Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Genesis 32 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Jacob went on his way, and the angels of our Father met him. Jekọb nʼonwe ya hapụrụ gawa nʼihu nʼije ya. Ndị mmụọ ozi Chineke zutere ya nʼụzọ.
2 Jacob saw them and said, "This is our Father's camp!" He named that place Mahanaim. Mgbe Jekọb hụrụ ha, o kwuru sị, “Ebe a bụ ụlọ ikwu Chineke!” Ọ kpọrọ ebe ahụ, Mahanaim.
3 Jacob sent messengers ahead of him to Esau his brother in the land of Seir, the territory of Edom. Mgbe ahụ, Jekọb zipụrụ ndị ozi ka ha jee hụ Ịsọ nwanne ya nwoke nʼala Sia, nʼobodo Edọm.
4 He ordered them, "Tell my lord Esau: your servant Jacob says, I've lived with Laban and stayed until now. O ziri ha ozi sị, “Ihe a bụ ihe unu ga-agwa nna m ukwu Ịsọ, ‘Odibo gị Jekọb kwuru sị, Ọ bụ na nke Leban ka m jere kemgbe, ọ bụkwa ebe ahụ ka m nọ ruo ugbu a.
5 I own oxen, donkeys, flocks, and servants—male and female. I've sent to inform my lord, to find favor in your eyes." Enwere m ọtụtụ ehi, na ịnyịnya ibu, na igwe atụrụ na ewu, na ndị odibo ndị nwoke na ndị nwanyị. Ana m ezigara onyenwe m ozi a ka m nata ihuọma nʼebe ọ nọ.’ ”
6 The messengers returned to Jacob: "We went to your brother Esau—he's coming to meet you, 400 men with him." Mgbe ndị ozi ahụ lọghachikwutere Jekọb, ha gwara ya sị ya, “Anyị jekwuru nwanne gị nwoke Ịsọ dị ka i ziri anyị. Ugbu a, ọ na-abịa. Ọ chị narị ndị ikom anọ na-abịa izute gị.”
7 Jacob was very afraid and distressed. He split the people with him, and the flocks, herds, and camels, into two camps, Ụjọ tụrụ Jekọb nke ukwuu, obi ya jupụtakwara na nsogbu. Nʼihi nke a, o kewara ndị niile so ya ụzọ abụọ, tinyere anụ ụlọ ya, na igwe ehi ya na ịnyịnya kamel ya.
8 thinking, "If Esau reaches one camp and attacks it, the remaining camp will escape." O chere nʼobi ya sị, “Ọ bụrụ na Ịsọ alụso otu nʼime ụzọ abụọ a ọgụ, otu ụzọ fọdụrụ ga-enwe ike gbalaga.”
9 Then Jacob said, "God of my father Abraham and God of my father Isaac, my Father, who said to me, 'Return to your land and family, so I may treat you well,' Mgbe ahụ, Jekọb kpere ekpere sị, “Chineke nke nna m Ebraham, Chineke nke nna m Aịzik, Onyenwe anyị, gị onye gwara m sị, ‘Laghachi nʼala gị na nʼebe ụmụnna gị nọ, aga m eme ka ihe gaara gị nke ọma.’
10 I am too small for the least of all the covenant love and faithfulness you have shown your servant, for I crossed this Jordan with only my staff, and now I have become two camps. Ekwesighị m obi ebere na ikwesi ntụkwasị obi nke i gosiri ohu gị. Mgbe m gabigara Jọdan a, enweghị m ihe ọbụla karịa mkpanaka m, ma ugbu a, abụ m ọmụma ụlọ ikwu abụọ.
11 Rescue me, please, from my brother's hand, from Esau's hand—I fear him: he may come and strike me down, mothers with children. Zọpụta m, arịọ m gị, site nʼaka nwanne m Ịsọ, nʼihi na egwu na-atụ m na ọ ga-abịa lụso m agha, lụsokwa ndị nne a na ụmụntakịrị ha agha.
12 But you said, 'I will surely be good to you and make your descendants like the sand of the sea, too many to count.'" Ọ bụ gị kwuru sị, ‘Aga m eme ka ihe gaara gị nke ọma, meekwa ka ụmụ ụmụ gị dịrị ka aja nke dị nʼọnụ osimiri, nke mmadụ na-apụghị ịgụta ọnụ.’ ”
13 He stayed there that night, then took a gift for his brother Esau from what he had: Jekọb rahụrụ nʼebe ahụ nʼabalị ahụ. Site nʼihe niile o nwere, ọ họpụtara onyinye ọ ga-enye nwanne ya Ịsọ.
14 200 female goats and twenty male goats, 200 ewes and twenty rams, Ọ kwadoro inye ya: narị nne ewu abụọ (200), iri mkpi abụọ (20), narị nne atụrụ abụọ (200), iri ebule abụọ (20)
15 thirty nursing camels with their young, forty cows, ten bulls, twenty female donkeys, ten male donkeys. Iri nne ịnyịnya kamel atọ (30) na ụmụ ha, na iri nne ehi anọ (40), oke ehi iri (10), iri nne ịnyịnya ibu abụọ (20), oke ịnyịnya ibu iri (10).
16 He gave them to his servants, drove by drove, separately, and told his servants, "Pass ahead of me, and leave space between drove and drove." O weere onyinye ndị a niile nyefee nʼaka ndị ozi ya nʼusoro dịka ụdị ha si dị. Ọ gwara ndị na-ejere ya ozi sị ha, “Burunu ụzọ na-aga, meenụ ka ohere dị nʼetiti igwe anụ na igwe ibe ya.”
