Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Genesis 40 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 After these things, the king of Egypt's cupbearer and baker sinned against their lord, the king of Egypt. Mgbe ụfọdụ oge gasịrị, onye na-ebu iko ihe ọṅụṅụ eze Ijipt na onye na-esiri ya nri mehiere megide nna ha ukwu, eze Ijipt.
2 Pharaoh was furious with his two officials, the chief cupbearer and the chief baker. Nʼihi ya, Fero were iwe megide ndị ozi ya abụọ ndị a, onyeisi ndị na-ebu iko ya na onye na-esiri ya nri.
3 He put them in custody in the guard captain's house, the prison where Joseph was held. O tinyere ha na nga, nʼụlọ mkpọrọ dị nʼụlọ onyeisi ndị nche, ebe ahụ a tụbara Josef.
4 The captain of the guard assigned Joseph to serve them; they remained in custody for some days. Onyeisi ndị nche mere Josef onye na-elekọta ha. Ha nọrọ nʼụlọ mkpọrọ ọtụtụ ụbọchị.
5 Then both of them, the cupbearer and baker of Egypt's king, imprisoned in the prison, each dreamed a dream in one night, each dream with its own meaning. Ha abụọ, onye ahụ na-esiri eze nri, na onye na-ebu iko eze Ijipt, rọrọ nrọ nʼotu abalị. Nrọ nke onye ọ bụla nwere nkọwa nke ya.
6 When Joseph came to them in the morning, he saw that they were troubled. Mgbe chi bọrọ, Josef bịakwutere ha hụ na ihu ha gbarụrụ agbarụ.
7 He asked Pharaoh's officials with him in custody in his master's house, "Why do you look downcast today?" Nʼihi ya, ọ jụrụ ndị ozi Fero ndị a ha na ya nọ nʼụlọ mkpọrọ dị nʼụlọ nna ya ukwu sị ha, “Gịnị mere ihu unu ji gbarụọ taa?”
8 They told him, "We each had a dream, with no one to interpret it." Joseph replied, "Don't interpretations belong to our Father? Please tell them to me." Ha zara sị ya, “Anyị rọrọ nrọ ọjọọ, ma onye nkọwa ya adịghị.” Josef sịrị ha, “Ọ bụghị Chineke nwee ike ịkọwa nrọ? Kọọrọnụ m ha.”
9 The chief cupbearer told Joseph his dream: "In my dream a vine stood before me. Onyeisi ndị na-ebu iko kọọrọ Josef nrọ ya. Ọ sịrị ya, “Arọrọ m nrọ hụ osisi vaịnị nʼihu m.
10 The vine had three branches; as it sprouted, its blossoms opened, and the clusters ripened into grapes. Osisi vaịnị a nwere alaka atọ. Mgbe m nọ na-ele anya, osisi vaịnị ahụ mara ifuru, mịpụta mkpụrụ nʼụyọkọ nʼụyọkọ, ha chakwaa.
11 Pharaoh's cup was in my hand; I took the grapes, squeezed them into Pharaoh's cup, and put the cup in Pharaoh's hand." Ebe ọ bụ nʼiko Fero dị m nʼaka, a ghọọrọ m mkpụrụ vaịnị ndị a, pịpụta mmiri ha pịnye nʼime iko mmanya Fero, bunye ya ka ọ ṅụọ.”
12 Then Joseph said to him, "This is its interpretation: the three branches are three days. Josef sịrị ya, “Nke a bụ ihe nrọ gị pụtara. Alaka atọ ahụ bụ abalị atọ.
13 In three days Pharaoh will lift up your head, restore you to your position, and you will put Pharaoh's cup in his hand, as before, when you were his cupbearer. Nʼime abalị atọ Fero ga-akpọpụta gị, mee ka i nwere onwe gị. Fero ga-enyeghachikwa gị ọrụ gị. Ị ga-etinyekwa Fero iko ya nʼaka dịka i si eme na mbụ mgbe ị bụ onye na-ebu iko ya.
14 But remember me when it's well with you; please do me kindness—mention me to Pharaoh, so he may bring me out of this house. Mgbe ihe gaara gị nke ọma, chetakwa m, ma gosi m obiọma, gwara m Fero ka o si nʼụlọ mkpọrọ a wepụta m.
15 For I was indeed kidnapped from the land of the Hebrews, and even here I've done nothing to deserve this dungeon." Ọ bụ ntọrọ ka atọọrọ m site nʼala ndị Hibru. Nʼotu aka ahụ, nʼebe a ọ dịkwaghị ihe ọjọọ ọ bụla m mere nke kwesiri ka atụnye m nʼụlọ mkpọrọ a.”
16 Seeing the interpretation was good, the chief baker said to Joseph, "I too had a dream: three baskets of white bread on my head. Mgbe onyeisi ndị na-esiri Fero nri hụrụ na nkọwa nrọ ahụ dị mma, ọ sịrị Josef, “Mụ onwe m, na nrọ m nke m, ebu m nkata achịcha atọ nʼisi.
17 The top basket held all kinds of baked goods for Pharaoh, but birds were eating them from the basket on my head." Nkata nke dị nʼelu jupụtara na achịcha dị iche iche e gheere eze, bụ Fero. Ma ụmụ nnụnụ bịara na-eri achịcha ndị ahụ dị na nkata m bụ nʼisi.”
18 Joseph replied, "This is its interpretation: the three baskets are three days. Josef zara sị ya, “Lee ihe nrọ gị pụtara. Nkata atọ ahụ bụ abalị atọ.
19 In three days Pharaoh will lift your head off you and hang you on a tree—birds will eat the flesh off you. Nʼime abalị atọ ka Fero ga-esi nʼụlọ mkpọrọ kpọpụta gị, nye iwu ka e bepụ gị isi, kwụba gị nʼelu osisi. Ụmụ nnụnụ ga-erichapụ anụ ahụ gị.”
20 On the third day, Pharaoh's birthday, he gave a feast for all his officials, and lifted the head of his chief cupbearer and the head of his chief baker among them," Nʼabalị nke atọ, site nʼụbọchị ndị a rọrọ nrọ ha, Fero mere mmemme ncheta ọmụmụ ya. Ọ kpọrọ ndị niile na-ejere ya ozi oriri. O ziri ozi ka a gaa nʼụlọ mkpọrọ kpọpụta onyeisi ndị na-ebunye ya iko ihe ọṅụṅụ na onyeisi ndị na-esiri ya nri.
21 restoring the chief cupbearer to his position, so he placed the cup in Pharaoh's hand. O nyeghachiri onyeisi ndị na-ebu iko ya ọrụ ya, weghachi ya nʼọnọdụ ya. Nwoke a bunyekwara Fero iko ya dịka o si eme na mbụ.
22 But he hanged the chief baker, just as Joseph had interpreted to them. Ma ọ kwụgburu onyeisi ndị na-esiri ya nri, dịka Josef si kọwaa nrọ ha.
23 Yet the chief cupbearer did not remember Joseph—he forgot him. Ma onyeisi ndị ahụ na-ebu iko eze echetaghị Josef. O chefuru ya.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]