Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

3 John 1 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 The elder, to the beloved Gaius, whom I love in truth. Ọ bụ okenye ahụ, Na-edegara Gaiọs, onye ahụrụ nʼanya akwụkwọ a, bụ onye m hụrụ nʼanya nʼeziokwu.
2 Beloved, I pray you prosper in every way and stay healthy, as your soul prospers. Onye m hụrụ nʼanya, ekpere m bụ na ahụ ga-esi gị ike, ka ihe na-agara gị nke ọma, dịka ọ na-agara mkpụrụobi gị nke ọma.
3 I rejoiced greatly when brothers arrived and testified about your faithfulness to the truth—for you truly are walking in it. Aṅụrịrị m ọṅụ nke ukwu, mgbe ụfọdụ ụmụnna bịara gbaa ama banyere ikwesi ntụkwasị obi gị nye eziokwu, na otu i si nọgide na-agbaso eziokwu ahụ.
4 I have no greater joy than this: to hear that my children are walking in the truth. O nweghị ihe na-enye m ọṅụ karịa ịnụ na ụmụ m na-agbaso eziokwu.
5 Beloved, you act faithfully in all you do for the brothers, even strangers. Onye m hụrụ nʼanya, i kwesiri ntụkwasị obi nʼihe ọbụla nke ị na-emere ụmụnna, ọ bụ ezie na ha bụ ọbịa nye gị.
6 They testified to your love before the church. Send them on in a way worthy of our Father. Ha akọọlara nzukọ banyere ịhụnanya gị. Biko, mgbe ha na-apụ, nyekwara ha aka nʼije ha nʼụzọ ga-enye Chineke otuto.
7 For they went out for the sake of the Name, accepting nothing from the Gentiles. Ọ bụ nʼihi aha ahụ ka ha biliri ije, na-anaraghị enyemaka ọbụla site nʼaka ndị na-ekweghị ekwe.
8 Therefore we ought to support such people, so that we may be fellow workers for the truth. Nke a mere o ji kwesi ekwesi na anyị ga-elekọta ndị dị otu a anya ka anyị bụrụ ndị so ha na-ejikọta aka nʼotu nʼọrụ eziokwu ahụ.
9 I wrote something to the church, but Diotrephes, who loves being first among them, does not receive us. Edere m akwụkwọ ozi zigara nzukọ ahụ, ma Diotrefis onye ọ na-atọ ụtọ ịbụ onye mbụ, anabataghị anyị nke ọma.
10 So if I come, I'll expose what he's doing—slandering us with malicious words. Not satisfied with that, he refuses to welcome the brothers, stops those who want to, and throws them out of the church. Ya mere, ọ bụrụ na m abịa, aga m eme ka ihe niile ọ na-eme na ọtụtụ ihe niile ọ na-ekwu megide anyị pụta ìhè. Ọ bụghị naanị na afọ ejughi ya nʼihi ihe ndị a niile, ọ jụrụ ịnabata ndị ụmụnna, ma na-egbochi ndị ọzọ chọrọ ịnabata ha ka ha ghara ime otu ahụ. Ọ na-achụpụkwa ha site nʼụlọ nzukọ.
11 Beloved, don't imitate evil, but good. Whoever does good is from our Father; whoever does evil hasn't seen our Father. Onye m hụrụ nʼanya, eṅomila ihe dị njọ kama ṅomie ihe dị mma. Onye ọbụla na-eme ezi ihe na-egosi na o si na Chineke. Onye ọ bụlakwa na-eme ajọ ihe ahụbeghị Chineke anya.
12 All speak well of Demetrius, and so does the truth. We testify too, and you know our testimony is true. Onye ọbụla na-agba ezi ama banyere Dimitriọs ọ bụladị eziokwu ahụ nʼonwe ya. Anyị na-ekwukwa ezi ihe banyere ya. Ị makwaara na ọ bụ ezi ama ka anyị na-agba.
13 I had much to write to you, but I would rather not write with pen and ink. Enwere m ọtụtụ ihe m chọrọ idere gị nʼakwụkwọ, ma achọghị m iji mkpisi odee na inki dee ha.
14 I hope to see you soon, and we will talk face to face. Ọ bụ olileanya m ịbịa ịhụ gị nʼoge na-adịghị anya. Mgbe ahụ anyị ga-anọdụ ala kwuo ihe niile nʼihu nʼihu.
15 Peace to you. The friends send their greetings. Greet each of the friends by name. Ka udo dịrị gị. Ndị enyi niile nọ nʼebe a na-ekele gị. Kelekwa ndị enyi niile nọ nʼebe ahụ nʼaha nʼaha.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]