Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Matthew 6 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 "Take care not to practice your righteousness before others to be seen by them, or you have no reward from your Father in heaven. “Kpacharanụ anya ka unu ghara ime ezi omume unu naanị ka ndị mmadụ hụ unu. Nʼihi na unu mee nke a, unu agaghị enweta ụgwọ ọrụ ọbụla site nʼaka Nna unu bi nʼeluigwe.
2 So when you give to the needy, don't announce it with a trumpet, like the hypocrites do in synagogues and streets, to be praised by people. I assure you: they've already received their full reward. “Unu afụla opi mgbe unu na-enye ndị nọ na mkpa onyinye, nʼihi na otu a ka ndị ihu abụọ na-eme nʼụlọ nzukọ na nʼokporoụzọ, ka ndị mmadụ too ha. Nʼezie, ana m agwa unu, ha anatala ụgwọ ọrụ ha nʼizuoke.
3 But when you give to the needy, don't let your left hand know what your right hand does, Mgbe unu chọrọ ịrụ ọrụ ebere, meenụ ya na nzuzo. Ekwela ka aka ekpe gị mata ihe aka nri gị na-achọ ime.
4 so that your gift stays secret. Your Father, who sees in secret, will repay you. Ka onyinye gị bụrụ na nzuzo. Mgbe ahụ, Nna gị, onye na-ahụ ihe dị na nzuzo ga-akwụghachi gị.
5 "When you pray, don't be like hypocrites who love praying standing in synagogues and on street corners to be seen by others. Truly, I tell you: they've already received their full reward. “Mgbe ọbụla unu chọrọ ikpe ekpere, unu emela dị ka ndị ihu abụọ, nʼihi na ha hụrụ iguzo nʼime ụlọ ekpere, nakwa nʼakụkụ ụzọ nʼanya na-ekpe ekpere, ebe ndị mmadụ ga-ahụ ha. Nʼezie, agwa m unu, ha anatala ụgwọ ọrụ ha nʼebe o zuruoke.
6 But when you pray, go into your room, shut the door, and pray to your Father in secret. Your Father who sees in secret will reward you. Kama, mgbe unu chọrọ ikpe ekpere, baanụ nʼime ime ụlọ unu. Mechiekwanụ ụzọ unu, kpọkuonụ Nna unu nʼekpere na nzuzo. Mgbe ahụ Nna unu, onye na-ahụ ihe e mere na nzuzo, ga-enye unu ụgwọ ọrụ unu.
7 When you pray, don't babble like those who don't know the Father, because they think many words will get them heard. Mgbe unu na-ekpe ekpere, unu ekwula okwu nkwukwasị efu dị ka ndị na-amaghị Chineke na-eme. Ha chere na a ga-anụ ekpere ha nʼihi ọtụtụ okwu ha na-ekwu.
8 Do not be like them, for your Father knows what you need before you ask him. Unu adịla ka ha. Chetanụ na tupu unu arịọ arịrịọ ọbụla, Nna unu bi nʼeluigwe maara ihe na-akpa unu.
9 This, then, is how you should pray: 'Our Father in heaven, may your name be honored as holy, “Sinụ otu a na-ekpe ekpere: “ ‘Nna anyị nke bi nʼeluigwe, ka e doo aha gị nsọ.
10 your kingdom come, your will be done, on earth as it is in heaven. Ka alaeze gị bịa, ka e mee uche gị nʼụwa, dịka e si eme ya nʼeluigwe.
11 Give us today our daily bread. Nye anyị nri nke ụbọchị taa.
12 And forgive us our debts, as we also have forgiven our debtors. Gbaghara anyị mmehie anyị, dịka anyị si agbaghara ndị na-emehie megide anyị.
13 And lead us not into temptation, but deliver us from the evil one.' Ekwela ka anyị daba nʼime ọnwụnwa, kama, zọpụta anyị nʼaka ajọ onye ahụ.’
14 "For if you forgive others their sins, your heavenly Father will also forgive you. Ọ bụrụ na unu agbaghara ndị mmadụ mgbe ha mehiere megide unu, Nna unu nke bi nʼeluigwe ga-agbagharakwa unu mmehie unu.
15 But if you do not forgive others their sins, neither will your Father forgive your sins. Ọ bụrụkwanụ na unu agbagharaghị ndị ọzọ mmehie niile ha, Nna unu nke bi nʼeluigwe agaghị agbaghara unu mmehie unu.
16 "When you fast, don't look gloomy like the hypocrites—they disfigure their faces to show others they're fasting. Truly, I tell you, they have their full reward. “Ọzọ, mgbe ọbụla unu na-ebu ọnụ, unu agbarụla ihu unu dịka ndị ihu abụọ na-eme. Nʼihi na ha na-agbarụ ihu ha ka ndị ọzọ hụ na ha na-ebu ọnụ. Nʼezie agwa m unu, ha anatala ụgwọ ọrụ ha.
17 But when you fast, put oil on your head and wash your face, Mgbe ị na-ebu ọnụ, tee isi gị mmanụ, ma saakwa ihu gị mmiri,
18 so you don't appear to others as fasting, but only to your Father, who is hidden. Then your Father, who sees what's hidden, will reward you. ka ndị ọzọ ghara ịhụta na ị na-ebu ọnụ kama ka ọ bụrụ naanị nye Nna gị, onye anya na-adịghị ahụ. Nna gị, onye na-ahụ ihe niile na-eme na nzuzo, ga-akwụ gị ụgwọ.