17 He ordered the first, "When Esau my brother meets you and asks you, 'Whose are you? Where are you going? Whose are these ahead of you?' O nyere onye mbụ iwu sị ha, “Mgbe Ịsọ nwanne m zutere unu jụọ unu ajụjụ sị, ‘Onye bụ nna unu ukwu? Ebee ka unu na-aga? Onye nwe anụ ụlọ ndị a niile unu chị na-aga?’
18 then say, 'They're your servant Jacob's, a gift sent to my lord Esau. Look, he himself is behind us.'" Unu ga-aza sị ya, ‘Anụ ụlọ ndị a bụ nke ohu gị Jekọb. Ha bụ onyinye e zitere onyenwe m Ịsọ, lee ka ọ na-abịa nʼazụ anyị.’ ”
19 He also commanded the second, the third, and all who followed the herds, "Say the same to Esau when you find him, Otu ozi ahụ ka Jekọb ziri onye nke abụọ na onye nke atọ, na ndị ọzọ niile chị igwe anụ ụlọ, sị ha, “Unu ga-agwa Ịsọ otu ihe ahụ mgbe unu zutere ya.
20 and you will say, 'Also, your servant Jacob is behind us.'" For he thought, "I will appease him with the gift ahead of me, then see his face; perhaps he'll accept me." Hụkwanụ na unu gwara ya sị, ‘Ohu gị Jekọb nọ nʼazụ anyị.’ ” Echiche ya bụ, “Aga m eji onyinye ndị a niile m na-ezipụrụ ya mee ka obi ya dajụọ, nke ọ ga-abụ mgbe mụ na ya zutere, ma eleghị anya, ọ ga-anabata m.”
21 So the gift passed on ahead of him, and he himself stayed that night in the camp. Mgbe o zipụchasịrị onyinye ndị ahụ niile, Jekọb rahụrụ ụra nʼụlọ ikwu ya nʼabalị ahụ.
22 That night he got up, took his two wives, two female servants, and eleven sons, and crossed the Jabbok ford. Nʼabalị ahụ, Jekọb biliri duru ndị nwunye ya abụọ na ndị odibo nwanyị ya abụọ, na ụmụ ya iri na otu, site nʼebe na-adịghị omimi nke iyi Jabọk kpọfee ha.
23 He took them and sent them across the stream, and likewise sent across everything he had. Mgbe ọ kpọfechara ha, o bufekwara ihe niile o nwere.
24 And Jacob was left alone. And a man wrestled with him until the breaking of the day. Emesịa, Jekọb lọghachiri nọdụ naanị ya. Mgbe ahụ, otu nwoke bịara gbaso ya mgba. Ha abụọ gbagidere mgba a tutu chi ebido ịbọ.
25 Seeing he could not defeat Jacob, the man touched his hip socket, and Jacob's hip was wrenched as they wrestled. Mgbe nwoke ahụ hụrụ na ọ pụghị imeri Jekọb na mgba ahụ, o tiri Jekọb aka nʼọkpụ, mee ka ọkpụ ya hịkwapụ site nʼọnọdụ ya.
26 He said, "Let me go; dawn is breaking." But Jacob said, "I won't let you go unless you bless me." Mgbe nke a mesịrị, nwoke ahụ gwara Jekọb sị ya: “Hapụ m aka ka m laa, nʼihi na chi ebidola ịbọ.” Ma Jekọb zara sị ya, “Ọ bụ naanị mgbe ị gọziri m ka m ga-ahapụ gị ka ị laa.”
27 And he said to him, "What is your name?" And he said, "Jacob." Mgbe ahụ nwoke ahụ jụrụ Jekọb ajụjụ sị ya, “Gịnị bụ aha gị?” Ọ zara sị, “Aha m bụ Jekọb.”
28 He said, "You will no longer be named Jacob, but Israel, for you have struggled with our Father and with men, and won." Nwoke ahụ zara sị ya, “Aha gị agaghị abụkwa Jekọb, kama ọ ga-abụ Izrel, nʼihi na gị na Chineke na ndị mmadụ gbara mgba, ị mmeri.”
29 Jacob asked him, "Please tell me your name." He said, "Why do you ask my name?" And he blessed him there. Jekọb sịrị, “Biko gwa m aha gị.” Ma ọ zaghachiri, “Gịnị mere ị ji ajụ aha m?” Mgbe ahụ, ọ gọziri ya nʼebe ahụ.
30 So Jacob named the place Peniel: "For I have seen our Father face to face, yet my life was saved." Jekọb kpọrọ aha ebe ahụ Peniel, nʼihi na ọ sịrị, “Ahụla m Chineke ihu na ihu, ma e chebere ndụ m.”
31 The sun rose upon him as he passed Penuel, limping because of his hip. Anyanwụ awaala mgbe Jekọb si Peniel gafee. Ma nʼihi ihe mere ya nʼọkpụ, ọ naghị agazikwa ije.
32 This is why, even now, the Israelites won't eat the thigh muscle on the hip socket—because he struck Jacob's hip socket there, at the thigh muscle. Ọ bụ ihe a mere ụmụ Izrel adịghị eri akwara anụ jikọtara ukwu anụ na ọkpụ ya ruo taa. Nʼihi na ihe ahụ mere Jekọb metụtara akwara ukwu ya.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]