Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Matthew 7 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 "Do not judge, so that you may not be judged. “Unu ekpela ndị ọzọ ikpe, ka a ghara ikpekwa unu ikpe.
2 For you'll be judged by the judgment you use, and measured by the measure you give. Nʼihi na a ga-ekpe unu ikpe dịka unu si kpee ndị ọzọ. Ọ bụkwa ihe unu ji tụọrọ ndị ọzọ ka a ga-eji tụọrọ unu.
3 Why look at the speck in your brother's eye but miss the log in your own? “Gịnị mere i ji elee ntakịrị ahịhịa dị nwanna gị nʼanya ma ị dịghị ahụta obodobo osisi dị gị onwe gị nʼanya?
4 Or how can you tell your brother, 'Let me remove the speck from your eye,' when a log is in yours? Olee otu ị ga-esi gwa ya si, ‘Nwanna m, kwere ka m tụpụ gị ntakịrị ahịhịa danyere gị nʼanya,’ mgbe obodobo osisi dị gị nʼanya, nke na-adịghị ekwe gị hụzie ụzọ.
5 Hypocrite, first remove the log from your own eye; then you'll see clearly to remove the speck from your brother's eye. Onye ihu abụọ! Buru ụzọ wepụ obodobo osisi dị gị nʼanya ka i nwee ike ịhụzi ụzọ tụpụ ntakịrị ahịhịa nke dị nwanna gị nʼanya.
6 "Don't give dogs what is holy, or throw your pearls before pigs—they'll trample them underfoot, then turn and tear you apart. “Enyela nkịta ihe dị nsọ. Enyekwala ezi ihe dị oke ọnụahịa. Ha ga-azọtọ ha ma tụgharịakwa dọrie gị.
7 "Ask, and you'll receive it; seek, and you'll find; knock, and it'll open for you. “Na-arịọnụ, unu ga-arịọta, na-achọnụ, unu ga-achọta, kụọkwanụ aka nʼụzọ, a ga-emeghekwara unu ụzọ.
8 For everyone who asks receives, whoever seeks finds, and whoever knocks, it will be opened. Nʼihi na onye na-arịọ, na-arịọta. Onye na-achọ, na-achọta. Onye na-akụ aka nʼụzọ ka a ga-emeghekwara ụzọ.
9 Or what person among you, if his son asks him for bread, will give him a stone? “Ọ dị onye nʼime unu, ma ọ bụrụ na nwa ya arịọọ ya achịcha, ga-enye ya okwute?
10 Or if he asks for a fish, will give him a snake? Maọbụ, nwata ahụ arịọọ azụ, o nye ya agwọ?
11 So if you, being evil, know how to give your children good gifts, how much more will your Father in heaven give good things to those who ask him? Ya mere, ebe unu ndị ọjọọ maara otu e si enye ụmụ unu ezi onyinye, Nna unu bi nʼeluigwe ọ gaghị enye unu karịa, ma ọ bụrụ na unu arịọọ ya!
12 "So in everything, treat people the way you want them to treat you; for this is the Law and the Prophets. Ya mere, nʼime ihe niile, na-emeso ndị mmadụ dị ka i si chọọ ka ha mesoo gị. Nke a bụ nchịkọta ihe iwu na ndị amụma ziri.
13 "Enter through the narrow gate, for the gate is wide, the road broad, leading to destruction, and many enter through it. “Sitenụ nʼọnụ ụzọ dị warawara banye. Nʼihi na ọnụ ụzọ ahụ dị obosara. Mbara ka ụzọ ahụ dịkwa na-eduba nʼịla nʼiyi. Ọtụtụ na-esoro ya.
14 But the gate is narrow, the road narrow, that leads to life; few find it. Ole na ole na-achọta ụzọ ahụ na-eduba na ndụ, nʼihi na ọ dị warawara, dịkwa nkpagide.
15 "Beware false prophets: they come to you in sheep's clothing but are ravenous wolves inside. “Kpachapụnụ anya! Nʼihi na ndị amụma ụgha dị. Ha na-abịakwute unu nʼụdịdị atụrụ, ma ha bụ agụ.
