Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Matthew 8 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 When he came down from the mountain, great crowds followed him. Ọtụtụ mmadụ sooro Jisọs mgbe o si nʼugwu ahụ rịdata.
2 A man with leprosy approached, knelt before him, saying, "Lord, if you're willing, you can make me clean." Mgbe ha na-aga nʼụzọ, otu onye ekpenta bịakwutere ya kpọọ isiala nye ya, rịọ ya sị, “Onyenwe m, ọ bụrụ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.”
3 Jesus reached out his hand and touched him: "I am willing; be clean." His leprosy vanished at once. O setịpụrụ aka ya, metụ ya sị, “Achọrọ m ka ị dị ọcha, dịrịkwa ọcha!” Ngwangwa, ekpenta ahụ lara.
4 Jesus told him, "Tell no one, but go show yourself to the priest and offer the gift Moses commanded, as testimony to them." Jisọs nyere nwoke ahụ iwu sị ya, “Hụ na ịgwaghị onye ọbụla, kama gaa gosi onye nchụaja onwe gị, chụọkwa aja onyinye dịka Mosis, nyere nʼiwu, ka ọ bụrụ ihe ama nye ya.”
5 When he entered Capernaum, a centurion came to him, appealing to him, Mgbe ọ banyere na Kapanọm, otu onye ọchịagha bịakwutere ya rịọọ ka o nyere ya aka.
6 and saying, "Lord, my servant is lying at home paralyzed, suffering terribly." Ọ sịrị, “Onyenwe m, onye na-ejere m ozi dina nʼụlọ nʼoke ihe mgbu, akụkụ ahụ ya kpọnwụkwara akpọnwụ.”
7 He said to him, "I will come and heal him." Jisọs sịrị ya, “Ọ bụ m bịa gwọọ ya?”
8 The centurion replied, "Lord, I'm not worthy for you to come under my roof; just say the word, and my servant will be healed. Ma onye ọchịagha ahụ zara ya sị, “Onyenwe m, ekwesighị m ka ị bata nʼokpuru ụlọ m. Naanị nọdụ nʼebe a, kwuo okwu, ahụ ga-adịkwa onye na-ejere m ozi ike.
9 For I too am a man under authority, with soldiers under me. I tell one, 'Go,' and he goes; another, 'Come,' and he comes; my servant, 'Do this,' and he does it." Nʼihi na mụ onwe m bụkwa onye nọ nʼokpuru ikike ọchịchị, nwee ndị agha nọ nʼokpuru m. Ana m asị onye nke a, ‘gaa.’ Ọ gaa, sịkwa onye nke ọzọ, ‘bịa.’ Ọ bịa. Ana m asị ohu m, ‘mee nke a.’ Ọ na-emekwa ya.”
10 Hearing this, Jesus was amazed and told his followers, "Truly, I tell you, I have found no one in Israel with such faith. Mgbe Jisọs nụrụ okwu a, o juru ya anya nke ukwuu. Ọ gwara igwe mmadụ ahụ so ya okwu sị, “Nʼezie, ahụbeghị m okwukwe dị otu a ebe ọbụla; ọ bụladị nʼIzrel niile.
11 I tell you, many will come from east and west and sit at the table with Abraham, Isaac, and Jacob in our Father's kingdom, Nʼezie kwa, ọtụtụ ndị mmadụ ga-esite nʼọwụwa anyanwụ nakwa ọdịda anyanwụ bịa soro Ebraham na Aịzik na Jekọb nọkọọ nʼoriri nʼalaeze eluigwe.
12 but the kingdom's sons will be thrown into the outer darkness, where there will be weeping and grinding of teeth." Ma ụmụ alaeze ahụ, ka a ga-atụpụ nʼezi, nʼime ọchịchịrị, ebe ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adị.”
13 Jesus told the centurion, "Go, let it be done for you as you believed." His servant was healed that hour. Jisọs gwara ọchịagha ahụ okwu sị ya, “Laa! E meerela gị dị ka okwukwe gị sịrị dị.” Ahụ dịrị onye ahụ na-ejere ya ozi mma nʼotu awa ahụ.
14 When Jesus entered Peter's house, he saw Peter's mother-in-law lying in bed with a fever. Mgbe Jisọs ruru nʼụlọ Pita, ọ chọpụtara na nne nwunye ya nwere ahụ ọkụ.
15 He touched her hand; the fever left her, and she rose and served him. Ọ metụrụ ya aka, ahụ ọkụ ahụ hapụrụ ya, o biliri malite ijere ya ozi.
16 That evening they brought him many oppressed by demons; he expelled the spirits with a word and healed everyone sick. Nʼoge uhuruchi, ha kpọtaara ya ọtụtụ ndị mmụọ ọjọọ na-esogbu. O ji okwu ọnụ chụpụ mmụọ ọjọọ ahụ niile, gwọọkwa ndị niile ahụ na-adịghị ike.
17 This fulfilled the prophet Isaiah's words: "He took our weaknesses and carried our diseases." Nke a bụ imezu amụma ahụ Aịzaya buru sị, “O bupụrụ nrịa nrịa anyị niile, burukwa ọrịa anyị niile.”
