Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Matthew 10 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Jesus called his twelve disciples and gave them authority over unclean spirits, to drive them out and heal every disease and every sickness. Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ nye ha ikike ịchụpụ mmụọ na-adịghị ọcha, na ịgwọ nrịa nrịa na ọrịa niile dị iche iche.
2 The twelve apostles' names: first, Simon called Peter, and Andrew his brother; James son of Zebedee, and John his brother; Nke a bụ aha ndị ozi iri na abụọ ahụ: Saimọn (onye a na-akpọkwa Pita) na Andru nwanne Saimọn; Jemis nwa Zebedi, na Jọn nwanne ya.
3 Philip and Bartholomew; Thomas and Matthew the tax collector; James son of Alphaeus and Thaddaeus; Filip na Batalomi; Tọmọs na Matiu onye ọna ụtụ; Jemis nwa Alfiọs, na Tadiọs.
4 Simon the Zealot and Judas Iscariot, who also betrayed him. Saimọn onye a na-akpọ Zilọt na Judas Iskarịọt, onye raara ya nye nʼaka ndị gburu ya.
5 Jesus sent these twelve, instructing them: "Do not go to Gentile regions or enter a Samaritan town. Ndị ikom iri na abụọ ndị a ka Jisọs nyere ikike zipụ. Maara ha ọkwa sị ha: “Unu agala nʼebe ndị mba ọzọ, maọbụ nʼebe ndị Sameria nọ.
6 Go rather to the lost sheep of the house of Israel. Kama jekwurunụ ụmụ Izrel, ndị bụ atụrụ furu efu.
7 As you go, proclaim this message: 'The kingdom of our Father has come near.' Mgbe unu na-aga, na-ekwusaaranụ ha sị, ‘alaeze eluigwe a dịla nso.’
8 Heal the sick, raise the dead, cleanse those with leprosy, drive out demons. Freely you received; freely give. Gwọọnụ ndị ọrịa, kpọteenụ ndị nwụrụ anwụ, meenụ ka ahụ ndị ekpenta dị ọcha, chụpụkwanụ mmụọ ọjọọ. Nʼefu ka unu natara. Ya mere, nyenụ nʼefu.
9 Do not take any gold or silver or copper in your belts. “Mgbe unu na-aga, unu anatala ọlaọcha maọbụ ọlaedo, maọbụ ọla ọbụla tinye nʼime belịt unu.
10 No travel bag, no second shirt, no sandals, no staff—the worker deserves his food. Unu ejikwala akpa maka njem unu, maọbụ uwe abụọ, maọbụ akpụkpọụkwụ, maọbụ mkpanaka. Nʼihi na onye ọrụ kwesiri ihe e ji azụ ya.
11 Whatever town or village you enter, find out who is worthy there, and stay there until you leave. Ma obodo ọbụla maọbụ ogbe ọbụla unu bara nʼime ya, chọọnụ ụfọdụ ndị kwesiri nsọpụrụ bi nʼobodo ahụ. Nọgidekwanụ nʼụlọ ha ruo mgbe unu ga-ahapụ obodo ahụ.
12 As you enter the home, greet it. Mgbe unu na-abanye nʼụlọ ahụ, keleenụ ndị bi na ya sị, udo dịrị unu.
13 If the home is worthy, let your peace rest on it; if not, let it return to you. Ọ bụrụ na ndị nọ nʼụlọ ahụ anabata unu, meenụ ka udo unu bịakwasị nʼụlọ ahụ. Ọ bụrụkwanụ na ha anabataghị unu, ka udo unu lọghachikwute unu.
14 If anyone won't welcome you or hear your words, shake the dust off your feet as you leave that house or town. Ọ bụrụ na onye ọbụla anabataghị unu, maọbụ jụ ịnụrụ okwu unu, mgbe unu na-ahapụ ụlọ ahụ maọbụ obodo ahụ kụchapụnụ aja dị nʼụkwụ unu.
15 Truly I tell you: Sodom and Gomorrah will fare better on judgment day than that town. Nʼeziokwu, ọ ga-adịrị obodo ahụ njọ nʼụbọchị ikpe karịa obodo Sọdọm na Gọmọra.
