meeting by standing guard, but do no work. This is how you are to assign the Levites' duties." Ha nwere ike inyere ụmụnne ha aka nʼịrụ ọrụ ha nʼime ụlọ nzute, ma ha onwe ha agaghị arụ ọrụ ahụ. Otu a ka ị ga-esi dozie ọrụ ije ozi nke ndị Livayị.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]