Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Genesis 36 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 This is the family record of Esau (that is, Edom). Nke a bụ akụkọ banyere usoro agbụrụ Ịsọ, onye a na-akpọ Edọm.
2 Esau took his wives from the daughters of Canaan: Adah daughter of Elon the Hittite, and Oholibamah daughter of Anah, daughter of Zibeon the Hivite, Ịsọ lụrụ ndị inyom a site nʼala Kenan. Onye nke mbụ bụ Ada nwa Elọn, onye Het. Nke abụọ bụ Oholibama, nwa Ana, nwa nwa Zibiọn, onye Hiv.
3 and Basemath the daughter of Ishmael, the sister of Nebaioth. Onye nke atọ bụ Basemat, nwa Ishmel, onye nwanne ya nwanyị bụ Nebaiot.
4 Adah gave birth to Eliphaz for Esau, and Basemath gave birth to Reuel, Ada mụụrụ Ịsọ Elifaz, ebe Basemat mụrụ Reuel.
5 Oholibamah bore Jeush, Jalam, and Korah—Esau's sons, born to him in the land of Canaan. Oholibama mụtaara Jeush na Jalam na Kora. Ndị a bụ ụmụ Ịsọ ndị a mụtara ya nʼala Kenan.
6 Esau took his wives, sons, daughters, all his household, his livestock, all his animals, and all the property he had gained in Canaan, and moved to a land away from his brother Jacob. Emesịa, Ịsọ duuru ndị nwunye ya na ụmụ ya ndị ikom na ndị inyom, na ndị niile nọ nʼezinaụlọ ya. Ọ chịkọọrọ anụ ụlọ ya niile, na akụ niile ọ kpatara nʼala Kenan kwapụ gaa biri nʼala dị anya site nʼebe nwanne ya Jekọb nọ.
7 Their possessions were too great to live together; the land where they stayed couldn't support them both because of their livestock. Ebe ọ bụ na akụnụba ha nwere dịkarịrị ukwuu ha ibikọta ọnụ, tinyekwara na ala ebe ha bi enwezighị ike ibuli ha nʼihi anụ ụlọ niile ha nwere.
8 So Esau settled in the hill country of Seir. (Esau is Edom.). Ya mere, Ịsọ gara biri nʼala ugwu ugwu Sia, Ịsọ bụkwa Edọm.
9 These are the records of Esau, father of the Edomites, in the hill country of Seir. Nke a bụ akụkọ banyere usoro agbụrụ Ịsọ, nna obodo Edọm, nʼala ugwu ugwu Sia.
10 These are the names of Esau's sons: Eliphaz son of Adah, Esau's wife; Reuel son of Basemath, Esau's wife. Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Ịsọ mụtara. Elifaz bụ ọkpara Ada, nwunye Ịsọ. Nwanne ya bụ Reuel, nwa Basemat, nwunye Ịsọ.
11 The sons of Eliphaz were Teman, Omar, Zepho, Gatam, and Kenaz. Ụmụ Elifaz ndị ikom bụ, Teman, Ọmaa, Zefo, Gatam na Kenaz.
12 Timna, concubine of Esau's son Eliphaz, bore him Amalek. These were sons of Esau's wife Adah. Elifaz nwa Ịsọ nwere iko nwanyị aha ya bụ Timna, onye mụtaara ya Amalek. Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Ada, nwunye Ịsọ.
13 These are Reuel's sons: Nahath, Zerah, Shammah, Mizzah. These are the sons of Esau's wife Basemath. Ụmụ ndị ikom Reuel bụ, Nahat, Zera, Shama na Miza. Ndị a niile bụ ụmụ ụmụ Basemat, nwunye Ịsọ.
14 These are the sons of Esau's wife Oholibamah, daughter of Anah, daughter of Zibeon: she bore Jeush, Jalam, and Korah to Esau. Ndị a bụ ụmụ Oholibama, nwunye Ịsọ. Oholibama bụ nwa Ana na nwa nwa Zibiọn. Ọ mụtaara Ịsọ Jeush, Jalam na Kora.
