Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Genesis 37 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Jacob settled in the land where his father had lived as a foreigner, the land of Canaan. Jekọb bigidere nʼala Kenan, ala ahụ nna ya buru ụzọ biri nʼime ya.
2 This is Jacob's family record. Joseph, a young man of seventeen, tended the flock with his brothers, the sons of Bilhah and Zilpah, his father's wives—and brought their father a bad report about them. Nke a bụ usoro akụkọ banyere ezinaụlọ Jekọb. Josef, onye gbarala afọ iri na asaa, na-esonyere ụmụnne ya ndị ikom na-azụ igwe anụ ụlọ, ya onwe ya bụ naanị nwantakịrị na-enyere ụmụ Bilha na ụmụ Zilpa ndị nwunye nna ya aka. Ma Josef na-ewetara nna ha akụkọ maka ihe ọjọọ ha na-eme.
3 Israel loved Joseph more than all his other sons, because he was born to him in his old age, and made him a robe of many colors. Ma Izrel hụrụ Josef nʼanya karịa ụmụ ya ndị ikom ndị ọzọ niile nʼihi na Josef bụ nwa a mụụrụ ya nʼoge agadi ya. Ọ kwaara ya uwe mwụda nwere ọtụtụ agwa.
4 When his brothers saw their father loved him more than all of them, they hated him and could not speak kindly to him. Mgbe ụmụnne ya chọpụtara na nna ha hụrụ ya nʼanya karịa onye ọbụla nʼime ha, ha kpọrọ ya asị, ha adịghị agwakwa ya okwu ọma.
5 Joseph dreamed a dream and told it to his brothers, who hated him even more. Otu oge, Josef rọrọ nrọ, mgbe ọ kọọrọ ụmụnne ya nrọ a ọ rọrọ, ha kpọrọ ya asị karịa.
6 He said to them, "Listen to this dream I had: Ọ gwara ha, “Geenụ ntị na nrọ a m rọrọ.
7 Suddenly we were binding sheaves in the field, and suddenly my sheaf rose and stood upright, and suddenly your sheaves gathered around and bowed down to it." Anyị niile nọ nʼubi na-achịkọta ọka, ngwangwa ukwu ọka nke m biliri guzoro ọtọ, ebe ukwu ọka nke unu niile gbara ukwu ọka nke m gburugburu, na-akpọ isiala nye ya.”
8 His brothers said to him, "Will you really reign over us? Will you actually rule us?" So they hated him even more for his dreams and his words. Ụmụnne ya jụrụ ya, “Ị na-akọwa na ọ bụ gị ga-abụ eze anyị? Na ọ bụ gị nʼezie ga-achị anyị?” Ha kpọrọ ya asị karịa nʼihi nrọ ya na okwu ya niile.
9 He dreamed again and told his brothers, "Look, I had another dream—the sun, moon, and eleven stars were bowing down to me." Josef rọkwara nrọ ọzọ, kọkwara ụmụnne ya. Ọ sịrị, “Geenụ ntị, arọrọ m nrọ ọzọ. Ma na nrọ nke ugbu a, anyanwụ na ọnwa na kpakpando iri na otu na-akpọ isiala nye m.”
10 When he told his father and brothers, his father scolded him: "What is this dream you had? Will I, your mother, and your brothers really come and bow to the ground before you?" Ma mgbe ọ kọọrọ nna ya na ụmụnne ya nrọ a. Nna ya baara ya mba, sị, “Nrọ nke a ị rọrọ bụ nrọ gịnị? Ọ bụ ezie na anyị niile, mụ onwe m na nne gị na ụmụnne gị, ga-abịa na-akpọrọ gị isiala?”
11 His brothers were jealous of him, but his father kept the matter in mind. Ụmụnne ya kwosiri ya ekworo nʼihi ya, ma nna ya debere ihe ndị a niile nʼobi ya.
12 Now his brothers had gone to graze their father's flocks near Shechem. Ka ọ dị, ụmụnne ya gara ilekọta igwe anụ ụlọ nna ha na Shekem.
