Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Matthew 9 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Jesus stepped into a boat, crossed over, and came to his own town. Jisọs banyekwara nʼụgbọ mmiri nke kwọọrọ ya bịaruo nʼobodo nke ya.
2 Some brought him a paralyzed man lying on a mat. Seeing their faith, Jesus told the paralyzed man, "Take heart, son; your sins are forgiven." Ndị ikom ụfọdụ butere ya otu nwoke akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, bụ onye dina nʼute. Mgbe Jisọs hụrụ okwukwe ndị ahụ, ọ gwara onye ọrịa ahụ okwu sị ya, “Nwee obi ike nwa m nwoke nʼihi na a gbagharala gị mmehie gị niile.”
3 At this, some of the teachers of the law said to themselves, "This man is blaspheming." Nʼoge a, ụfọdụ ndị ozizi iwu nke ndị Juu nọ nʼebe ahụ sịrịtara onwe ha, “Nwoke a na-ekwulu Chineke.”
4 Knowing their thoughts, Jesus said, "Why do you harbor evil in your hearts? Ma ebe Jisọs matara ihe ha na-eche nʼobi ha, ọ sịrị, “Gịnị mere unu ji na-eche ajọ echiche nʼobi unu?
5 Which is easier: to say, 'Your sins are forgiven,' or to say, 'Get up and walk'? Olee nke ka mfe ikwu? Ọ bụ ị sị, ‘A gbagharala gị mmehie gị niile,’ ka ọ bụ ị sị, ‘Bilie jee ije’?
6 But so you know the Son of Man has authority on earth to forgive sins"—then he told the paralyzed man, "Get up, take your mat, and go home." Ma ka unu mata na Nwa nke Mmadụ nwere ikike nʼụwa ịgbaghara mmehie.” Ọ sịrị onye ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, “Bilie, chịrị ute gị laa!”
7 And the man got up and went home. Nwoke ahụ biliri, chịrị ute ya laa nʼụlọ ya.
8 Seeing this, the crowds were awed and praised our Father, who gave people such authority. Mgbe igwe mmadụ a hụrụ ihe ahụ mere, akpata oyi jụrụ ha nʼahụ nʼihi egwu. Ha tokwara Chineke onye na-enye ụmụ mmadụ ikike dị otu a.
9 Moving on from there, Jesus saw a man named Matthew sitting at the tax booth. "Follow me," he said. Matthew got up and followed him. Mgbe Jisọs si nʼebe ahụ na-aga, ọ hụrụ otu nwoke a na-akpọ Matiu ka ọ nọdụrụ ala nʼụlọ ịnakọta ụtụ. Ọ sịrị ya, “Soro m.” Na-atụfughị oge, ọ hapụrụ ihe niile soro ya.
10 As Jesus ate in Matthew's house, many tax collectors and sinners joined him and his disciples at the table. Dị ka ọ nọdụrụ ala iri nri uhuruchi nʼụlọ Matiu, ọtụtụ ndị ọna ụtụ na ndị mmehie sooro ya na ndị na-eso ụzọ ya nọdụ na-eri nri.
11 Seeing this, the Pharisees asked his disciples, "Why does your teacher eat with tax collectors and sinners?" Mgbe ndị Farisii hụrụ nke a, ha jụrụ ndị na-eso ụzọ ya ajụjụ sị ha, “Gịnị mere onye ozizi unu ji eso ndị ọna ụtụ na ndị mmehie na-eri nri?”
12 On hearing this, Jesus said, "It is not the healthy who need a doctor, but the sick. Mgbe ọ nụrụ nke a, Jisọs sịrị, “Mkpa dibịa adịghị akpa ndị ahụ dị ike, kama ọ bụ ndị ahụ na-esighị ike ka mkpa dibịa na-akpa.
13 But go and learn what this means: 'I want mercy, not sacrifice.' For I didn't come to call the righteous, but sinners." Ma gaanụ mụta ihe okwu a pụtara, ‘Ana m achọ ebere, ọ bụghị aja.’ Nʼihi na abịaghị m ịkpọ ndị ezi omume, kama abịara m ịkpọ ndị mmehie.”
