Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Jude 1 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Jude, servant of Jesus Christ and brother of James, to those called, loved in our Father and kept for Jesus Christ: Jud, odibo Jisọs Kraịst, na nwanne Jemis, Na-edegara ndị niile a kpọrọ, ndị ahụrụ nʼanya nʼime Chineke, bụ Nna, na ndị nọkwa nʼokpuru nchebe Jisọs Kraịst akwụkwọ ozi a:
2 May mercy, peace, and love be multiplied to you. Ka ebere na udo na ịhụnanya bara unu ụba.
3 Beloved, though eager to write about our shared salvation, I had to write urging you to fight for the faith once for all given to the holy ones. Ndị m hụrụ nʼanya, ebe ọ na-anụ m ọkụ nʼobi idere unu akwụkwọ banyere nzọpụta ahụ anyị nwekọrọ nʼotu, ma ahụrụ m mkpa ọ dị idere unu akwụkwọ a, ịrịọ unu ka unu guzosie ike buo agha ichebe okwukwe ahụ, nke e nyefere ndị nsọ nʼaka idebe.
4 For some have slipped in unnoticed, long ago marked out for this judgment—godless people who twist our Father's grace into a license for lust, and deny our only Master and Lord, Jesus Christ. Nʼihi na ụfọdụ mmadụ, bụ ndị e dere ihe banyere ọmụma ikpe dịrị ha, siterị nʼoge gara aga, ezobatala nʼetiti unu. Ha bụ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke, ndị na-agbanwe amara Chineke anyị, mee ya ka ọ bụrụ ohere ha nwere ibi ndụ ịkwa iko, na nke ịgọnarị Jisọs Kraịst, onye naanị ya bụ Onye kachasị ihe niile elu na Onyenwe.
5 Now I want to remind you, though you already know all this, that Jesus, having saved a people out of the land of Egypt, afterward destroyed those who did not believe. Ọ bụ ezie na unu maa ihe ndị a niile, ma achọrọ m ichetara unu otu Onyenwe anyị si zọpụta ndị ya site nʼala Ijipt, ma mesịa laa ndị niile na-ekweghị ekwe nʼiyi.
6 The angels who didn't keep their own position but left their proper home, he has kept in eternal chains, under deep darkness, for judgment on the great day. Ndị mmụọ ozi nupuru isi, ndị na-anọgideghị nʼọnọdụ e nyere ha, kama ha si nʼebe obibi ha gbapụ. O jirila igwe kee ha agbụ ebighị ebi, debe ha nʼọchịchịrị nʼime ala, ebe ha ga-anọ ruo ụbọchị ikpe ahụ dị egwu.
7 Likewise Sodom, Gomorrah, and the nearby towns, given to sexual sin and pursuit of unnatural flesh, stand as an example, suffering the punishment of eternal fire. Otu a kwa, Sọdọm na Gọmọra na obodo niile gbara ha gburugburu, bụ ndị nyefere onwe ha na ndụ ịkwa iko nakwa omume ibi ndụ ọjọọ dị iche iche nke anụ ahụ, bụ ihe ịdọ aka na ntị nye ndị mmadụ site nʼahụhụ ha tara nʼihi mmehie nʼime ọkụ ebighị ebi.
8 Yet these dreamers likewise pollute their flesh, reject authority, and insult glorious ones. Nʼụzọ dị otu a kwa, ndị a na-emerụ anụ ahụ ha nʼirọ nrọ ha, na-ajụkwa ike ọchịchị niile, ma na-ekwulukwa ndị ahụ jupụtara nʼebube nke anya na-adịghị ahụ.
9 But Michael the archangel, contending with the devil, argued about Moses' body, not daring to bring an insulting judgment against him, but said, "May our Father rebuke you." Ma Maikel onyeisi ndị mmụọ ozi, mgbe o guzogidere ekwensu na-arụrịtakwa ụka banyere ozu Mosis, ya onwe ya enweghị anya ike ịma ya ikpe nʼihi okwu nkwulu, kama ọ sịrị, “Ka Onyenwe anyị baara gị mba.”
10 But these people insult whatever they don't understand; what they do understand by instinct, like unreasoning animals, destroys them. Ma ndị a na-ekwulu ihe niile ọbụla ha na-aghọtaghị. Dịka ụmụ anụmanụ a na-azụghị azụ, ha na-eme ihe ọbụla dị ha mma nʼanya si otu a na-ala onwe ha nʼiyi.
11 Woe to them! They took Cain's path, rushed for pay into Balaam's error, and died in Korah's revolt. Ahụhụ ga-adịrị ha, nʼihi na ha soro nzọ ụkwụ Ken, nyefee onwe ha na ndahie Belam nʼihi ihe nrite nʼuru, ma laa nʼiyi na nnupu isi Kora.