16 Look, I send you out as sheep among wolves; so be as shrewd as serpents, as innocent as doves. “Ana m ezipu unu dị ka atụrụ nʼetiti agụ. Ya mere, nweenụ uche dịka agwọ. Burunu ndị a na-apụghị ịta ụta dịka nduru.
17 Beware of people; they will hand you over to councils and whip you in their synagogues. Kpachapụnụ anya. Nʼihi na a ga-enyefe unu nʼaka nzukọ ndị ụlọ ikpe, pịaakwa unu ihe nʼụlọ ekpere ha.
18 For my sake you'll be brought before governors and kings, as testimony to them and the Gentiles. A ga-ekpe unu ikpe nʼihu ndị na-achị achị na nʼihu ndị eze nʼihi m. Ma nke a ga-enye unu ohere ịgwa ha ihe banyere m. E, nke a ga-enye unu ohere ịgba ama banyere m nye ndị mba ọzọ.
19 But when they hand you over, don't worry about what to say or how—for what to say will be given you at that time, Mgbe ha jidere unu na-ekpe unu ikpe, unu echegbula onwe unu banyere ihe unu ga-ekwu, maọbụ otu unu ga-esi kwuo ya. Nʼihi na a ga-eme ka unu mata ihe unu ga-ekwu nʼoge ahụ.
20 for it will not be you speaking, but the Spirit of your Father speaking through you. Nʼihi na ọ bụghị unu ga-ekwu nʼonwe unu. Kama Mmụọ nke Nna unu bi nʼeluigwe ga-esite nʼọnụ unu kwuo okwu.
21 Brother will betray brother to death, father his child; children will rise against their parents and have them killed. “Nwanne ga-arara nwanne ya nye ka e gbuo ya, nna ga-ararakwa nwa ya nye. Ụmụ ga-ebili megide ndị mụrụ ha mee ka e gbuo ha.
22 Everyone will hate you because of my name, but whoever holds out to the end will be saved. Mmadụ niile ga-akpọ unu asị nʼihi m. Ma onye ga-eguzosi ike ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.
23 When persecuted in one town, flee to the next. I tell you truly: you won't finish Israel's towns before the Son of Man comes. Mgbe ọbụla ndị mmadụ sogburu unu nʼotu obodo gbalaganụ nʼobodo ọzọ. Nʼezie, asị m unu, unu agaghị agazucha obodo niile nke Izrel tupu Nwa nke Mmadụ alọghachi.
24 The student is not above the teacher, nor the servant above his master. “Nwata akwụkwọ adịghị akarị onye nkuzi ya. Ohu adịghị akarịkwa nna ya ukwu.
25 It's enough for the student to become like the teacher, and the servant like the master. If they call the head of the house Beelzebul, how much more his household! O zuorela onye na-eso ụzọ onye nkuzi ka ọ dị ka onye nkuzi ya, na ohu ahụ ka ọ dị ka onyenwe ya. Ọ bụrụ na a kpọrọ nna nwe ụlọ Belzebub, a ga-esi aṅaa ghara ịkpọ ndị ezinaụlọ ya ihe karịrị nke a?
26 So do not be afraid of them. There is nothing concealed that will not be disclosed, or hidden that will not be made known. “Ya mere unu atụla ha egwu. O nweghị ihe ọbụla e kpuchiri ekpuchi nke a na-agaghị ekpughe, maọbụ ihe e zoro ezo nke a na-agaghị eme ka ọ pụta ìhè.
27 What I tell you in the dark, say in daylight; what's whispered in your ear, proclaim from rooftops. Ihe m na-agwa unu ugbu a na nzuzo, kọsaanụ ya mgbe chi bọrọ. Ihe m ji nwayọọ mee ka ọ baa unu na ntị, nọdụnụ nʼelu ụlọ kwusaa ya.