18 When Jesus saw a crowd around him, he ordered them to cross to the other side. Mgbe Jisọs hụrụ igwe mmadụ dị ukwuu ndị gbara ya gburugburu, ọ nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha gafee nʼofe nke ọzọ.
19 And a scribe came up and said to him, "Teacher, I will follow you wherever you go." Nʼoge ahụ, otu onye nʼetiti ndị na-ezi iwu bịakwutere ya sị ya, “Onye nkuzi, aga m eso gị gaa ebe ọbụla ị na-aga.”
20 Jesus told him, "Foxes have dens and birds of the sky have nests, but the Son of Man has nowhere to lay his head." Jisọs zara, sị, “Nkịta ọhịa nwere ọnụ ebe ha na-edina. Ụmụ nnụnụ nke igwe nwekwara akwụ; ma Nwa nke Mmadụ enweghị ebe obibi.”
21 Another of the disciples said to him, "Lord, let me first go and bury my father." Otu onye ọzọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Onyenwe m, aga m eso gị, kama kwere ka m buru ụzọ gaa lie nna m.”
22 But Jesus said to him, "Follow me, and leave the dead to bury their own dead." Ma Jisọs zara sị ya, “Soro m ugbu a. Hapụ ndị nwụrụ anwụ ka ha lie ndị nwụrụ anwụ ibe ha.”
23 When he got into the boat, his disciples followed him. Mgbe ọ banyere nʼụgbọ, ndị na-eso ụzọ ya sooro ya.
24 Suddenly a great storm arose on the sea, so waves covered the boat—but he was asleep. Nʼotu ntabi anya, oke ifufe bidoro ife nʼọdọ mmiri ahụ, nke mere na ebili mmiri na-ekpuchi ụgbọ ahụ. Ma ọ nọ na-arahụ ụra mgbe ihe ndị a na-eme.
25 So they woke him: "Lord, save us! We're dying!" Ndị na-eso ụzọ ya jekwuuru ya, kpọtee ya, sị ya, “Onyenwe anyị, zọpụta anyị! Lee, na anyị nʼala nʼiyi.”
26 He said to them, "Why are you afraid, you of little faith?" Then he stood and rebuked the winds and sea, and a great calm followed. Ma ọ zaghachiri, “Unu ndị okwukwe nta, gịnị mere ụjọ ji na-atụ unu?” Mgbe ahụ o biliri baara ifufe ahụ na ebili mmiri ahụ mba. Ha niile dajụrụ, deere jii.
27 The men were amazed: "What kind of man is this—even winds and sea obey him?" O juru ndị na-eso ụzọ ya anya, mee ka ha jụọ ajụjụ sị, “Ọ bụ ụdị mmadụ dị aṅaa ka nwoke a bụ? Ọ bụladị ifufe na ebili mmiri na-eme ihe o kwuru.”
28 Crossing to the other side, to the region of the Gadarenes, two demon-possessed men came out of the tombs to meet him, so violent no one could pass that way. Mgbe o rutere nʼofe nke ọzọ nke obodo Gadarin, mmadụ abụọ ndị mmụọ ọjọọ si nʼebe a na-eli ozu zutere ya. Ha na-akpa ike nke ukwuu, na ọ dịkwaghị onye na-esite nʼụzọ ahụ agafe nʼihi ha.
29 They shouted, "What do you want with us, Son of God? Have you come here to torment us before the time?" Ngwangwa, ha tiri mkpu bido na-ajụ ajụjụ sị, “Gịnị ka anyị na gị nwekọrọ, gị Ọkpara Chineke? Ị gaghị echekwa eche ka oge ruo tupu ibido ịta anyị ahụhụ?”
30 Now a herd of many pigs was feeding at some distance from them. Igwe ezi nọ nʼakụkụ ebe ahụ na-akpa nri.
31 And the demons begged him, "If you cast us out, send us into the herd of pigs." Mmụọ ọjọọ ndị a rịọrọ ya arịrịọ sị, “Ọ bụrụ na ị chụpụ anyị, biko, hapụ anyị ka anyị banye nʼime ezi ndị a.”
32 He told them, "Go." They came out and entered the pigs, and the whole herd rushed down the cliff into the sea and died in the waters. Ọ nyere ha iwu sị ha, “Ngwa, gaanụ!” Ha sitere nʼime mmadụ abụọ ahụ pụta banye nʼime igwe ezi ahụ. Otu mgbe ahụ kwa, ezi ndị ahụ niile gbaara ọsọ site na mkputamkpu ala ọnụ mmiri ahụ dabanyechaa nʼime mmiri ahụ. Ha nwụkwara nʼime ya.
33 The herdsmen fled into the city and reported everything, including what had happened to the demon-possessed men. Ndị na-elekọta igwe ezi ndị ahụ gbapụrụ gbaga nʼime obodo kọọrọ ha ihe niile mere; tinyere ihe mere ndị ahụ mmụọ ọjọọ na-esogbu.
34 The whole city came out to meet Jesus; seeing him, they begged him to leave their region. Ya mere ndị niile nọ nʼobodo ahụ pụtara ịhụ Jisọs. Mgbe ha hụrụ ya ha rịọrọ ya sị ya pụọra ha nʼakụkụ obodo ha.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]