Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Genesis 35 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Then our Father told Jacob, "Get up, go to Bethel, stay there, and build an altar to me, who appeared to you when you fled from your brother Esau." Chineke sịrị Jekọb, “Bilie, gaa Betel, birikwa nʼebe ahụ. Wuo ebe ịchụ aja nye Chineke, onye mere ka ị hụ ya mgbe ị na-agbanarị Ịsọ nwanne gị nwoke.”
2 Jacob said to his household and all with him, "Discard the foreign gods among you, purify yourselves, and change your clothes. Ya mere, Jekọb gwara ndị ezinaụlọ ya na ndị niile so ya sị, “Wezuganụ chi ndị ala ọzọ dị nʼetiti unu. Doonụ onwe unu ọcha, gbanweekwanụ uwe unu.
3 Let's go up to Bethel. I'll build an altar there to our Father, who answered me in my day of distress and stayed with me wherever I went." Bilienụ, ka anyị gaa Betel, ebe m ga-ewu ebe ịchụ aja nye Chineke, onye zara m oku nʼụbọchị nsogbu m, ma nọnyekwara m na njem nke m gara.”
4 They gave Jacob all the foreign gods in their hands and earrings in their ears; he hid them under Shechem's oak. Ya mere, ha nyere Jekọb chi ndị ala ọzọ niile ha ji nʼaka, na ọla niile dị ha na ntị. Jekọb chịịrị ha niile lie ha nʼokpuru osisi ook dị na Shekem.
5 They set out; terror from our Father struck the surrounding cities, so no one pursued Jacob's sons. Ha biliri ije. Egwu Chineke dakwasịrị obodo niile gbara ha gburugburu. Ọ dịghị ndị chụsoro ha.
6 Jacob came to Luz (Bethel) in Canaan, with all his people. Jekọb na ndị niile so ya rutere Luz, nke a na-akpọkwa Betel nke dị na Kenan.
7 There he built an altar, naming it El-Bethel—house of our Father—for there he revealed himself to Jacob when he fled from his brother. Jekọb wuru ebe ịchụ aja nʼebe a, kpọọ aha ebe ahụ El Betel, nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka Chineke gosiri ya onwe ya mgbe ọ na-agbanarị Ịsọ nwanne ya nwoke.
8 Deborah, Rebekah's nurse, died and was buried below Bethel under the oak, named Allon-bacuth, oak of weeping. Mgbe nke a gasịrị, Debọra, nwanyị lekọtara Ribeka mgbe ọ bụ nwantakịrị, nwụrụ. E liri ya nʼokpuru osisi ook dị na Betel. A kpọkwara ebe ahụ, “Osisi ook ebe ịkwa akwa.”
9 Our Father appeared to Jacob again, when he came from Paddan-aram, and blessed him. Chineke gosiri Jekọb onwe ya ọzọ, mgbe o sitere na Padan Aram pụta, gọziekwa ya.
10 Our Father said to him, "Your name is Jacob, but it will no longer be Jacob—your name is Israel." He named him Israel. Chineke sịrị ya, “Aha gị bụ Jekọb ma a gaghị akpọkwa gị Jekọb ọzọ, kama aha gị ga-abụ Izrel.” Ya mere ọ kpọrọ ya Izrel.
11 Our Father told him, "I am El Shaddai, your Father Almighty. Be fruitful, multiply. A nation, a company of nations, will come from you; kings will come from your body. Chineke sịrị ya, “Abụ m Chineke onye pụrụ ime ihe niile. Mụọ ọmụmụ, baakwa ụba nʼọnụọgụgụ. Otu mba na igwe mba ga-esi na gị pụta. Ndị eze ga-esitekwa gị nʼahụ pụta.
12 The land I gave Abraham and Isaac, I will give you; I will give to your offspring after you." Ala ahụ m nyere Ebraham na Aịzik ka m na-enyekwa gị. Aga m enyekwa ya ụmụ ụmụ gị ndị ga-esote gị.”
13 Then our Father went up from him in the place where he had spoken with him. Emesịa, Chineke si nʼebe ahụ ha nọ kparịtaa ụka pụọ.