13 Israel said to Joseph, "Aren't your brothers grazing the flocks at Shechem? Come, I'll send you to them." "Here I am," he replied. Izrel sịrị Josef, “Dịka ị maara, ụmụnne gị nọ na-eche anụ ụlọ na Shekem. Bịa, aga m eziga gị nʼebe ahụ.” Josef zara sị, “Ọ dị mma.”
14 He said to him, "Go see how your brothers and the flock are doing, and bring me word." So he sent him from the Valley of Hebron, and Joseph came to Shechem. Ya mere, ọ gwara ya, “Gaa ka ị chọpụta ma ihe ọ na-agazikwara ụmụnne gị na igwe anụ ụlọ ndị ahụ nke ọma, ma weghachiri m ozi.” O sitere na Ndagwurugwu Hebrọn zipụ ya. Ọ bịaruru Shekem,
15 A man found him wandering in the fields and asked him, "What are you looking for?" ma otu nwoke hụrụ ya ka ọ na-awagharị gburugburu nʼọhịa dị nʼebe ahụ, ọ jụrụ ya, “Gịnị ka ị na-achọ?”
16 He replied, "I'm looking for my brothers. Can you tell me where they are grazing their flocks?" Ọ sịrị, “Ana m achọ ụmụnne m. Biko, ị nwere ike ịgwa m ebe ha nọ na-azụ igwe anụ ụlọ ha?”
17 "They've left here," the man said. "I heard them say, 'Let's go to Dothan.'" Joseph went after his brothers and found them at Dothan. Nwoke ahụ zara sị, “Ha esitela nʼebe a pụọ. Anụrụ m ka ha na-asị, ‘Ka anyị gaa Dọtan.’ ” Ya mere, Josef gawara Dọtan ịchọ ụmụnne ya. Ọ hụkwara ha nʼebe dị nso na Dọtan.
18 They saw him in the distance, and before he reached them, they plotted to kill him. Ma ha lepụrụ anya hụ ya ka ọ na-abịa, gbaa izu otu ha ga-esi gbuo ya.
19 "Here comes that dreamer!" they said to one another. Ha sịrịtara onwe ha, “Lee eze nrọ ahụ ka ọ na-abịa!
20 "Now come, let's kill him, throw him into one of the pits, and say a wild animal ate him. Then we'll see what becomes of his dreams." Ugbu a, bịanụ, ka anyị gbuo ya, tụba ya nʼime otu olulu ndị a. Anyị ga-asịkwa na anụ ọhịa eriela ya. Mgbe ahụ, anyị ga-ahụkwa ihe nrọ ya niile ga-abụ.”
21 Reuben heard and tried to rescue him from their hands. "Let's not take his life," he said. Ruben nụrụ ihe a, ma napụtakwa ya site nʼaka ha. Ọ sịrị, “Ka anyị hapụ igbu ya.”
22 Reuben told them, "Shed no blood—throw him into this desert cistern, but don't touch him." Reuben said this to rescue Joseph from them and take him back to his father. Ruben sịrị ha, “Ka unu hapụ ịkwafu ọbara. Kama tụnyenụ ya nʼime olulu a dị nʼọzara. Ma unu akpatụkwala ya aka.” Ma nzube ya bụ ịnapụta ya site nʼaka ha, dulaara ya nna ya.
23 When Joseph reached his brothers, they stripped off his robe—the robe of many colors he wore. Ya mere, mgbe Josef bịakwutere ụmụnne ya, ha yipụrụ ya uwe mwụda ya, uwe mwụda nwere ọtụtụ agwa o yi nʼahụ.
24 They took him and threw him into the cistern. The cistern was empty, no water in it. Ha duru ya tụnye ya nʼime olulu. Ọ bụ olulu tọgbọrọ nʼefu, nke mmiri na-adịghị nʼime ya.