15 These are the chiefs of Esau's sons. The sons of Eliphaz, Esau's firstborn: chief Teman, chief Omar, chief Zepho, chief Kenaz. Ndị a bụ ọnụmara si nʼetiti ụmụ ụmụ Ịsọ. Site nʼetiti ụmụ Elifaz, ọkpara Ịsọ, e nwere Ọnụmara Teman, ọnụmara Ọmaa, ọnụmara Zefo, ọnụmara Kenaz.
16 Chief Korah, chief Gatam, chief Amalek—these are Eliphaz's chiefs in the land of Edom; these were Adah's sons. Ọnụmara Kora, ọnụmara Gatam na ọnụmara Amalek. Ndị eze ndị a bụ ụmụ Elifaz nʼala Edọm. Ha bụ ụmụ ụmụ Ada.
17 These are the sons of Reuel, Esau's son: chief Nahath, chief Zerah, chief Shammah, chief Mizzah. These are Reuel's chiefs in the land of Edom. These are the sons of Basemath, Esau's wife. Ndị bụ ụmụ Reuel, nwa Ịsọ, e nwere ọnụmara Nahat, ọnụmara Zera, ọnụmara Shama, ọnụmara Miza. Ọnụmara ndị a bụ ụmụ Reuel nʼala Edọm. Ha bụ ụmụ Basemat, nwunye Ịsọ.
18 Sons of Esau's wife Oholibamah: chief Jeush, chief Jalam, chief Korah. These are the chiefs of Esau's wife Oholibamah, daughter of Anah. Ndị a bụ ụmụ Oholibama, nwunye Ịsọ, ọnụmara Jeush, ọnụmara Jalam, na ọnụmara Kora. Ndị a bụ ọnụmara ụmụ Oholibama nwa Ana, nwunye Ịsọ.
19 These are the sons of Esau (that is, Edom), and these are their chiefs. Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Ịsọ (ya bụ, Edọm). Ndị a bụkwa ọnụmara ha.
20 These are the sons of Seir the Horite, who lived in the land: Lotan, Shobal, Zibeon, Anah, Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Sia onye Hor, ndị bi nʼakụkụ ala ahụ: Lotan, Shobal, Zibiọn, Ana,
21 Dishon, Ezer, and Dishan—chiefs of the Horites, sons of Seir, in Edom's land. Dishọn, Eza na Dishan. Ụmụ ndị ikom Sia nʼala Edọm, ha bụ ndị ọnụmara Hor.
22 The sons of Lotan were Hori and Hemam, and Lotan's sister was Timna. Ụmụ ndị ikom Lotan bụ, Hori na Homam. Timna bụkwa nwanne nwanyị Lotan.
23 These are the sons of Shobal: Alvan, Manahath, Ebal, Shepho, and Onam. Ụmụ ndị ikom Shobal bụ, Alvan, Manahat, Ebal, Shefo na Onam.
24 These are Zibeon's sons: Aiah and Anah. This is the Anah who found hot springs in the wilderness while tending his father Zibeon's donkeys. Ụmụ ndị ikom Zibiọn mụrụ bụ Aịa na Ana. Ana bụ nwoke ahụ chọpụtara isi iyi mmiri ime ala ahụ nke mmiri dị ọkụ si nʼime ya na-asọpụta nʼọzara, mgbe ọ na-elekọta ịnyịnya ibu nna ya Zibiọn.
25 These are the children of Anah: Dishon, and Oholibamah the daughter of Anah. Ụmụ Ana bụ, Dishọn na Oholibama nwa nwanyị Ana.
26 These are the sons of Dishon: Hemdan, Eshban, Ithran, and Cheran. Ụmụ ndị ikom Dishọn bụ, Hemdan na Eshban na Itran na Keran.
