Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Genesis 38 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 At that time Judah left his brothers and went to a man from Adullam named Hirah. Nʼoge ahụ, Juda hapụrụ ụmụnne ya gaa binyere otu nwoke onye Adulam a na-akpọ Hira.
2 There Judah saw the daughter of a Canaanite named Shua. He married and slept with her. Nʼebe ahụ, Juda hụrụ otu nwaagbọghọ, nwa otu nwoke onye Kenan, aha ya bụ Shua. Ọ lụrụ ya ma bakwuru ya.
3 She became pregnant and gave birth to a son, and Judah named him Er. Ọ tụụrụ ime mụọ nwa nwoke, onye Juda gụrụ aha Ịa
4 She became pregnant again and gave birth to a son, and she named him Onan. Nwunye ya dịkwara ime ọzọ mụta nwa nwoke nke ya bụ nwunye ya gụrụ Onan.
5 She bore yet another son and named him Shelah; she was at Chezib when she bore him. Ọ mụkwara nwa nwoke ọzọ, onye ọ kpọrọ Shela. Ọ bụ na Kezib ka ọ mụrụ ya.
6 Judah took a wife for his firstborn son Er; her name was Tamar. Juda lụtaara Ịa, ọkpara ya, nwunye onye aha ya bụ Tama.
7 But Er, Judah's firstborn, was evil before our Father, and our Father put him to death. Ma nʼihi na Ịa, ọkpara Juda, dị njọ nʼanya Onyenwe anyị. Onyenwe anyị gburu ya.
8 Then Judah told Onan, "Sleep with your brother's wife, do your duty as her brother-in-law, and raise children for your brother." Mgbe ahụ, Juda sịrị Onan, “Bakwuru nwunye nwanne gị ka ịkuchie ya, ka i si otu a wulite mkpụrụ maka nwanne gị.”
9 But Onan knew the child would not be his, so whenever he slept with his brother's wife, he spilled his seed on the ground, to give his brother no child. Onan ma na mkpụrụ a agaghị abụ nke ya. Nʼihi ya, mgbe ọbụla ọ bakwuru nwunye nwanne ya, ọ na-anyụsa mkpụrụ nwa ya nʼala, ime ka ọ ghara inye nwanne ya nwoke nwa.
10 What he did was evil in our Father's sight, so he put him to death too. Ma ihe a o mere jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị. Nʼihi ya Onyenwe anyị gbukwara ya.
11 Judah told his daughter-in-law Tamar, "Stay a widow in your father's house till my son Shelah grows up"—thinking, "He might die like his brothers." So Tamar lived in her father's house. Juda sịrị nwunye nwa ya, bụ Tama, “Laa nʼụlọ nna gị nọrọ dịka nwanyị di ya nwụrụ tutu Shela nwa m nwoke etoo.” Ma echiche ya bụ, “ka ọ ghara ịnwụ dịka ụmụnne ya.” Tama lara gaa biri nʼụlọ nna ya.
12 Long afterward, Judah's wife, Shua's daughter, died. When Judah was comforted, he and his friend Hirah the Adullamite went up to his sheepshearers at Timnah. Mgbe ọtụtụ oge gasịrị, nwunye Juda nwa Shua nwụrụ. Mgbe oge nkasiobi ya gasịrị, Juda jere Timna, ya na enyi ya Hira, onye Adulam, ilekọta ndị na-akpụchapụ igwe ewu na atụrụ ya ajị.
13 Tamar was told, "Your father-in-law is going up to Timnah to shear his sheep." A gwara Tama sị ya, “Nna di gị na-aga Timna ịkpacha atụrụ ya ajị.”
14 So she removed her widow's clothes, covered herself with a veil, wrapped up, and sat at the entrance to Enaim on the road to Timnah—for she saw that Shelah had grown up but she was not given to him as his wife. O yipụrụ uwe mkpe ya, were akwa mkpuchi kpuchie onwe ya gaa nọdụ ala nʼọnụ ụzọ ama Enayim, nke dị nʼụzọ e si aga Timna. O mere otu a nʼihi na ọ matara na Shela etoola, ma enyeghị ya ka ọ bụrụ nwunye ya.
15 When Judah saw her, he thought she was a prostitute, because she had covered her face. Mgbe Juda hụrụ ya, o chere na ọ bụ otu nwanyị akwụna, ebe ọ bụ na o kpuchiri ihu ya.
16 He turned to her by the road and said, "Let me sleep with you"—not knowing she was his daughter-in-law. She said, "What will you give me to sleep with you?" Ma ebe ọ mataghị na ọ bụ nwunye nwa ya, o jekwuru ya ebe ọ nọdụrụ ala nʼakụkụ ụzọ sị ya, “Bịa, kwere ka mụ na gị dinaa.” Tama jụrụ, “Gịnị ka ị ga-enye m ma ọ bụrụ na m kwere ka mụ na gị dinaa?”
