Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Genesis 39 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Joseph was brought down to Egypt; Potiphar, Pharaoh's Egyptian official and captain of the guard, bought him from the Ishmaelites who had brought him down there. A kpọọrọ Josef gaa nʼala Ijipt. Pọtifa, bụ nwoke Ijipt, otu nʼime ndịisi na-ejere Fero ozi, na onyeisi ndị agha na-eche nche zụụrụ ya site nʼaka ndị Ishmel, bụ ndị duuru ya gaa nʼebe ahụ.
2 Our Father was with Joseph; he thrived, serving in his Egyptian master's house. Onyenwe anyị nọnyeere Josef, nke mere na ihe gaara ya nke ọma nʼụlọ nna ya ukwu onye Ijipt.
3 His master saw our Father was with him, our Father making all he did succeed in his hand. Nna ya ukwu hụrụ na Onyenwe anyị nọnyeere Josef, hụkwa na Onyenwe anyị na-eme ka ihe niile o mere gaara ya nke ọma.
4 Joseph found favor with him and served him; his master put Joseph over his house, entrusting him with all he owned. Josef hụtara amara nʼihu ya, ghọọ onyeozi nke aka ya. Pọtifa mere ya onye na-elekọta ezinaụlọ ya. Nyefee ya ihe niile o nwere ka ọ bụrụ onye na-elekọta ha.
5 From when he put Joseph over his house and all he owned, our Father blessed the Egyptian's house for Joseph's sake; our Father's blessing was on all he had, house and field. Site nʼoge a, o mere ka ọ bụrụ onye na-elekọta ezinaụlọ ya na ihe niile o nwere, Onyenwe anyị gọziri ezinaụlọ onye Ijipt ahụ nʼihi Josef. Ngọzị Onyenwe anyị dịkwasịrị nʼihe niile Pọtifa nwere, ma ihe o nwere nʼụlọ ma ndị o nwere nʼubi ya.
6 Potiphar left all he owned in Joseph's care, aware of nothing except what he ate. Joseph was well-built and handsome. Ya mere, ọ hapụrụ ihe niile o nwere nʼaka Josef. Nke a mere na ọ mazighị ihe ọzọ na-eme, ma ọ bụghị nri nke ọ na-eri. Josef nʼonwe ya mara mma ahụ dịkwa mma ile anya.
7 After these things, his master's wife cast her eyes on Joseph and said, "Sleep with me." Mgbe oge nta gasịrị, nwunye Pọtifa lere Josef anya sị ya, “Bịa ka anyị abụọ dinaa.”
8 He refused, telling his master's wife, "Look, with me here, my master oversees nothing in the house; all he owns he has put in my hands. Ma Josef jụrụ. Ọ gwara nwunye nna ya ukwu sị, “Lee, nna m ukwu anaghị echegbu onwe ya banyere ihe ọbụla nʼụlọ a. O werela ihe niile o nwere nyefee m nʼaka ka m lekọta ha anya.
9 He is no greater in this house than I am; he's held back nothing from me except you, since you are his wife. How could I do this great evil and sin against our Father?" O nweghị onye ọnọdụ ya dị elu karịa nke m nʼụlọ a. O gbochighị m ihe ọbụla ma ọ bụghị gị, nʼihi na ị bụ nwunye ya. Olee otu m ga-esi mee oke ihe ọjọọ dị otu a, mee mmehie megide Chineke.”
10 Day after day she spoke to Joseph, but he refused to listen to her, to lie beside her, to be with her. Ọ bụ ezie na nwanyị a nọgidere na-enye Josef nsogbu site nʼụbọchị ruo ụbọchị ma Josef jụrụ iso ya dinaa, jụkwa ịnọnyere ya.
11 One day Joseph entered the house to do his work, with no household man inside. Otu ụbọchị, Josef batara nʼime ụlọ ịrụ ọrụ ya. O nweghị ndị ọzọ na-eje ozi nọ nʼime ụlọ nʼụbọchị ahụ.
12 She caught him by his garment, saying, "Sleep with me!" He left it in her hand and fled outside. Nwunye Pọtifa jidere Josef nʼuwe mwụda ya, rịọọ ya sị ya, “Bịa ka anyị dinaa.” Ma Josef si nʼime ụlọ ahụ gbapụ, hapụ uwe mwụda ya nʼaka nwunye Pọtifa.
13 When she saw that he had left his garment in her hand and fled outside, Mgbe nwanyị a hụrụ na Josef agbapụla, hapụ uwe ya,
14 she called the men of her household and said, "Look—he brought us a Hebrew man to mock us. He came in to me to sleep with me, and I screamed loudly. ọ kpọrọ ndị na-eje ozi nʼezinaụlọ ya sị ha, “Lee, onye Hibru a di m kpọbatara nʼụlọ a chọrọ iji anyị gwurie egwu. Ọ bịakwutere m nʼime ụlọ chọọ ka mụ na ya dinaa. E tiri m mkpu nʼolu ike.
15 When he heard me cry out, he left his garment beside me and fled outside. Mgbe ọ nụrụ ka m welitere olu m tie mkpu enyemaka m tiri, o sitere nʼime ụlọ a gbapụ, ma hapụrụ m uwe ya.”
16 She kept his garment beside her until his master came home." Nwanyị a debere uwe ahụ nʼakụkụ ya ruo mgbe nna ya ukwu lọtara nʼụlọ.
17 She told him the same story: "The Hebrew servant you brought us came to me to mock me. Mgbe ahụ, ọ gwara di ya okwu ndị a sị, “Onye ohu Hibru a ị kpọbataara anyị bakwutere m iji m gwurie egwu.
18 But when I cried out, he left his garment beside me and fled outside." Ma mgbe m welitere olu tie mkpu enyemaka o sitere nʼụlọ gbapụ hapụrụ m uwe ya.”
19 When his master heard his wife's words to him—"Your servant did these things to me"—his anger flared. Mgbe nna ya ukwu nụrụ ihe nwunye ya gwara ya sị, “Otu a ka ohu gị si meso m mmeso,” o were iwe dị ọkụ.
20 Joseph's master took him and put him in the prison holding the king's prisoners. He stayed there in the prison. Nna ukwu Josef weere ya tụnye nʼụlọ mkpọrọ, nʼebe a na-etinye ndị mkpọrọ eze Ijipt. Ma ebe ahụ Josef nọ nʼụlọ mkpọrọ,
21 But our Father was with Joseph, showing him covenant love and favor with the prison warden. Onyenwe anyị nọnyeere ya. O meere ya ebere, mekwa ka o nweta ihuọma nʼebe onyeisi ndị nche ụlọ mkpọrọ ahụ nọ.
22 The prison warden put Joseph in charge of all its prisoners; whatever was done there, he did. Onyeisi ndị na-eche ụlọ mkpọrọ mere Josef onyeisi ndị mkpọrọ niile nọ nʼime ụlọ mkpọrọ ahụ. Josef ghọrọ onye a na-ajụ otu ihe si aga nʼime ụlọ mkpọrọ ahụ.
23 The warden checked nothing in Joseph's care, since our Father was with him—whatever he did, our Father made succeed. Onyeisi ndị nche ụlọ mkpọrọ ahụ enyeghịkwa onwe ya nsogbu maka ihe ọbụla. Nʼihi na Onyenwe anyị nọnyeere Josef, mee ka ihe ọbụla ọ na-eme gaa nke ọma.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]