Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Genesis 31 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Jacob heard Laban's sons say, "Jacob took all our father had; from what was our father's he made this wealth." Jekọb nụrụ na ụmụ ndị ikom Leban na-asị, “Jekọb ewerechaala ihe niile nna anyị nwere. O sitere nʼihe nna anyị nwere kpata akụnụba ya niile.”
2 And Jacob saw the face of Laban, and it was not toward him as before. Jekọb hụkwara na omume Leban nʼebe ọ nọ adịghịkwa otu ọ dị na mbụ.
3 Then our Father told Jacob, "Return to your fathers' land and family; I will be with you." Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị Jekọb, “Laghachi nʼala nna gị ha, lakwuru ụmụnna gị, aga m anọnyere gị.”
4 So Jacob sent and called Rachel and Leah to the field, to his flock. Ya mere, Jekọb ziri Rechel na Lịa ozi ka ha bịakwute ya nʼọhịa ebe ọ nọ na-elekọta igwe anụ ụlọ ya.
5 He told them, "I see your father's face isn't toward me as before, but the God of my father remained with me. Ọ sịrị ha, “Ahụla m na omume nna unu nʼebe m nọ adịghịkwa otu ọ dị na mbụ. Ma Chineke nna m ha nọnyeere m.
6 You know that I have served your father with all my strength. Unu maara na eji m ike m niile rụọra nna unu ọrụ.
7 Your father cheated me, changing my wages ten times, but our Father wouldn't let him harm me. Ma nna unu ghọgburu m, gbanwee ụgwọ ọrụ m ugboro iri. Otu ọ dị, Chineke ekweghị ka nna unu merụọ m ahụ.
8 If he said, 'Speckled is your wage,' the whole flock bore speckled; if he said, 'Striped is your wage,' the whole flock bore striped. Ọ bụrụ na ọ sị, ‘Ndị tụrụ agwa agwa ga-abụ ụgwọ ọrụ gị,’ mgbe ahụ, igwe anụ ụlọ niile na-amụ ụmụ na-abụ ndị tụrụ agwa. Ma ọ bụrụ na ọ sị, ‘Ndị niile nwere ntụpọ ga-abụ ụgwọ ọrụ gị,’ mgbe ahụ, igwe anụ ụlọ niile na-amụ ụmụ na-enwe ntụpọ ọcha nʼahụ ha.
9 So our Father has taken away your father's livestock and given it to me. Chineke napụrụ nna unu anụ ụlọ ya ma nye m ha.
10 I looked up in a dream during the flock's mating season and saw the male goats mounting them were streaked, speckled, and spotted. “Nʼoge ụmụ anụ ụlọ ji atụ ime, eweliri m anya hụ na nrọ na ụmụ mkpi niile na-agba igwe nne ewu bụ ụmụ mkpi ndị tụrụ agwa agwa, ndị nwere akara maọbụ ndị nwere ntụpọ ọcha nʼahụ ha.
11 The messenger of the Father said to me in a dream, 'Jacob,' and I said, 'Here I am.' Mgbe ahụ, mmụọ ozi Chineke sịrị m na nrọ, ‘Jekọb.’ Azara m sị, ‘Lee m nʼebe a.’
12 He said, 'Look up and see: all the male goats mating with the flock are streaked, spotted, speckled—for I've seen all Laban is doing to you. Ọ sịrị m, ‘Lelie anya gị elu, lee ka ị hụ na mkpi niile na-agba igwe nne ewu ndị a bụ mkpi ndị ahụ tụrụ agwa agwa, ndị nwere akara maọbụ ndị nwere ntụpọ ọcha. Nʼihi na ahụla m ihe niile Leban na-eme gị.
13 I am the Father of Bethel, where you anointed a pillar and vowed to me. Now get up, leave this land, and return to your kindred's land.'" Mụ onwe m bụ Chineke nke Betel, ebe ị wụkwasịrị mmanụ nʼogidi nkume ahụ, ebe ị kwekwara m nkwa. Ugbu a, kulie, hapụ obodo a, laghachi nʼala a nọ mụọ gị.’ ”
14 Rachel and Leah answered, "Do we still have any share or inheritance in our father's house? Rechel na Lịa zara sị ya, “Anyị ka nwere oke nʼihe nketa nʼụlọ nna anyị?
