Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Malachi 3 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Look, I am sending my messenger, and he will prepare the way before me. Then suddenly the Lord whom you are seeking will come to his temple—the messenger of the covenant in whom you delight. Look, he is coming, says the Father of heaven's armies. “Lee, aga m ezipu onyeozi m, onye ga-edozi ụzọ nʼihu m. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị ahụ unu na-ele anya ya ga-abịa na mberede nʼụlọnsọ ukwu ya. Onyeozi nke ọgbụgba ndụ ahụ, onye ihe ya na-agụsị unu agụụ ike, ga-abịa,” ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
2 "But who can endure the day he comes? Who can stand when he appears? He is like a refiner's fire, like a launderer's soap. “Ma onye ga-anagide ụbọchị ọbịbịa ya ma guzokwa mgbe ọ pụtara ihe? Nʼihi na ọ ga-adị ka ọkụ na-anụcha anụcha, dịkwa ka ncha e ji asụ akwa.
3 He will sit refining and purifying silver; he will purify Levi's sons and refine them like gold and silver, and they will bring offerings to our Father in righteousness. Ọ na-anọdụ ala dịka ndị na-anụcha ọlaọcha ime ka ọ dị ọcha. Ọ ga-anụcha ndị Livayị, ime ka ha dị ọcha, dịka ọlaedo na ọlaọcha a nụchara anụcha tutu ruo mgbe ha ga-ewetara Onyenwe anyị onyinye nʼezi omume.
4 Then Judah and Jerusalem's offering will please our Father, as in days past, as in former years." Mgbe ahụ, onyinye Juda na Jerusalem ga-abụ onyinye Onyenwe anyị ga-anabata, dịka o si anabata ha nʼụbọchị ndị ahụ gara aga, na mgbe ochie gara aga.
5 I will come near to judge you, a swift witness against sorcerers, adulterers, those who swear falsely, who cheat the worker of his wages, oppress the widow and orphan, push aside the foreigner, and do not fear me, says the Father of heaven's armies. “Mgbe ahụ, aga m abịa unu nso ikpe unu ikpe. Aga m abịakwa ngwangwa ịgbagide ha ama bụ ndị mgbaasị, na ndị na-akwa iko, na ndị na-aṅụ iyi ụgha, na ndị na-emegbu ndị inyom di ha nwụrụ, na ndị na-emegbu ndị na-enweghị nna, na ndị na-anapụ ndị ọbịa ikpe ziri ezi, ndị ahụ niile na-adịghị atụ egwu m.” Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
6 For I, your Father, do not change; therefore you, children of Jacob, have not been destroyed. “Nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị adịghị agbanwe agbanwe. Ya mere, unu bụ ụmụ Jekọb ji dịgide.
7 Since your ancestors' days you have turned from my statutes and not kept them. Return to me, and I will return to you, says the Father of heaven's armies. But you ask, 'How are we to return?' Site nʼoge nna nna unu ha, unu esitela nʼidebe iwu na ụkpụrụ m wezuga onwe unu. Unu adịghịkwa edebe ha. Ya mere, lọghachikwutenụ m, mụ onwe m ga-alọghachikwute unu.” Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu. “Ma unu na-asị, ‘Anyị ga-esi aṅaa lọghachi?’
8 Will a person rob their Father? Yet you rob me. But you ask, 'How have we robbed you?' In the tenth and the offerings. “Mmadụ ọ na-ezu ihe bụ nke Chineke nʼohi? Ma unu apụnarịla m ihe bụ nke m. “Ma unu na-ajụ: ‘Anyị si aṅaa na-ezu gị ohi?’ “Ọ bụ site nʼotu ụzọ nʼime ụzọ iri unu, onyinye na aja niile.
9 You are cursed with a curse, for you are robbing me—the whole nation of you. Nʼihi ya, ọbụbụ ọnụ dịịrị unu, ka mba niile unu ha, nʼihi na ọ bụ mụ onwe m ka unu na-ezu ohi.
10 Bring the full tenth into the storehouse, so there's food in my house. Test me in this, says the Father of heaven's armies, and see if I won't open heaven's windows for you and pour out blessing for you until there's no more need. Webatanụ otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe niile unu nʼime ụlọakụ m, ka nri jupụta nʼime ụlọ m. Jirinụ nke a nwalee m,” ka unu hụ ma mụ onwe m agaghị emeghe ọnụ ụzọ eluigwe, site na ya wụdatara unu ngọzị dị ukwuu, nke ga-ejubiga oke na ọnọdụ agaghị adị ichebe ha. Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.
11 I will rebuke the devourer for you, so it will not destroy your ground's fruit, and your vine in the field will not fail to bear, says the Father of heaven's armies. “Aga m egbochi ihe nripịa ndị ahụ niile ka ha ghara iripịa mkpụrụ ubi unu. Osisi vaịnị unu agakwaghị atụpụsị mkpụrụ ya nʼala tutu ruo mgbe ha chara.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.
12 Then all nations will call you blessed, for you will be a land of delight, says the Father of heaven's armies. “Mgbe ahụ, mba niile dị iche iche ga-akpọ unu ndị a gọziri agọzi, nʼihi na ala unu ga-abụ nke na-enye ndị nwe ya obi ụtọ.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
13 Your words were harsh against me, says our Father. But you ask, 'What have we said against you?' Onyenwe anyị na-ekwu, sị, “Unu ekwuola ọtụtụ okwu dị ike megide m.” “Ma unu na-ajụ, ‘Gịnị ka anyị kwuru megide gị?’
14 You said, 'Serving God is useless. What have we gained by keeping his charge and walking as mourners before the Father of heaven's armies?' “Unu ekwuola sị, ‘Ọ bụ ihe nzuzu ife Chineke ofufe, na ịtụ ya egwu. Gịnị bụ uru anyị na-erite site nʼidebe iwu ya, na ijegharị dịka ndị na-eru ụjụ nʼihu Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile?
15 Now we call the arrogant blessed. Those who do evil prosper; they even test God and escape. Ma site ugbu a gaa nʼihu, ndị nganga ka anyị ga-akpọ ndị ihe na-agara nke ọma. Nʼezie, ndị na-eme ihe ọjọọ ka ihe na-agara nke ọma. Ndị ahụ jikwa ihe ọjọọ ha na-anwa Chineke na-agbanarị ntaramahụhụ ya.’ ”
16 Then those who feared our Father spoke to one another, and he listened and heard. A scroll of remembrance was written before him for those who fear him and treasure his name. Mgbe ahụ, ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị gwarịtara ibe ha okwu, Onyenwe anyị ṅara ntị, nụkwa ihe ha na-ekwu. Nʼihu ya, e nwere akwụkwọ ncheta dị ya, ebe e dere aha ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị, ma na-echekwa echiche banyere aha ya.
17 They will be mine, says the Father of heaven's armies, on the day I act, my treasured possession. I will spare them as a father spares his son who serves him. “Nʼụbọchị ahụ m ga-eme ihe,” ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu, “ha ga-abụ ihe oke ọnụahịa nke aka m. Aga m echebe ha, dịka nna na-enwe ọmịiko ma chebekwa nwa ya nwoke na-efe ya.
18 Once more you will see the difference between the righteous and the wicked, between one who serves our Father and one who does not serve him. Unu ga-ahụ ihe dị iche nʼetiti ndị ezi omume na ndị ajọ omume, hụkwa ihe dị iche nʼetiti ndị na-efe Chineke na ndị na-adịghị efe ya.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]