Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Genesis 34 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Dinah, the daughter Leah bore to Jacob, went out to see the young women of the land. Ugbu a, Daịna nwa nwanyị Lịa mụụrụ Jekọb pụrụ ileta ndị inyom ala ahụ.
2 Shechem son of Hamor the Hivite, prince of the land, saw her, seized her, lay with her, and abused her. Mgbe Shekem, nwa Hamọ onye Hiv, onye na-achị mpaghara ahụ, hụrụ ya, ọ kpọọrọ ya jiri ike ya na ya dinaa.
3 His heart clung to Dinah, daughter of Jacob—he loved the girl and spoke to her heart. Mkpụrụobi ya gara nʼebe Daịna nwa Jekọb, ọ hụrụ nwantakịrị nwanyị ahụ nʼanya, gwakwa ya okwu dị nro.
4 So Shechem said to his father Hamor, "Get me this girl as a wife." Shekem sịrị nna ya bụ Hamọ “Lụtara m nwaagbọghọ a, ka ọ bụrụ nwunye m.”
5 Jacob heard that Shechem had made his daughter Dinah unclean, but his sons were with his livestock in the field, so Jacob said nothing until they came. Mgbe Jekọb nụrụ na e merụrụ Daịna nwa ya nwanyị, nʼihi na ụmụ ya ndị ikom nọ nʼọhịa ebe ha na-azụ anụ ụlọ, ọ gbara nkịtị na-emeghị ihe ọbụla ruo mgbe ha lọtara.
6 Then Hamor, Shechem's father, went out to Jacob to speak with him. Hamọ bụ nna Shekem, pụkwuuru Jekọb ka ha kparịta ụka.
7 Jacob's sons came in from the field. When they heard, the men were deeply pained and furious—for Shechem had done a disgraceful thing in Israel, sleeping with Jacob's daughter, a thing not to be done. Ụmụ ndị ikom Jekọb si nʼọhịa na-alọta mgbe ha nụrụ ihe merenụ, iwe na ọnụma juputara ha obi nke ukwuu nʼihi na Shekem mere ihe na-eweta ihere nʼIzrel site nʼidinakwuru ada Jekọb, ihe a na-ekwesighị ime eme.
8 Hamor spoke with them: "My son Shechem longs for your daughter. Please give her to him as wife. Ma Hamọ sịrị ha, “Nwa m nwoke Shekem hụrụ nwa unu nwanyị nʼanya. Biko, kwerenụ ka ọ lụọ ya.
9 Intermarry with us—give your daughters to us, and take our daughters for yourselves. Kwerenụ ka anyị na unu na-alụrịta. Ka anyị na-alụ ụmụ ndị inyom unu, ka unu na-alụkwa ụmụ ndị inyom anyị.
10 Live with us; the land lies open to you—settle, trade, and acquire property in it." Unu nwere ike biri nʼetiti anyị. Ala a ghere oghe nye unu. Birinụ nʼime ya, na-azụkwanụ ahịa nʼime ya, nwekwanụ akụ nʼime ya nye onwe unu.”
11 Shechem said to her father and brothers, "Let me find favor in your eyes; whatever you say to me, I will give. Shekem gwara nna na ụmụnne Daịna ndị ikom sị, “Kwerenụ ka m chọta ihuọma nʼebe unu nọ, aga m enyekwa unu ihe ọbụla unu chọrọ ka m nye unu.
12 Ask me any bride-price and gift, however great—I'll pay it. Just give me the girl as my wife." Ihe ọbụla unu sị m kwụọ dịka ego akụ ọlụlụ nwunye, ya na onyinye ọbụla unu si m nye aga m enye unu. Naanị kwerenụ ka nwaagbọghọ a bụrụ nwunye m.”
13 Jacob's sons answered Shechem and his father Hamor dishonestly, because Shechem had defiled their sister Dinah. Ma ụmụ Jekọb jiri aghụghọ zaa Shekem na Hamọ nna ya mgbe ha na-agwa ha okwu, nʼihi na e merụrụ Daịna nwanne ha nwanyị.
14 They said to them, "We can't do this—give our sister to an uncircumcised man; that would disgrace us. Ha sịrị ha, “Anyị enweghị ike ime ihe a, ị kpọrọ nwanne anyị nwanyị kpọnye nwoke a na-ebighị ugwu. Nke a ga-abụrụ anyị ihe ihere.
15 We agree to this alone: if you become like us, every male of you circumcised. Anyị nwere ike ikwenye ka ọ lụọ ya ma ọ bụrụ na unu ga-adị ka anyị, ka e bie ndị nwoke unu niile ugwu.
16 We'll give you our daughters and take yours for ourselves; we'll live with you and become one people. Mgbe ahụ anyị ga-edunye unu ụmụ ndị inyom anyị, ma kpọrọkwa ụmụ ndị inyom unu dịka ndị nwunye anyị. Anyị ga-ebi nʼetiti unu, soro unu bụrụ otu ndị.
17 But if you will not listen and be circumcised, we will take our daughter and leave." Ọ bụrụ na unu agaghị ekwe ka e bie unu ugwu, anyị ga-akpọrọ nwanne anyị nwanyị laa.”