15 Doesn't he count us as foreigners? He sold us and has completely consumed our money too. Ọ bụghị dịka ndị ọbịa ka ọ gụnyeziri anyị? Nʼihi na o reela anyị, ripịakwa ụgwọ isi anyị.
16 Everything our Father took from Laban is ours and our children's. Now do all our Father told you." Nʼezie, akụ ndị ahụ Chineke napụrụ nna anyị bụ nke anyị na nke ụmụ anyị. Ya mere, mee ihe ọbụla Chineke sị gị mee.”
17 So Jacob arose and set his sons and his wives on the camels. Jekọb biliri, kukwasị ụmụ ya na ndị nwunye ya nʼelu ịnyịnya kamel,
18 He took all his livestock and all his property he had acquired, the livestock acquired in Paddan-aram, to go to Isaac his father in the land of Canaan. duru igwe anụ ụlọ ya niile, na ihe ọ kpatara na Padan Aram, lakwuru nna ya Aịzik nʼala Kenan.
19 Laban went to shear his sheep, and Rachel stole her father's household gods. Ka Leban gara ịkpachapụ ajị ụmụ atụrụ ya, Rechel zuuru arụsị ezinaụlọ nna ya.
20 And Jacob deceived Laban the Aramean by not telling him that he was fleeing. Jekọb ghọkwara Leban onye Aram aghụghọ nʼihi na ọ gwaghị ya na ọ na-agbapụ ọsọ.
21 He fled with all he had, rose, crossed the Euphrates, and set his face toward Gilead's hill country. Ya mere, o buru ihe niile o nwere gbapụ ọsọ, gbafee iyi ukwu Yufretis, chee ihu nʼala ugwu ugwu Gilead.
22 On the third day Laban was told that Jacob had fled. Abalị atọ agafeelarị tupu a gwa Leban na Jekọb agbalaala.
23 He took his relatives, chased him seven days, and caught him in Gilead's hill country. O duuru ndị ikwu ya chụọ Jekọb ọsọ abalị asaa tupu ọ chụkwute ya nʼala ugwu ugwu Gilead.
24 But our Father came to Laban the Aramean in a night dream and said, "Guard against speaking with Jacob, good or bad." Ma Chineke bịakwutere Leban onye Aram na nrọ nʼabalị sị ya, “Kpachapụ anya gị, hụ na o nweghị ihe ị gwara Jekọb, maọbụ okwu dị mma, maọbụ nke dị njọ.”
25 Laban caught Jacob, who had pitched his tent in the hills; Laban and his relatives pitched against him in Gilead's hills. Jekọb amaala ụlọ ikwu ya nʼala ugwu Gilead mgbe Leban chụkwutere ya. Leban na ndị ikwu ya makwara ụlọ ikwu nke ha nʼebe ahụ.
26 Laban said to Jacob, "What have you done? You tricked me and drove my daughters like war captives. Leban sịrị Jekọb, “Gịnị bụ ihe a i mere? Ị ghọgbuola m. I burula ụmụ m ndị inyom dịka ndị a dọtara nʼagha?
27 Why sneak off and deceive me, not telling me? I'd have sent you off with joy, songs, tambourine, lyre. Gịnị mere i ji ghọgbuo m, zoro ezo gbapụ? Gịnị mere ị gwaghị m ka m jiri ọṅụ na ịbụ abụ nke ya na ịkpọ ụbọ akwara na iti ịgba so, zilaga gị?
28 Why didn't you let me kiss my sons and daughters goodbye? Now you've acted foolishly. Gịnị mere i nyeghị m ohere ka m sutu ụmụ ụmụ m na ụmụ m ndị inyom ọnụ sị ha laa nke ọma? Omume a i mere bụ omume nzuzu.