27 These are the sons of Ezer: Bilhan, Zaavan, and Akan. Ụmụ ndị ikom Eza bụ, Bilhan na Zaavan na Akan.
28 These are the sons of Dishan: Uz and Aran. Ụmụ ndị ikom Dishan bụ, Uz na Aran.
29 These are the chiefs of the Horites: chief Lotan, chief Shobal, chief Zibeon, chief Anah, Ndị a bụ ndị ọnụmara Hor, ọnụmara Lotan, ọnụmara Shobal, ọnụmara Zibiọn, ọnụmara Ana,
30 chief Dishon, chief Ezer, chief Dishan—chiefs of the Horites, clan by clan, in the land of Seir. ọnụmara Dishọn, ọnụmara Eza na ọnụmara Dishan. Ndị a niile bụ ndị ọnụmara Hor dịka nkewa ha si dị nʼala Sia.
31 These are the kings who ruled in the land of Edom before any king ruled over the Israelites: Ndị a bụ ndị eze chịrị nʼEdọm tupu ndị Izrel enwee eze mbụ ha.
32 Bela the son of Beor reigned in Edom, and the name of his city was Dinhabah. Bela, nwa Beoa chịrị dịka eze nʼEdọm. Isi obodo ya bụ Dinhaba.
33 When Bela died, Jobab the son of Zerah from Bozrah reigned in his place. Mgbe Bela nwụrụ, Jobab nwa Zera onye Bozra nọchiri ya dịka eze.
34 When Jobab died, Husham from the land of the Temanites reigned in his place. Mgbe Jobab nwụrụ, Husham onye si nʼala Teman nọchiri ya dịka eze.
35 Husham died; Hadad son of Bedad, who defeated Midian in the territory of Moab, reigned in his place. His city was named Avith. Mgbe Husham nwụrụ, Hadad nwa Bedad, onye meriri ndị Midia nʼagha nʼala Moab nọchiri dịka eze. Isi obodo ya bụ Avit.
36 When Hadad died, Samlah from Masrekah reigned in his place. Mgbe Hadad nwụrụ, Samla onye Masrika nọchiri ya dịka eze.
37 When Samlah died, Shaul from Rehoboth on the Euphrates reigned in his place. Mgbe Samla nwụrụ, Shaul onye sitere na Rehobọt dị nʼakụkụ osimiri nọchiri ya dịka eze.
38 When Shaul died, Baal-hanan the son of Achbor reigned in his place. Mgbe Shaul nwụrụ, Baal-Hanan nwa Akboa nọchiri ya dịka eze.
39 When Baal-hanan son of Achbor died, Hadar reigned in his place; his city's name was Pau, and his wife's name was Mehetabel, daughter of Matred, daughter of Mezahab. Mgbe Baal-Hanan nwa Akboa nwụrụ, Heda nọchiri ya dịka eze. Aha obodo ya bụ Pau. Aha nwunye ya bụ Mehetabel, nwa Matred nwa nwa Mezahab.
40 These are Esau's chiefs, by clan, by place, by name: chief Timna, chief Alvah, chief Jetheth. Ndị a bụ ndịisi ọnụmara Ịsọ, dịka aha ha si dị, dịka ikwu ha na akụkụ ebe ha bi si dị: Timna, Alva, Jetet,
41 Chief Oholibamah, chief Elah, chief Pinon, Oholibama, Elaa, Pinon,
42 chief Kenaz, chief Teman, chief Mibzar, Kenaz, Teman, Mibza,
43 chief Magdiel, and chief Iram. These are Edom's chiefs, by their settlements in the land they held. Esau was father of the Edomites. Magdiel na Iram. Ndị a bụ ndịisi ọnụmara nʼEdọm, dịka ebe obibi ha na ala obi ha si dị. Nke a bụ ezinaụlọ Ịsọ bụkwa nna ndị Edọm.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]