16 By their fruit you will recognize them. Are grapes gathered from thornbushes, or figs from thistles? A ga-esite na mkpụrụ ha mata ndị ha bụ. Ndị mmadụ ọ na-esite nʼosisi ogwu dị nʼọhịa ghọta mkpụrụ osisi grepu, ka ha na-esite nʼosisi uke gbara nʼọhịa ghọta mkpụrụ fiig?
17 In the same way, every good tree bears good fruit, but the bad tree bears bad fruit. Nʼụzọ dị otu a, osisi ọbụla dị mma na-amịpụta mkpụrụ ọma, ma osisi dị njọ na-amịpụta mkpụrụ dị njọ.
18 A good tree cannot bear bad fruit, nor can a bad tree bear good fruit. Osisi na-amị mkpụrụ ọma adịghị amị mkpụrụ ọjọọ. Nke na-amị mkpụrụ ọjọọ adịghịkwa amị mkpụrụ ọma.
19 Every tree that does not bear good fruit is cut down and thrown into the fire. Ma osisi ọbụla na-amịghị mkpụrụ ọma ka a ga-egbutu tụnye ya nʼọkụ.
20 So then, by their fruit you will recognize them. Ụzọ e si amata osisi ọma bụ site na mkpụrụ ya.
21 "Not everyone who says to me, 'Lord, Lord,' will enter the kingdom of our Father, but the one who does the will of my Father in heaven. “Ọ bụghị ndị niile na-asị m ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,’ ga-abanye nʼalaeze eluigwe, kama ọ bụ naanị ndị ahụ na-eme ihe Nna m nọ nʼeluigwe na-achọ ka ha mee.
22 Many will say to me on that day, 'Lord, Lord, didn't we prophesy in your name, drive out demons in your name, do many miracles in your name?' Nʼụbọchị ahụ, ọtụtụ ndị mmadụ ga-asị m, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, ọ bụ na anyị ejighị aha gị buo amụma, jiri aha gị chụpụ mmụọ ọjọọ, ma jirikwa aha gị ruo ọtụtụ ọrụ ebube?’
23 Then I will tell them plainly: 'I never knew you; get away from me, you lawbreakers.' Mgbe ahụ aga m agwa ha hoohaa sị ha, ‘Amaghị m unu, sitenụ nʼihu m pụọ, unu ndị ajọ omume!’
24 "So anyone who hears these words of mine and does them will be like a wise man whose house was built on the rock. “Onye ọbụla ṅara ntị nʼokwu ndị a m kwuru, ma meekwa ha, dị ka nwoke ahụ maara ihe, onye wuru ụlọ ya nʼelu oke nkume.
25 Rain fell, floods came, winds blew and beat against that house, but it didn't fall, because it was founded on rock. Mmiri zosikwara ike nʼelu ụlọ ahụ, idee mmiri sọkwara, tie nʼụlọ ahụ. Ifufe siri ike fekwara, ma ụlọ ahụ adaghị. Nʼihi na e wuru ntọala ya nʼelu oke nkume.
26 And everyone who hears these words of mine and doesn't do them is like a foolish man who built his house on sand. Ma ndị niile nụrụ okwu ndị a, ma lefuru ha anya, bụ ndị nzuzu. Ha dị ka nwoke wuru ụlọ ya nʼelu aja.
27 The rain fell, floods came, winds blew and hit that house, and it fell—and its fall was great." Ngwangwa mmiri zoro, idee mmiri sọkwara, ifufe fesikwara ike tie nʼụlọ ahụ, ụlọ ahụ dara daruo ala. Ọdịda ya dị ukwuu.”
28 When Jesus had finished saying these words, the crowds were astonished at his teaching, Mgbe Jisọs kwuchara okwu ndị a, ozizi ya juru igwe mmadụ ahụ niile anya.
29 because he was teaching them as one who had authority, and not as their scribes. Nʼihi na o ziri ihe dịka onye nwere ikike. Ọ bụghị dị ka ndị ozizi iwu ha.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]