14 Jacob set up a pillar where our Father had spoken with him, a pillar of stone, and he poured out a drink offering on it and poured oil on it. Jekọb wuru ogidi nkume nʼebe ahụ Chineke nọ gwa ya okwu. Ọ wụsara onyinye ihe ọṅụṅụ wụkwasịkwa mmanụ nʼelu ogidi nkume ahụ.
15 Jacob named the place where our Father had spoken with him: Bethel. Jekọb kpọrọ ebe ahụ ya na Chineke nọ kparịtaa ụka Betel.
16 They left Bethel, and while still some distance from Ephrath, Rachel went into labor—hard labor. Ha biliri ije, site na Betel. Ma mgbe ha ka nọ ebe dị anya site nʼobodo Efrat, Rechel mụrụ nwa, ma o nwere ihe mgbu ka ọ na-amụ nwa.
17 During her hard labor, the midwife told her, "Don't be afraid—this too is a son." Mgbe o sitere nʼoke ihe mgbu na-amụpụta nwa ahụ, nwanyị na-aghọ nwa gwara ya, “Atụla egwu, nʼihi na ọ bụ nwa nwoke ọzọ ka ị mụtara.”
18 As her soul was leaving her—she was dying—she named him Ben-oni, son of my sorrow; but his father called him Benjamin, son of the right hand. Ma tupu Rechel ekuo ume ikpeazụ, nʼihi na ọ na-anwụ, ọ kpọrọ aha nwa ọhụrụ ahụ Ben-Oni, ma nna ya kpọrọ ya Benjamin.
19 So Rachel died, and she was buried on the way to Ephrath (that is, Bethlehem). Rechel nwụrụ, e lie ya nʼakụkụ ụzọ gara Efrat, nke a na-akpọkwa Betlehem.
20 Jacob set a pillar on her grave—it is Rachel's grave pillar to this day. Jekọb wuru ogidi nʼelu ili ya, nke na-eguzokwa ruo taa, igosi ebe e liri Rechel.
21 Israel traveled and camped beyond Migdal-eder, the tower of the flock. Izrel malitere ije ya, tutu ruo ebe o wuru ebe izuike ya nʼala dị nʼofe ọzọ nke Migdal Eda.
22 While Israel lived in that land, Reuben went and slept with Bilhah, his father's concubine, and Israel heard. Jacob had twelve sons. Mgbe Izrel bi nʼala ahụ, Ruben gara dinakwuru Bilha, iko nwanyị nna ya. E mekwara ka Izrel nụ ihe a Ruben mere. Ụmụ ndị ikom Jekọb dị iri na abụọ.
23 The sons of Leah: Reuben, Jacob's firstborn, then Simeon, Levi, Judah, Issachar, and Zebulun. Ụmụ Lịa bụ, Ruben, ọkpara Jekọb. Simiọn, Livayị, Juda, Isaka na Zebụlọn.
24 The sons of Rachel: Joseph and Benjamin. Ụmụ Rechel bụ, Josef na Benjamin.
25 The sons of Bilhah, Rachel's maid: Dan and Naphtali. Ụmụ Bilha, odibo nwanyị Rechel bụ, Dan na Naftalị.
26 Sons of Zilpah, Leah's servant: Gad and Asher. These are Jacob's sons, born to him in Paddan-aram. Ụmụ Zilpa, odibo nwanyị Lịa bụ, Gad na Asha. Ụmụ ndị ikom ndị a ka a mụụrụ Jekọb na Padan Aram.
27 Jacob came to his father Isaac at Mamre, Kiriath-arba (Hebron), where Abraham and Isaac had lived. Nʼikpeazụ, Jekọb bịakwutere nna ya Aịzik na Mamre nke dị nso na Kiriat Arba (ebe a na-akpọ Hebrọn). Ebe ahụ ka Ebraham na Aịzik biri na mbụ.
28 Isaac lived 180 years. Nʼoge ahụ Aịzik gbara narị afọ na iri afọ asatọ.
29 Isaac breathed his last, died, and was gathered to his people—old, full of days. His sons Esau and Jacob buried him. Ọ dịkwaghị anya site nʼoge a, Aịzik nwụrụ, mgbe o mere nnọọ agadi. Ụmụ ya ndị ikom abụọ, Ịsọ na Jekọb, liri ya.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]