17 He said, "I'll send you a young goat from the flock." She said, "Will you give me a pledge until you send it?" Ọ zara, “Aga m ezitere gị otu nwa ewu site nʼigwe ewu na atụrụ m.” Ọ jụrụ, “Ị ga-enye m ihe akaebe ruo mgbe ị ga-ezite ya?”
18 He said, "What pledge should I give you?" She said, "Your seal, its cord, and the staff in your hand." He gave them to her, slept with her, and she conceived by him. Ọ sịrị, “Kedụ ihe akaebe m ga-enye gị?” Ọ zara, “Mgbaaka akara gị na eriri ya, na mkpanaka dị gị nʼaka.” O nyere ya ihe ndị a. Ọ bakwuru ya nke mere na ọ tụụrụ ime.
19 She got up and left, took off her veil, and put her widow's clothes back on. Mgbe o si nʼebe ahụ pụọ, o yipụrụ akwa ahụ o ji kpuchie ihu ya, yirikwa uwe mkpe ya.
20 Judah sent the young goat by his friend the Adullamite to get the pledge back from the woman, but he couldn't find her. Mgbe Juda zigara enyi ya onye Adulam ka ọ gaa wegara ya nwa ewu ahụ, ma nataghachi ihe ibe ahụ, ọ hụghị ya.
21 He asked the local men, "Where's the shrine prostitute who was by the road at Enaim?" They said, "No shrine prostitute has been here." Ọ jụrụ ndị ikom bi nʼebe ahụ sị, “Olee nwanyị akwụna ụlọ arụsị ahụ na-anọdụ nʼọnụ ụzọ ama Enayim?” Ha sịrị, “O nweghị nwanyị akwụna ụlọ arụsị nọrọla nʼebe a.”
22 So he returned to Judah, saying, "I could not find her, and the local men said no shrine prostitute had been there." Ya mere, ọ laghachiri gaa gwa Juda, “Ahụghị m ya. Ọzọkwa, ndị ikom ndị bi nʼebe ahụ sịrị, ‘O nweghị nwanyị akwụna ụlọ arụsị nọrọla nʼebe a.’ ”
23 Then Judah said, "Let her keep them, or we'll be mocked. I sent her this young goat, but you didn't find her." Juda zara, “Ka o jide ihe niile o ji, ma ọ bụghị otu a anyị ga-aghọ ihe ọchị. Lee, ezigarala m ya nwa ewu a, ma gị onwe gị achọtaghị ya.”
24 About three months later, Judah was told, "Your daughter-in-law Tamar has prostituted herself, and she's now pregnant from it." Judah said, "Bring her out and burn her!" Mgbe ọnwa atọ gasịrị, ozi ruru Juda ntị sị, “Tama nwunye nwa gị gbara akwụna, bịa site nʼịgba akwụna dịrị ime.” Juda sịrị, “Kpọpụtanụ ya ka akpọọ ya ọkụ.”
25 As she was brought out, she sent word to her father-in-law: "I am pregnant by the man these belong to. Please identify whose seal, cord, and staff these are." Ma mgbe ha kpọ ya na-apụta, o zigara nna di ya ozi, sị, “Ọ bụ nwoke nwee ihe ndị a tụwara m ime. Ọ sịkwara, Leruo anya ma ị ga-amata onye nwe ihe ndị a: mgbaaka akara a na eriri ya, na mkpanaka a.”
26 Judah recognized them and said, "She is more righteous than I, since I didn't give her to my son Shelah." He never slept with her again. Juda ghọtara ha, sị, “Ọ bụ onye ezi omume karịa m, ebe ọ bụ na m jụrụ ịkpọrọ ya kpọnye nwa m nwoke Shela ka ọ bụrụ nwunye ya.” O dinakwaghị ya ọzọ.
27 When the time came for her to give birth, there were twins in her womb. Mgbe oge ọmụmụ nwa ya ruru, ejima ka ahụrụ nʼakpanwa ya.
28 As she gave birth, one put out a hand. The midwife tied a scarlet thread on it: "This one came out first." Mgbe ọ na-amụ ha, otu nʼime ha sepụtara aka ya. Nwanyị na-aghọ nwa weere eriri na-acha uhie uhie kee ya na nkwoji aka kwuo sị, “Ọ bụ nke a bụ ụzọ pụta.”
29 As he drew back his hand, his brother came out, and she said, "What a breach you've made for yourself!" So the brother who came out was named Perez. Ma nwa ahụ mesịrị sekpuo aka ya, nwanne ya nke ọzọ eburu ya ụzọ pụta. Nwanyị ahụ sịrị, “Ọ bụ otu a ka ị si tikapụta?” A kpọrọ ya Perez.
30 Then his brother came out with the scarlet thread on his hand, and was named Zerah. Emesịa, nwanne ya, nke bu eriri uhie uhie ahụ na nkwoji aka pụtakwara. A kpọrọ ya Zera.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]