Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Malachi 2 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Now, priests, this command is for you. “Ma ugbu a, unu ndị nchụaja, ịdọ aka na ntị a dịrị unu.
2 If you won't listen, or take it to heart to honor my name, says the Father of heaven's armies, I will send the curse on you and curse your blessings. I have already cursed them, because you don't take it to heart. Ọ bụrụ na unu ajụ ige ntị, ọ bụrụkwa na unu ekpebighị nʼobi unu inye aha m otuto,” ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na-ekwu, “Aga m ezite ọbụbụ ọnụ nʼahụ unu, aga m abụkwa ngọzị unu niile ọnụ. E, abụọlarị unu ọnụ, nʼihi na unu ekpebighị nʼobi unu ịsọpụrụ m.
3 I will rebuke your offspring and smear manure on your faces—the manure of your feasts—and you will be carried off with it. “Nʼihi unu, aga m abara ụmụ ụmụ unu mba. Agaghị m anabata onyinye unu, aga m efesakwa nsị anụ nʼihu unu, bụ nsị nke ihe onyinye unu, aga m ewezugakwa unu site nʼihu m.
4 Then you will know I sent this command to you, so my covenant with Levi stands, says the Father of heaven's armies. Otu a ka unu ga-esi mara na ọ bụ mụ zitere unu ịdọ aka na ntị a, ka ọgbụgba ndụ mụ na Livayị gbara dịgide,” Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na-ekwu.
5 "My covenant with him was life and peace; I gave them to him to be held with reverence, and he revered me and trembled before my name. “Ọgbụgba ndụ mụ na ya bụ nke ndụ na udo, ọ bụ m nyere ha ya, nke a bụ nʼihi nsọpụrụ. O nyere m nsọpụrụ nʼezie, tụkwaa aha m egwu.
6 True instruction was in his mouth, no wrong on his lips. He walked with me in peace and integrity, and turned many from sin. Iwu nke eziokwu dị ya nʼọnụ, ọ dịkwaghị okwu ụgha ọbụla a chọpụtara nʼegbugbere ọnụ ya. O soro m jee ije nʼudo, na nʼịkwụba aka ọtọ. O mekwara ka ọtụtụ si nʼajọ omume ha chigharịa.
7 A priest's lips guard knowledge, and people seek instruction from his mouth, for he is the messenger of the Father of heaven's armies. “Nʼihi na egbugbere ọnụ onye nchụaja kwesiri ijupụta nʼihe ọmụma; e kwesikwara isi nʼọnụ ya mụta ihe, nʼihi na ọ bụ onyeozi nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
8 But you turned from the way and made many stumble by your instruction; you corrupted the covenant of Levi, says the Father of heaven's armies. Ma unu esitela nʼụzọ ahụ wezuga onwe unu, sitekwa nʼozizi unu mee ka ọtụtụ mmadụ sụọ ngọngọ. Unu emerụọla ọgbụgba ndụ nke Livayị.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
9 So I made you despised and low before all the people, because you haven't kept my ways but shown favoritism in your instruction." “Nʼihi nke a, emeela m ka unu bụrụ ndị a na-elelị anya, na ndị e wedara nʼala nʼihu ndị mmadụ niile, nʼihi na unu agbasoghị ụzọ m, kama unu na-ele mmadụ anya nʼihu, nʼihe metụtara iwu.”
10 Don't we all have one Father? Didn't one Father create us? Why betray each other, desecrating our fathers' covenant? Ọ bụghị otu Nna ka anyị niile nwere? Ọ bụghị otu Chineke ahụ kere anyị? Gịnị mere anyị ji na-emerụ ọgbụgba ndụ nna anyị ha site na-enweghị ntụkwasị obi na mmekọrịta anyị na ibe anyị?
11 Judah is unfaithful; a detestable thing is done in Israel and Jerusalem. Judah has desecrated our Father's holy place, which he loves, and married the daughter of a foreign god. Juda ekwesighị ntụkwasị obi. E meela ihe arụ nʼIzrel na nʼime Jerusalem: Juda emerụọla ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị hụrụ nʼanya, lụọkwa ada chi ndị mba ọzọ.
12 May our Father cut off from Jacob's tents the man who does this—anyone at all—even one bringing an offering to the Father of heaven's armies. Ka Onyenwe anyị kewapụ onye mere ihe dị otu a nʼụlọ ikwu Jekọb, ka ọ ghara inwe onye akaebe, ka ọ ghara inwe onye ga-aza ya mgbe ọ kpọrọ oku maọbụ butere Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile onyinye.
13 And a second thing you do: you cover our Father's altar with tears, weeping and groaning, because he no longer regards the offering or accepts it gladly from your hand. Ihe ọzọ unu na-emekwa bụ ndị a: unu na-eme ka anya mmiri unu jupụta nʼebe ịchụ aja Onyenwe anyị. Unu na-akwa akwa, na-eti mkpu akwa nʼihi na ọ naghị elenye anya nʼonyinye unu, maọbụ jiri obi ụtọ nabata ha.
14 You ask, "Why?" Because our Father witnessed between you and the wife of your youth, whom you betrayed—though your companion, your wife by covenant. Unu na-asị “Nke a ọ bụ nʼihi gịnị?” Ọ bụ nʼihi na Onyenwe anyị bụ onyeama nʼetiti gị na nwunye ị lụrụ nʼokorobịa gị, nʼihi na ị kwesighị ntụkwasị obi, ọ bụ ezie na ọ bụ nwanyị e jikọtara gị na ya, bụrụkwa nwunye ọgbụgba ndụ gị.
15 Didn't the Father make you one with your wife? Body and spirit, you are his. And what does he want? Godly children from your union. So guard your spirit; let no one betray the wife of his youth. Ọ bụ na ọ bụghị otu Chineke ahụ kere gị? Nʼanụ ahụ na nʼime mmụọ, unu bụ nke ya. Ma gịnị ka otu Chineke a chọrọ? Ka unu bụrụ ụmụ na-atụ ya egwu. Ya mere, jie mmụọ gị aka, ka ị gharakwa ịbụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼebe nwunye ị lụtara nʼokorobịa nọ.
16 "For I hate divorce," says our Father, the Father of Israel, "and whoever covers his garment with violence," says the Father of heaven's armies. So guard your spirit; do not be unfaithful. “Akpọrọ m ịgba alụkwaghị m asị,” ka Onyenwe anyị Chineke nke Izrel sịrị, “a kpọkwara nwoke na-emeso nwunye ya mmeso nʼụzọ ihe ike asị.” Ọ bụ Onyenwe Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu. Ya mere, kpachapụrụnụ onwe unu anya, unu abụkwala ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi.
17 You have worn out our Father with your words. Yet you ask, "How have we worn him out?" By saying, "All who do evil are good in his sight, and he delights in them"—or, "Where is the Father of justice?" Unu esitela nʼoke okwu unu mee ka ike gwụ Onyenwe anyị. Ma unu na-ajụ, “Olee ụzọ anyị si mee ka ike gwụ ya?” Mgbe unu na-asị, “Ndị niile na-eme ihe ọjọọ dị mma nʼanya Onyenwe anyị. Ihe ha na-atọkwa ya ụtọ,” maọbụ na-asịkwa, “Ebee ka Chineke ahụ na-ekpe ikpe ziri ezi nọ?”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]