29 I have power to harm you, but your father's God told me last night: 'Watch yourself—say nothing to Jacob, good or bad.' Enwere m ike merụọ gị ahụ ugbu a, ma Chineke nke nna gị mere ka m hụ ya anya na nrọ nʼabalị gara aga. Ọ dọrọ m aka na ntị sị m, ‘Kpachapụ anya gị hụ na o nweghị ihe ị gwara Jekọb, maọbụ okwu dị mma, maọbụ nke dị njọ.’
30 Now you've truly gone because you longed greatly for your father's house—so why steal my gods?" Ugbu a, ị na-ala nʼihi na ọ gụrụ gị agụụ ịlaghachi nʼụlọ nna gị, ma gịnị mere i ji zuru chi m?”
31 Jacob answered Laban, "I was afraid, for I thought you'd seize your daughters from me. Jekọb zara sị Leban, “Nʼihi na m tụrụ egwu, nʼihi na m chere sị na ị ga-eji ike napụ m ụmụ gị ndị inyom a.
32 Whoever you find with your gods dies. Point out what's yours before our relatives, take it." Jacob didn't know Rachel had stolen them. Ma ọ bụrụ na ị chọta onye ọbụla ji chi gị ndị a, onye ahụ ga-anwụ. Nʼihu ndị ikwu gị ndị a, chọgharịa nʼonwe gị, lee ma ị ga-achọta ihe ọbụla bụ nke gị dị m nʼaka. Ọ bụrụ na ị chọta ya, were ya.” Ma Jekọb amaghị na Rechel zuuru chi ndị ahụ.
33 Laban searched Jacob's tent, Leah's tent, and the two servants' tent, found nothing, left Leah's, and entered Rachel's tent. Ya mere, Leban bara nʼụlọ ikwu Jekọb, na nʼime ụlọ ikwu Lịa, na nʼime ụlọ ikwu ndị odibo nwanyị abụọ ya, ma o nweghị ihe ọ chọtara. O sitere nʼụlọ ikwu Lịa pụta baa nʼụlọ ikwu Rechel.
34 Rachel had taken the household idols, put them in the camel's saddle, and sat on them. Laban searched the whole tent but found nothing. Nʼoge a, Rechel ewerela arụsị ezinaụlọ ndị ahụ tinye ha nʼime akwa e ji anọkwasị nʼelu ịnyịnya kamel nọdụ ọdụ nʼelu ya. Leban chọgharịrị ebe niile nʼime ụlọ ikwu ahụ ma ọ chọtaghị arụsị ezinaụlọ ndị ahụ.
35 She told her father, "Don't be angry, my lord—I can't rise for you; I'm on my period." He searched but never found the household gods. Mgbe ahụ, Rechel gwara nna ya Leban sị, “Biko, ewela iwe nna m ukwu, nʼihi na enweghị m ike ibili ọtọ nʼihu gị. Anọ m nʼọnọdụ ndị inyom na-anọ kwa ọnwa.” Leban chọgharịrị ebe niile, ma ọ hụghị arụsị ezinaụlọ ndị ahụ.
36 Jacob got angry and quarreled with Laban. Jacob answered Laban, "What's my crime? What's my sin, that you've chased me down? Iwe were Jekọb megide Leban. O ji iwe jụọ Leban sị, “Gịnị bụ njehie m? Gịnị bụ mmehie m mere i ji si otu a na-achụsi m ike?
37 You've searched all my goods—what did you find from your household? Put it here before my relatives and yours; let them decide between us both. Ugbu a, ị chọgharịala nʼibu m niile, gịnị ka ị chọtara bụ nke gị? Wepụta ya nʼihu ndị ikwu gị na nʼihu ndị nke m, ka ha kpeere mụ na gị ikpe.
38 Twenty years I've been with you: your ewes and female goats haven't miscarried, and I haven't eaten rams from your flock. “Iri afọ abụọ ka mụ na gị nọrọ. O nweghị mgbe ime pụrụ ụmụ ewu na atụrụ gị; o nwekwaghị mgbe m riri ebule si nʼigwe anụ ụlọ gị.