12 These are hidden reefs at your love feasts, feasting with you without fear, feeding only themselves—dry clouds blown by wind, fruitless autumn trees, twice dead, uprooted. Ndị a bụ ihe ntụpọ nʼetiti unu nʼoge mmemme oriri ịhụnanya unu, ha na-eso unu na-erikọ nri na-atụghị egwu ọbụla. Ha bụ ndị na-elekọta naanị onwe ha. Ha dị ka igwe ojii nke na-adịghị ezo mmiri, nke ifufe na-ebugharị. Ha bụ osisi a na-ahụ nʼoge ọkọchị nke na-adịghị amị mkpụrụ, nke e si na mgbọrọgwụ ya hoputa, nke nwụrụ anwụ ugboro abụọ.
13 Wild waves of the sea, foaming up their own shame; wandering stars, for whom deepest darkness is kept forever. Ha bụ ebili mmiri na-amagharị nʼosimiri, nke na-asọpụta ihere ha dịka ụfụfụ, kpakpando na-awagharị awagharị, bụ ndị nke a kwadooro ebe kachasị ịgba ọchịchịrị ruo ebighị ebi.
14 Enoch, the seventh from Adam, prophesied about these also: "Look, our Lord Jesus came with ten thousands of his holy ones, Ọ bụ nʼihi ihe ndị a ka Enọk, onye bụ agbụrụ nke asaa site nʼAdam buru nʼamụma banyere ha sị, “Lee! Onyenwe anyị na-abịa, ya na puku kwụrụ puku ndị nsọ ya.
15 to execute judgment on all and to convict every person of all the ungodly deeds they have committed in such an ungodly way, and of all the harsh things that ungodly sinners have spoken against him." Ọ na-abịa ikpe mmadụ niile ikpe, na ịtụ ha niile mmehie ajọ omume niile ha nʼanya, bụ nke ha mere nʼụzọ na-ezighị ezi. Tinyere okwu ọjọọ niile nke ndị mmehie ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke kwuru megide ya.”
16 These grumble and complain, chasing their own desires; their mouths boast, and they flatter people for gain. Ndị a bụ ndị na-atamu ntamu oge niile, ndị o nweghị ihe ọbụla na-adị ha mma. Ndị na-agbaso agụ ihe ọjọọ niile nke anụ ahụ ha chọrọ. Ha na-anya isi banyere onwe ha, na-aja ndị ọzọ mma; ka ha nwee ike nweta ihe ha na-achọ nʼaka ha.
17 But you, beloved, remember what our Lord Jesus Christ's apostles said beforehand. Ma unu, ndị m hụrụ nʼanya, chetanụ ihe ndị ozi Onyenwe anyị Jisọs Kraịst kwuru na ha ga-emezu.
18 How they told you: "In the last time there will be mockers, following their own godless desires." Nʼihi na ha sịrị unu, “Nʼọgwụgwụ oge ahụ, ndị na-eji ihe niile na-emere ihe ọchị ga-adị. Ndị na-agbaso agụ ihe ọjọọ niile nke anụ ahụ ha chọrọ.
19 These are the ones who cause divisions, worldly people, devoid of the Spirit. Ọ bụ ndị anụ ahụ ha na-achị, ndị na-enweghị Mmụọ Nsọ nʼime ha, bụ ndị na-eweta nkewa nʼetiti unu.”
20 But you, beloved, building yourselves up in your most holy faith and praying in the Holy Spirit. Ma unu, ndị m hụrụ nʼanya, nọgidenụ na-ewuli onwe unu elu na ntọala okwukwe unu dịkarịsịrị nsọ. Na-ekpekwanụ ekpere nʼime Mmụọ Nsọ.
21 Keep yourselves in the love of our Father, waiting for the mercy of our Lord Jesus Christ, leading to eternal life. Doonụ onwe unu nʼokpuru ịhụnanya Chineke, dịka unu na-echere ebere Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nke na-eduba na ndụ ebighị ebi.
22 And have mercy on those who doubt; Gosinụ ụfọdụ ndị na-enwe obi abụọ ebere.
23 save some by seizing them from the fire; show others mercy in fear, hating even the garment stained by their sin. Zọpụtanụ ndị ọzọ site nʼịgụpụta ha nʼọkụ. Nʼebe ndị ọzọ nọ gosinụ ha obi ebere, kama jirinụ ịtụ egwu mee nke a, kpọọnụ ọ bụladị uwe nke anụ ahụ mmehie merụrụ asị.
24 Now to him able to keep you from stumbling and set you blameless before his glory with great joy, Ugbu a, nye onye ahụ pụrụ ichebe unu, ka unu ghara ịda, onye pụrụ ịkpọbata unu nʼihu ya dị ebube nʼọnọdụ enweghị ntụpọ ọbụla nʼoke ọṅụ
25 to our Father alone, our Savior, through Jesus Christ our Lord, be glory, majesty, dominion, and authority, before all time and now and forever. Amen. ka otuto, na ịdị ukwuu, na ike, na ikike ọchịchị; dịrị Onye naanị ya bụ Chineke, Onye nzọpụta anyị, site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị, tupu nʼọgbọ niile ebido, ka ọ dịrị ya ugbu a, na mgbe niile ebighị ebi. Amen.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]