28 Don't fear those who kill the body but not the soul; instead fear the One able to destroy both soul and body in hell. Unu atụla egwu ndị pụrụ igbu naanị anụ ahụ unu, ma ha enweghị ike ịmetụ mkpụrụobi unu aka. Kama onye unu ga-atụ egwu bụ Onye ahụ nwere ike imebi anụ ahụ unu na mkpụrụobi, tụbakwa ha nʼọkụ ala mmụọ.
29 Aren't two sparrows sold for a penny? Yet not one falls to the ground without your Father. Ọ bụghị otu kobo ka a na-ere ụmụ nza abụọ? Ma otu nʼime ha agaghị ada nʼala ma ọ bụrụ na Nna unu bi nʼeluigwe amaghị.
30 And even the very hairs of your head are all numbered. Ọ bụladị agịrị isi dị nʼisi unu ka a maara ọnụọgụgụ ha.
31 So do not be afraid; you are worth more than many sparrows. Ya mere, unu atụla egwu. Unu dị oke ọnụ karịa ọtụtụ ụmụ nza.
32 Therefore, whoever acknowledges me before others, I will also acknowledge before my Father in heaven. “Ya mere, onye ọbụla kwupụtara m nʼihu ụmụ mmadụ, ka mụ onwe m ga-ekwupụta nʼihu Nna m bi nʼeluigwe.
33 But whoever denies me before others, I'll deny before my Father in heaven. Ma onye ọbụla na-agọnarị m nʼihu ndị mmadụ, mụ onwe m ga-agọnarịkwa ya nʼihu Nna m bi nʼeluigwe.
34 Do not think I came to bring peace on earth; I came not to bring peace but a sword. “Unu echekwala na m bịara iweta udo nʼụwa. Abịaghị m iweta udo, kama ọ bụ iwebata mma agha.
35 For I came to pit a man against his father, a daughter against her mother, a daughter-in-law against her mother-in-law, Abịara m ime, “ ‘Ka nwoke megide nna ya, ka nwa nwanyị megide nne ya, ka nwunye nwa megide nne di ya,
36 a man's enemies will be the members of his own household. ndị iro mmadụ ga-abụ ndị ezinaụlọ ya.’
37 Whoever loves father or mother above me is unworthy of me; whoever loves son or daughter above me is unworthy of me. “Ọ bụrụ na ị hụrụ nne gị maọbụ nna gị nʼanya karịa m, i kwesighị ịbụ onye nke m. Ọ bụrụ na ị hụrụ nwa gị nwoke, maọbụ nwa gị nwanyị nʼanya karịa m, i kwesighị ịbụ onye nke m.
38 Whoever does not take up his cross and follow me is not worthy of me. Onye ọbụla na-eburughị obe ya soro m, ekwesighị ị bụ onye nke m.
39 Whoever finds his life loses it, and whoever loses his life for my sake finds it. Onye ọbụla chọtara ndụ ya ga-etufu ya, ma onye ọbụla tufuru ndụ ya maka m, ga-achọtakwa ya.
40 Whoever welcomes you welcomes me, and whoever welcomes me welcomes the One who sent me. “Ndị niile nabatara unu na-anabata m. Mgbe ha nabatara m, ọ bụkwa Onye ahụ zitere m ka ha na-anabata.
41 Whoever welcomes a prophet as a prophet gets a prophet's reward, and whoever welcomes a righteous person as a righteous person gets a righteous person's reward. Ọ bụrụ na unu anabata onye amụma nʼihi na ọ bụ onye amụma, unu na onye amụma ahụ ga-enwekọ otu ụgwọ ọrụ. Ọ bụrụkwa na unu anabata onye ezi omume nʼihi ezi omume ya, unu ga-esorokwa ya nata ụgwọ ọrụ nke onye ezi omume.
42 And whoever gives just a cup of cold water to one of these little ones because he is my disciple, truly I tell you, will never lose his reward." Ọ bụrụ na onye ọbụla ekunye otu nʼime ndị a na-eso ụzọ m mmiri oyi ka ọ ṅụọ, nʼihi na ọ bụ onye na-eso ụzọ m, nʼezie, asị m unu, ọ ghaghị ịnata ụgwọ ọrụ ya.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]