Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Genesis 33 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Jacob looked up and saw Esau coming with 400 men. So he divided the children between Leah, Rachel, and the two servants. Jekọb lepụrụ anya nʼihu, hụ Ịsọ ka ọ na-abịa, ya na narị ndị ikom anọ ndị so ya. Nʼihi ya, o kesara ụmụntakịrị ndị ahụ, nʼetiti Lịa, na Rechel na ndị odibo nwanyị ya abụọ.
2 He put the maidservants and their children first, Leah and her children after them, and Rachel and Joseph last. O mere ka ndị odibo nwanyị ya abụọ ahụ na ụmụ ha buru ụzọ, Lịa na ụmụ ya esoro nʼazụ, ebe Rechel na Josef nọ nʼazụ azụ.
3 He himself went ahead of them, bowing to the ground seven times, until he reached his brother. Ma ya onwe ya buru ụzọ na-aga nʼihu ha niile, na-akpọ isiala nye Ịsọ ugboro asaa, tutu ruo mgbe ọ bịarutere nwanne ya nwoke nso.
4 Esau ran to meet him, hugged him, threw his arms around his neck, kissed him—and they wept. Ma Ịsọ gbaara ọsọ bịakwute ya, makụọ ya, jikụọ ya aka nʼolu, sutu ya ọnụ. Ha abụọ kwara akwa.
5 When Esau looked up and saw the women and children, he asked, "Who are these with you?" Jacob said, "The children our Father has graciously given your servant." Mgbe Ịsọ lelitere anya hụ ndị inyom ndị a na ụmụntakịrị ndị ahụ. Ọ sịrị, “Ndị ole bụ ndị a gị na ha so?” Jekọb sịrị, “Ha bụ ụmụ Chineke sitere nʼamara ya nye ohu gị.”
6 Then the female servants drew near with their children, and they bowed down. Mgbe ahụ, ndị odibo nwanyị abụọ na ụmụ ha rutere nso, kpọọ isiala.
7 Leah also came forward with her children, and they bowed down; then Joseph and Rachel came forward and bowed down. Lịa na ụmụ ya bịarutekwara kpọọ isiala, nʼikpeazụ Rechel na Josef bịara kpọọkwa isiala.
8 Esau said, "Why all this company I met?" "To find favor with my lord," Jacob said. Ịsọ sịrị, “Igwe ewu na atụrụ ndị a niile m zutere nʼụzọ, gịnị ka ọ pụtara?” Jekọb zara, “Ha bụ maka ịnata ihuọma nʼaka gị, onyenwe m.”
9 But Esau said, "I have plenty, my brother; keep what is yours for yourself." Ma Ịsọ sịrị, “Nwanne m nwoke, debere onwe gị ihe i nwere, nʼihi na enwere m akụ hie nne.”
10 Jacob said, "No, please—if I've found favor in your eyes, accept my gift from my hand, for I have seen your face like seeing the face of our Father, and you've accepted me. Jekọb sịrị, “E, biko, ọ bụrụ na m achọtala ihuọma nʼanya gị, nara m onyinye ndị a. Nʼihi na ịhụ gị anya dịka ilekwasị Chineke anya nʼihu, nke ka nke, otu a i ji ihu ọcha nabata m.
11 Please take my blessing, brought to you, since our Father has favored me and I have everything." So he insisted, and he took it. Biko nara onyinye ndị ahụ e wetaara gị, nʼihi na Chineke emelara m amara. Enwekwara m ihe ga-ezuru m.” Jekọb kwagidere ya, ọ naara onyinye ndị ahụ.
12 Then Esau said, "Let us journey on our way, and I will go ahead of you." Mgbe ahụ, Ịsọ sịrị, “Bilienụ ka anyị malite ije ịlaghachi. Aga m esonyere unu.”
13 But Jacob said to him, "My lord knows the children are frail, and the flocks and herds, nursing, are in my care. If driven hard one day, all the flocks will die. Ma Jekọb sịrị ya, “Onyenwe m, ị maara na ụmụntakịrị ndị a adịghị ike, aga m ejikwa nwayọọ chịa ụmụ atụrụ ndị a na ehi ndị na-enye ụmụ ha ara. Ọ bụrụ na a chịa ha nʼike nʼime otu ụbọchị, ụmụ anụmanụ ndị a niile ga-anwụ.
14 Let my lord pass ahead of his servant; I will move slowly, at the pace of the livestock ahead of me and the pace of the children, until I reach my lord at Seir." Ya mere, ka onyenwe m buru ohu ya ụzọ na-aga, ma ka m jiri nwayọọ nwayọọ na-abịa, dịka ike igwe anụ ndị a na ụmụaka ndị a si dị. Tutu ruo mgbe m ga-ezute onyenwe m na Sia.”
15 Esau said, "Let me leave some of my people with you." Jacob replied, "Why do that? Let me find favor in my lord's eyes." Ịsọ sịrị, “Ọ bụrụ otu a, ka m hapụrụ gị ụfọdụ ndị a mụ na ha so.” Ma Jekọb sịrị, “Nʼihi gịnị kwanụ? Ka m hụta naanị ihuọma nʼanya onyenwe m.”
16 So Esau returned that day on his way to Seir. Ịsọ laghachikwara azụ na Sia nʼotu ụbọchị ahụ.
17 But Jacob traveled to Succoth, built himself a house, and made shelters for his livestock—that's why the place is called Succoth. Ma Jekọb na ezinaụlọ ya jere Sukọt, ebe o wuuru onwe ya ụlọ obibi, wuokwara anụ ụlọ ya ụlọ obibi ha. Ọ bụ nke a mere e ji kpọọ ebe ahụ Sukọt.
18 Jacob arrived safely at Shechem, a city in Canaan, coming from Paddan-aram, and camped facing the city. Mgbe Jekọb si Padan Aram lọghachi, o rutere obodo Shekem nke dị nʼala Kenan nʼudo. O mara ụlọ ikwu ya nʼihu obodo ahụ.
19 He bought the plot where he pitched his tent from the sons of Hamor, Shechem's father, for one hundred pieces of silver. Ọ zụrụ ala ebe o mara ụlọ ikwu ya nʼaka ụmụ Hamọ, nna Shekem, ọ kwụrụ narị mkpụrụ ọlaọcha maka ala ahụ.
20 There he set up an altar and called it El-Elohe-Israel—the Father of Israel. Nʼebe ahụ, o wuru ebe ịchụ aja, kpọọ aha ya El Elohe Izrel.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]