14 Then John's disciples came, asking him, "Why do we and the Pharisees fast often, but your disciples don't?" Emesịa, ndị na-eso ụzọ Jọn bịara jụọ ya ajụjụ sị, “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ gị adịghị ebu ọnụ dị ka anyị onwe anyị na ndị Farisii na-eme?”
15 Jesus replied, "Can the groom's friends mourn while he's with them? But days are coming when the groom is taken from them—then they'll fast. Jisọs jụrụ ha sị, “O kwesiri ka ndị enyi onye na-alụ nwunye ọhụrụ nọrọ na mwute na-erighị nri, mgbe ha na di nwanyị ọhụrụ nọ? Oge na-abịa mgbe a ga-ewepụ di nwanyị ọhụrụ nʼetiti ha, mgbe ahụ ka ha ga-ebu ọnụ.
16 No one sews an unshrunk patch on an old garment; the patch pulls away from it, leaving a worse tear. “Ọ dịghị onye na-eji akwa ọhụrụ kwachie ebe akwa ochie siri dọkaa, nʼihi na akwa ahụ ga-esi nʼebe a kwachiri ya dọwaa; mee ka ọ dị njọ karịa ka ọ dị na mbụ.
17 People don't pour new wine into old wineskins; otherwise the skins burst, the wine spills, and they're ruined. Instead, new wine goes into new wineskins, so both are kept." Ọ dịkwaghị onye ga-etinye mmanya ọhụrụ nʼime karama akpụkpọ ochie, nʼihi na karama ochie ahụ ga-agbawa mee ka mmanya ọhụrụ ahụ wufuo. Kama ọ dị mma itinye mmanya ọhụrụ nʼime karama akpụkpọ ọhụrụ, nke ga-echekwa ha abụọ nke ọma.”
18 While he spoke, a synagogue leader came, knelt before him, and said, "My daughter just died. But come, lay your hand on her, and she will live." Mgbe ọ nọ na-ekwu okwu, otu onyeisi ụlọ ekpere bịara kpọọ isiala nye ya, sị, “Ọ dịbeghị anya nwa m nwanyị nwụrụ. Otu ọ dị, bịa ka ị bikwasị ya aka gị. Ọ ga-ebili dịkwa ndụ ọzọ.”
19 Jesus got up and went with him, and so did his disciples. Nʼihi nke a, Jisọs soro ya gawa. Ndị na-eso ụzọ ya sokwara ha.
20 Just then a woman bleeding twelve years came up behind and touched his cloak's edge. Ma o nwere otu nwanyị onye ahụ na-esighị ike. Nwanyị a anọọla nʼọrịa a afọ iri na abụọ. Ọ bụkwa ọrịa oruru ọbara nke na-adịghị akwụsị akwụsị ka ọ na-arịa. Nwanyị a sitere nʼazụ bịaruo ya nso, metụ ọnụ uwe ya aka.
21 She kept saying to herself, "If I only touch his cloak, I will be healed." Nʼihi na o kwuolarị nʼime obi ya sị, “Ọ bụrụ nnọọ na m ga-enwe ike metụ ọnụ uwe ya aka, a ga-agwọ m.”
22 Jesus turned, saw her. "Courage, daughter," he said, "your faith has healed you." The woman was healed at that moment. Jisọs chigharịrị lee ya anya sị ya, “Ada m, nwee obi ike, nʼihi na e sitela nʼokwukwe gị mee ka ahụ dị gị mma.” Ahụ dịkwara nwanyị ahụ mma site nʼoge ahụ.
23 When Jesus entered the synagogue leader's house and saw the flute players and the noisy crowd, Mgbe Jisọs batara nʼụlọ onyendu ụlọ ekpere ndị Juu ahụ, hụ igwe mmadụ ka ha na-atụ ụzụ na ndị na-egbu ọja.