19 "Do not store up treasures for yourselves on earth, where moth and rust destroy, and thieves break in and steal. “Unu akpadola akụ nʼụwa nye onwe unu, ebe ọ ga-agba nchara, akịka atakwa ya, ebe ndị ohi ga-etiwa ma zukwaa ha.
20 But store up treasures in heaven for yourselves, where neither moth nor rust destroys, and thieves can't break in and steal. Kama kwadoonụ akụ nʼeluigwe nye onwe unu, ebe ha na-agaghị agba nchara, ebe akịka na-agaghị eri ha, ebe ndị ohi na-adịghị etiwa maọbụ zuo ihe.
21 For where your treasure is, there your heart will be also. Nʼihi na ebe ọbụla akụ unu dị ka obi unu ga-adịkwa.
22 "The eye is the body's lamp. If your eye is clear, your whole body will be full of light. “Anya bụ oriọna nke anụ ahụ. Ọ bụrụkwa na anya gị adịrị ọcha, ahụ gị niile ga-ejupụta nʼìhè.
23 But if your eye is bad, your whole body will be dark. If then the light in you is darkness, how great that darkness is! Ọ bụrụ na anya gị ajọọ njọ, akụkụ ahụ gị niile ga-ejupụta nʼọchịchịrị. Ọ bụrụkwa na ìhè ahụ dị nʼime gị aghọọ ọchịchịrị, ọchịchịrị ahụ ga-adị ukwuu.
24 "No one can serve two masters: he'll hate one and love the other, or hold to one and despise the other. You can't serve our Father and money. “Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ ife nna ukwu abụọ, nʼihi na ọ ga-achọ ịhụ otu nʼime ha nʼanya, kpọkwa nke ọzọ asị, maọbụ sọpụrụ otu ma lelịa nke ọzọ anya. Otu a kwa i nweghị ike ife Chineke na akụ otu mgbe ahụ.
25 "So I tell you: don't worry about your life—what you'll eat or drink—or body—what you'll wear. Isn't life more than food, body more than clothes? “Nʼihi nke a ka m ji na-asị unu, unu echegbula onwe unu banyere ndụ unu, ihe unu ga-eri, maọbụ ihe unu ga-aṅụ, maọbụ banyere ahụ unu, ihe unu ga-eyi nʼahụ. Ọ bụ ndụ akarịghị nri eji azụ ya, ka ọ bụ ahụ akarịghị ihe e ji ekpuchi ya?
26 Look at the birds in the sky: they don't plant, harvest, or store in barns, yet your heavenly Father feeds them. Aren't you worth more than they? Werenụ ụmụ nnụnụ dị ka ihe ịmaatụ. Ha adịghị akụ mkpụrụ nʼubi maọbụ ewe ihe ubi. Ha adịghị achịkọtakwa ihe debe nʼọba. Ma Nna unu nke bi nʼeluigwe na-azụ ha. Ọ bụ na unu adịghị oke ọnụahịa karịa ha?
27 Can any of you by worrying add a single hour to your life? Onye nʼetiti unu pụrụ itinye otu nkeji nʼogologo ụbọchị nke ndụ ya site nʼichegbu onwe ya?
28 And why worry about clothing? Consider the lilies of the field, how they grow: they don't work or spin. “Gịnị mekwaranụ unu ji na-anọ nʼechiche oge niile maka uwe? Leenụ okoko osisi nke ọhịa. Ha adịghị arụ ọrụ maọbụ dọgbuo onwe ha nʼọrụ.
29 Yet I tell you: not even Solomon, in all his glory, was dressed like one of these. Ma asị m unu, ọ bụladị Solomọn nʼebube nke ịbụ eze ya niile, eyighị uwe ọbụla mara mma dị ka otu nʼime okoko osisi nke ọhịa ndị a.
30 If our Father clothes the field's grass like this—here today, thrown into the fire tomorrow—won't he much more clothe you, you of little faith? Ma ọ bụrụ na Chineke si otu a chọọ ahịhịa efu nke ubi mma, nke pụrụ ịdị ndụ taa ma echi atụba ha nʼite ọkụ, ọ bụ na ọ gaghị a chọọ unu mma karịa. Unu ndị okwukwe nta?
31 "So don't worry, asking, 'What will we eat?' or 'What will we drink?' or 'What will we wear?' Nʼihi nke a, unu echegbukwala onwe unu na-asị, ‘Gịnị ka anyị ga-eri?’ maọbụ, ‘Gịnị ka anyị ga-aṅụ?’ maọbụ, ‘Gịnịkwa ka anyị ga-eyi?’
32 For those who don't know the Father chase all these things, but your heavenly Father knows you need them. Ọ bụ ihe ndị a ka ndị na-amaghị Chineke na-achọsi ike. Ma Nna unu bi nʼeluigwe maara na ọ dị unu mkpa.
33 But seek first our Father's kingdom and his righteousness, and all these will be added to you. Ma burunu ụzọ chọọ alaeze ya na ezi omume ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a niile.
34 So don't worry about tomorrow—it will worry about itself. Each day has enough trouble of its own." Ya mere, unu echegbula onwe unu banyere echi, nʼihi na echi ga-echere onwe ya. Nsogbu nke ụbọchị taa ezuorola ụbọchị taa.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]