Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Malachi 1 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 This is the word of our Father to Israel, delivered through Malachi. Okwu amụma: Nke a bụ okwu Onyenwe anyị gwara Izrel site nʼọnụ Malakaị onye amụma.
2 "I have loved you," says our Father. "But you ask, 'How have you loved us?' Wasn't Esau Jacob's brother?" declares our Father. "Yet I loved Jacob, “Ahụla m unu nʼanya,” ka Onyenwe anyị na-ekwu. “Ma unu na-asị, ‘Olee ụzọ i si hụ anyị nʼanya?’ “Ịsọ, ọ bụghị nwanne Jekọb?” ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ma otu ọ dị, ahụrụ m Jekọb nʼanya,
3 but Esau I hated. I made his hill country wasteland, left his inheritance to desert jackals." ma Ịsọ ka m kpọrọ asị, mee ugwu ya niile ka ha ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu, werekwa ihe nketa ya nye nkịta ọhịa niile nke ọzara.”
4 Edom may say, "We are shattered, but we will rebuild the ruins." But the Father of heaven's armies says: "They may build, but I will tear down. They will be called the Wicked Land, the people our Father stays angry with forever." Ndị Edọm nwere ike sị, “Ọ bụ ezie na e tikpọọla anyị, ma anyị ga-ewugharị nkpọnkpọ ebe niile.” Ma otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na-ekwu, “Ha nwere ike wugharịa ya, ma aga m akwadakwa ha ọzọ. Nʼihi na a ga-akpọ ha Obodo ihe ọjọọ, ndị Onyenwe anyị na-eweso iwe ruo mgbe ebighị ebi.
5 Your own eyes will see it, and you'll say, 'Great is our Father—beyond Israel's borders!' Anya unu ga-ahụ nke a ma unu ga-ekwukwa, ‘Onyenwe anyị dị ukwuu, ọ bụladị ruo nʼofe oke ala Izrel!’ ”
6 "A son honors his father, a servant his master. If I am a father, where is my honor? If a master, where is my respect? says the Father of heaven's armies to you priests who despise my name. But you ask, 'How have we despised your name?'" “Nwa na-asọpụrụ nna ya, ohu na asọpụrụkwa onyenwe ya. A sị na m bụ nna, ebee ka egwu m dị. A sị na m bụ onyenwe mmadụ, ebee ka nsọpụrụ m dị?” Ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu. “Ọ bụ unu ndị nchụaja na-eleda aha m anya. “Ma unu na-ajụ, ‘Olee ụzọ anyị si eleda aha gị anya?’
7 "You put unclean food on my altar, then ask, 'How have we made you unclean?' By calling our Father's table despised. “Unu na-eji anụ rụrụ arụ na-achụrụ m aja nʼelu ebe ịchụ aja m. “Ma unu na-ajụ, ‘Olee ụzọ anyị si merụọ ya?’ “Ọ bụ mgbe unu na-asị na tebul Onyenwe anyị bụ ihe e kwesiri ileda anya.
8 When you offer a blind animal, isn't that evil? Offer the lame and sick—isn't that evil? Present it to your governor—will he be pleased with you? Will he accept you?" says the Father of heaven's armies. Mgbe unu ji anụ ndị kpuru ìsì achụrụ m aja, ọ bụghị ihe na-ezighị ezi ka unu na-eme? Mgbe unu na-ejikwa ndị dara ngwụrọ, na anụ na-arịa ọrịa, ọ bụghị ihe ọjọọ ka unu na-eme? Werenụ anụ ndị a bugara onye na-achị obodo unu dịka onyinye. Ọ ga-atọ ya ụtọ ịnabata onyinye dị otu a? Ọ ga-anabata unu?” Ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.
9 "Now plead with our Father to be gracious to us. With such offerings from your hands, will he accept any of you?" says the Father of heaven's armies. “Ma ugbu a, rịọọnụ Chineke ka o gosi anyị amara ya. Ọ bụrụ na unu ji onyinye ndị dị otu a nʼaka unu, ọ ga-egosi unu afọ ọma ya?” Ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.
10 "If only one of you would shut the doors, so you would not light useless fires on my altar! I take no pleasure in you," says the Father of heaven's armies, "and I will accept no offering from your hands. “Ọ gaara adị m nnọọ mma ma a sị na otu onye nʼime unu ga-emechi ọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu ahụ, ka unu gharakwa ịkwanye ọkụ na-enweghị isi nʼelu ebe ịchụ aja m. Ihe banyere unu adịghị atọ m ụtọ. Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. Agaghị m anabatakwa onyinye ọbụla si unu nʼaka.
11 From sunrise to sunset my name will be great among the nations. Everywhere incense and pure offerings will be brought to my name, because my name will be great among the nations," says the Father of heaven's armies. Nʼihi na site nʼọwụwa anyanwụ ruo ọdịda ya, aha m ga-adị ukwuu nʼetiti mba niile. A ga-ewebatara m ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na onyinye dị ọcha nʼaha m, nʼebe niile, nʼihi na aha m ga-adị ukwuu nʼetiti mba niile.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
12 "But you desecrate it, saying the Sovereign Father's table is unclean and its food may be despised." “Ma unu na-eme ka ọ ghara ịdị nsọ mgbe unu na-asị na, Tebul Onyenwe anyị bụ ihe e merụrụ emerụ, ebe ihe oriri ya bụkwa ihe nlelị.
13 "You say, 'What a burden!' and snort at it in contempt," says the Father of heaven's armies. "You bring stolen, lame, and diseased animals as offerings—should I accept them from you?" says our Father. Unu na-ekwukwa, ‘Nke a bụ ihe ike ọgwụgwụ,’ si otu a na-eduli imi unu elu nʼebe m nọ nʼọnọdụ oke nlelị.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. “Mgbe unu na-ewebata ihe a natara nʼike, na nke dara ngwụrọ, na nke na-arịa ọrịa, jiri ha chụọrọ m aja, o kwesiri ka m nabata ya?” Ka Onyenwe anyị na-ekwu.
14 "Cursed is the cheat who has a sound male in his flock and vows it, but sacrifices a defective animal to the Sovereign Father. For I am a great King," says the Father of heaven's armies, "and my name is to be feared among the nations." “Onye a na-abụ ọnụ ka onye aghụghọ ahụ bụ nke nwere oke nʼigwe ewu na atụrụ ya, kwee nkwa inye ya, ma mesịa were anụ nwere ntụpọ chụọrọ Onyenwe anyị aja. Nʼihi na mụ onwe m bụ Eze ukwu ahụ,” ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “aha m bụkwa ihe a ga-atụ egwu nʼetiti mba dị iche iche.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]