18 Their words pleased Hamor and his son Shechem. Obi tọrọ Hamọ na Shekem nwa ya nwoke ụtọ nʼihi ihe ụmụ ndị ikom Jekọb kwuru.
19 The young man didn't delay, since he delighted in Jacob's daughter—he was the most honored in his father's house. Nwokorobịa ahụ bụ onye a na-asọpụrụ karịa onye ọbụla nʼụlọ nna ya egbughị oge ime ihe ha kwuru, nʼihi na ihe banyere nwa nwanyị Jekọb dị ya mma nke ukwuu.
20 Hamor and his son Shechem came to the gate of their city and spoke to the men of their city: Emesịa, Hamọ na Shekem nwa ya nwoke gara nʼọnụ ụzọ ama nke obodo ha gwa ndị ikom obodo ha okwu, sị.
21 "These men are peaceful with us. Let them live in the land and trade in it—the land is wide enough for them. We'll take their daughters as wives and give them ours. “Ndị ikom ndị a nwere mmasị nʼebe anyị nọ. Kwerenụ ka ha biri nʼala anyị, ka ha na-agagharị kwa nʼime ya. Anyị nwere ala buru ibu nke ga-ezuru anyị na ha. Ha ga-alụ ụmụ nwanyị anyị, anyị ga-alụkwa ndị nke ha.
22 Only on this condition will the men agree to live with us as one people: that every male among us be circumcised, as they are circumcised. Ma ọ dị otu ihe ha chọrọ ka anyị mee tupu ha ekwere ibi nʼetiti anyị ka anyị na ha bụrụ otu ndị. Ọ bụ ibi ndị ikom anyị niile ugwu dịka e si bie ha ugwu.
23 Won't their livestock, property, and all their animals be ours? Just let us agree with them, and they'll live with us." Ọ bụrụ na unu chọrọ ka anụ ụlọ ha niile na akụ ha niile bụrụ nke anyị, ọ dị mma ka anyị kwenyere ha, ka ha binyere anyị.”
24 All who went out through his city's gate listened to Hamor and his son Shechem, and every male was circumcised—all who went out through his city's gate. Ndị ikom niile bịara nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ kwenyere nʼokwu Hamọ na nwa ya nwoke Shekem. E bikwara nwoke ọbụla nọ nʼobodo ahụ ugwu.
25 On the third day, while they were still in pain, two of Jacob's sons, Simeon and Levi, Dinah's brothers, each took his sword, came against the unsuspecting city, and killed every male. O ruo nʼụbọchị nke atọ, mgbe ọnya ugwu ha na-egbu ha mgbu, ụmụ ndị ikom Jekọb abụọ, Simiọn na Livayị, ụmụnne Daịna, jiri mma agha ha pụkwuru ndị bi nʼobodo ahụ na-atụghị anya na ihe dị otu a ga-eme, gbuo ndị ikom niile nọ nʼobodo ahụ.
26 They killed Hamor and his son Shechem with the sword, took Dinah from Shechem's house, and left. Ha gbukwara Hamọ na Shekem nwa ya nwoke, kpọpụta Daịna site nʼụlọ Shekem, laghachi nʼụlọ ha.
27 Jacob's sons came upon the slain and plundered the city, because the men there had defiled their sister. Mgbe ahụ ụmụ ndị ikom Jekọb niile bịakwasịrị ndị a e gburu egbu, kwakọọ ihe niile dị nʼobodo ahụ niile, nʼihi mmerụ e merụrụ nwanne ha nwanyị.
28 They took their flocks, their herds, their donkeys, and everything in the city and in the field. Ha kwakọọrọ ngwongwo niile dị nʼobodo ahụ, kpụrụkwa anụ ụlọ niile, igwe ewu na atụrụ, igwe ehi na igwe ịnyịnya ibu niile, na ihe niile dị nʼime obodo ahụ, na ihe niile dị nʼubi ndị ahụ obodo nwere.
29 They took all their wealth, all their children, and their wives captive, plundering everything in the houses. Akụ ha niile, na ndị inyom ha niile na ụmụntakịrị ha, na ihe niile dị nʼime ụlọ ha, ka ha weere dịka ihe a dọtara nʼagha.
30 Jacob said to Simeon and Levi, "You've brought trouble on me—making me stink to those living here, the Canaanites and Perizzites. My men are few; if they band together against me, they'll attack, and I'll be destroyed, I and my household." Mgbe Jekọb hụrụ ihe ụmụ ya mere, ọ kpọrọ Simiọn na Livayị sị ha, “Unu ebuterela m nsogbu mee ka m bụrụ ihe na-esi isi ọjọọ nʼetiti ndị Kenan na ndị Periz nwe ala a. Ebe anyị dị ole na ole, ọ bụrụ na ha ejikọta onwe ha ọnụ lụso m agha, ha ga-ekpochapụ mụ na ezinaụlọ m.”
31 But they said, "Should he treat our sister like a prostitute?" Ma ha zara sị ya, “O kwesiri ka o meso nwanne anyị nwanyị mmeso dịka ọ bụ akwụna?”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]