24 he said, "Go away. The girl is not dead but asleep." But they laughed at him. Ọ sịrị ha, “Sinụ ebe a pụọ, nwata nwanyị a anwụghị anwụ, kama ọ nọ nʼụra.” Ma ha chịrị ya ọchị.
25 When the crowd was sent out, he went in, took her hand, and the girl got up. Ma mgbe achụpụsịrị igwe mmadụ ahụ, ọ banyere nʼime ụlọ, jide nwata nwanyị ahụ nʼaka, o bilie ọtọ.
26 News of this spread through all that region. Akụkọ ọrụ ebube a gbasara nʼebe niile nʼala ahụ.
27 As Jesus left there, two blind men followed, shouting, "Have mercy on us, Son of David!" Mgbe Jisọs si nʼebe ahụ na-apụ, ụmụ nwoke abụọ ndị kpuru ìsì sooro ya. Ha tikuru ya mkpu na-asị, “Nwa Devid, meere anyị ebere!”
28 Entering the house, the blind men came to him. He asked, "Do you believe I am able to do this?" "Yes, Lord," they said. Ha sooro ya bata nʼụlọ ebe ọ nọ. Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Unu kwere na m nwere ike ime ka unu hụ ụzọ?” Ha zara sị ya, “E, Onyenwe anyị, anyị kweere.”
29 Then he touched their eyes and said, "Let it be done to you according to your faith". O metụrụ ha aka nʼanya sị ha, “Ya dịrị unu dị ka okwukwe unu si dị.”
30 Their eyes opened. Jesus warned them sternly, "See that no one knows about this." Ngwangwa ndị ìsì ahụ bidoro ịhụ ụzọ. Jisọs maara ha ọkwa sị ha “Unu agwakwala onye ọbụla.”
31 But they went out and spread the news about him all over that region. Ma ha pụrụ gbasaa akụkọ a ebe niile nʼala ahụ.
32 As they went out, a mute, demon-possessed man was brought to Jesus. Mgbe ndị a sitere nʼebe ahụ pụọ, ndị ọzọ buteere ya nwoke dara ogbi, onye mmụọ ọjọọ bikwa nʼime ya.
33 Once the demon was driven out, the mute man spoke. The crowds were amazed and said, "Nothing like this has ever appeared in Israel." Mgbe ọ chụpụrụ mmụọ ọjọọ ahụ, onye ogbi ahụ bidoro ikwu okwu. Ibubo nwụrụ igwe mmadụ nọ nʼebe ahụ. Ha sịrị, “Anyị ahụtụbeghị ihe dị otu a nʼala Izrel.”
34 But the Pharisees said, "He drives out demons by the prince of demons." Ma ndị Farisii sịrị, “Ọ bụ ekwensu, eze ndị mmụọ ọjọọ, na-enye ya ike ịchụpụ mmụọ ọjọọ.”
35 Jesus traveled every town and village, teaching in their synagogues, announcing the good news of our Father's kingdom, and healing every disease and sickness. Jisọs jegharịrị nʼobodo niile na ogbe niile dị nʼebe ahụ, ma ndị ukwu na ndị nta, na-ezi ihe nʼụlọ ekpere ndị Juu, na-ekwusakwa oziọma nke alaeze ahụ. Ọ na-agwọkwa ọrịa na nrịa nrịa niile dị iche iche.
36 Seeing the crowds, he felt compassion for them, because they were troubled and helpless, like sheep without a shepherd. Mgbe ọ hụrụ igwe mmadụ niile na-abịakwute ya, ọmịiko ha mere ya, nʼihi na ha bụ ndị a na-esogbu. Ndị na-enweghị onye inyeaka. Ndị dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.
37 Then he said to his disciples, "The harvest is plentiful but the workers are few. Mgbe ahụ, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Owuwe ihe ubi hiri nne nʼezie. Ma ndị ọrụ dị ole na ole.
38 So ask the Father of the harvest to send out workers into his harvest field." Ya mere, rịọọnụ Onyenwe owuwe ihe ubi ka o zite ndị ọrụ nʼowuwe ihe ubi ya.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]