25 They sat to eat, looked up, and saw an Ishmaelite caravan coming from Gilead, their camels carrying spices, balm, and myrrh, headed down to Egypt. Mgbe ha nọdụrụ ala bido iri nri, ha leliri anya ha hụ igwe ndị ahịa Ishmel si Gilead. Ịnyịnya kamel ha bu ụda na mgbaa na máá. Ọ bụkwa Ijipt ka ha bu ihe ndị a na-aga.
26 Judah told his brothers, "What do we gain if we kill our brother and hide his blood? Mgbe ahụ, Juda jụrụ ụmụnne ya, “Uru gịnị ka ọ ga-abara anyị igbu nwanne anyị, ma kpuchie ọbara ya?
27 Come, let's sell him to the Ishmaelites, not harm him ourselves—he's our brother, our own flesh." His brothers agreed. Bịanụ, ka anyị resi ya ndị Ishmel ndị a, ka aka anyị ghara nʼimetụ ya, nʼihi na nwanne anyị na otu anụ ahụ anyị ka ọ bụ.” Ụmụnne ya gere ya ntị.
28 As Midianite traders passed, his brothers lifted Joseph from the pit and sold him to the Ishmaelites for twenty silver pieces, and the Ishmaelites brought him to Egypt. Mgbe ndị ahịa Midia ahụ rutere, ha sitere nʼolulu dọpụta Josef resi ya ndị Ishmel ahụ, ndị kwụrụ ụmụnne Josef iri mkpụrụ shekel ọlaọcha abụọ. Ha duuru Josef gaa Ijipt.
29 When Reuben returned to the cistern and saw that Joseph was not there, he tore his clothes. Ruben mechara lọghachi gaa nʼolulu ahụ, ma ka ọ na-ahụghị Josef nʼime olulu a, ọ dọwara uwe ya.
30 He went back to his brothers and said, "The boy is gone! Where can I turn now?" O jekwuru ụmụnne ya sị ha, “Nwata ahụ anọkwaghị ebe ahụ! Mụ onwe m, olee ebe m ga-ala?”
31 Then they took Joseph's robe, slaughtered a goat, and dipped the robe in the blood. Ụmụnne ya gburu otu ewu were uwe Josef bịanye nʼime ọbara ya.
32 They sent the robe of many colors and brought it to their father, saying, "We found this. Examine it: is it your son's robe, or not?" Ha chịịrị uwe mwụda ahụ nwere ọtụtụ agwa jekwuru nna ha sị ya, “Anyị hụrụ uwe a nʼime ọhịa. Leruo ya anya ka ị mara maọbụ uwe mwụda nwa gị.”
33 He recognized it: "My son's robe—a dangerous animal ate him! Joseph is surely torn apart." Ọ matara na ọ bụ ya, sị, “E, nke a bụ uwe nwa m nwoke. Ajọ anụ eriela ya. Anụ ọhịa adọkasịala Josef nʼezie.”
34 Then Jacob tore his clothes, put on mourning clothes, and mourned for his son many days. Mgbe ahụ, Jekọb dọwara uwe ya, yiri akwa mkpe, ruo ụjụ ọtụtụ ụbọchị nʼihi nwa ya.
35 All his sons and daughters came to comfort him, but he refused to be comforted, saying, "No, mourning I will go down to my son in the grave." So his father wept for him. Ụmụ ya ndị ikom na ụmụ ya ndị inyom niile bịara ịkasị ya obi, ma ọ jụrụ ịnabata nkasiobi ọbụla. Ọ sịrị, “Aga m alakwuru nwa m nʼala mmụọ site nʼiru ụjụ.” Nna ya kwagidere akwa nʼihi ya.
36 Now the Midianites sold Joseph in Egypt to Potiphar, a Pharaoh official and captain of the guard. Ugbu a, ndị Midia ahụ rere Josef nʼIjipt, resi ya Pọtifa, otu nʼime ndịisi na-ejere Fero ozi, onye bụ onyeisi ndị nche Fero, bụ eze Ijipt.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]