39 Torn animals I never brought to you; I bore the loss myself. You demanded it from my hand, stolen by day, stolen by night. O nweghị mgbe m welataara gị anụ ụlọ nke anụ ọhịa dọgburu, kama akwụrụ m ụgwọ ha. I mekwara ka m kwụghachi gị anụ ụlọ ọbụla e zuru nʼohi, maọbụ nʼehihie, maọbụ nʼabalị.
40 There I was: by day heat consumed me, and cold by night, and sleep fled from my eyes. Nʼime oke anwụ nke ehihie ka m rụụrụ gị ọrụ. Rụọkwara gị ọrụ nʼoge oyi na-atụ, nʼabalị ụra sikwa nʼanya m pụọ.
41 Twenty years in your house—fourteen serving for your two daughters, six for your flock—and you changed my wages ten times. Otu a ka ọ dịrị m iri afọ abụọ m jeere gị ozi. Arụrụ m gị ọrụ afọ iri na anọ maka ụmụ gị ndị inyom abụọ ndị a, afọ isii ka m lekọtara igwe ewu na atụrụ gị. Ị nọkwa nʼime ihe ndị a gbanwee ụgwọ ọrụ m ugboro iri.
42 Had the God of my father, the God of Abraham, and the Fear of Isaac not been with me, you'd surely have sent me away empty-handed now. Our Father saw my suffering and my hands' labor, and warned you last night." A sị na Chineke m, Chineke Ebraham, onye ahụ a na-atụ egwu nke Aịzik, anọnyereghị m, ị gaara ezilaga m nʼaka efu, agaara m agbara aka laa. Ma Chineke ahụla ịrụsị ọrụ ike m, na nhụju anya m niile, ọ bụ ya mere o ji baara gị mba nʼabalị gara aga.”
43 Laban answered Jacob, "The daughters are mine, the children are mine, the flocks are mine—everything you see is mine. But what can I do today for my daughters, or for the children they bore? Mgbe ahụ Leban zaghachiri sị Jekọb, “Ndị inyom ndị a bụ ụmụ m. Ụmụaka ndị a bụ ụmụ m. Igwe anụ ụlọ ndị a bụ nke m. Ihe ndị a niile ị na-ahụ anya bụ nke m. Olee otu m ga-esi merụọ ụmụ m, na ụmụ ụmụ m ahụ?
44 Come, let's make a covenant, you and I; let it be a witness between you and me." Ugbu a, bịa ka anyị gbaa ndụ mụ na gị, ka ọ bụrụ ihe ama nʼetiti anyị.”
45 So Jacob took a stone and set it up as a pillar. Ya mere, Jekọb weere otu nkume guzo ya ọtọ dịka ogidi.
46 Jacob told his kin, "Gather stones." They took stones, piled a heap, and ate there by the heap. Jekọb gwakwara ndị so ya sị ha, “Tụtụkọta nkume.” Ha tụtụkọtara nkume wụsa ha nʼotu ebe mee ka ọ laa elu. Emesịa, ha nọdụrụ nʼakụkụ nkume ndị ahụ rie nri.
47 Laban called it Jegar-sahadutha, but Jacob called it Galeed. Leban kpọrọ nkume ndị ahụ Jega-Sahaduta, nʼasụsụ nke ya. Jekọb kpọrọ ya Galeed, nʼasụsụ nke ya.
48 Laban said, "This heap is a witness between you and me today." Therefore he named it Galeed, Emesịa, Leban sịrị, “Ka nkume ndị a bụrụ ihe ama nʼetiti mụ na gị taa.” Nke a mere e ji kpọọ ya Galeed.
49 and Mizpah, for he said, "God watch between me and you when we're apart. A kpọkwara ya Mizpa, nʼihi na Leban sịrị, “Ka Onyenwe anyị bụrụ onye ga-eche mụ na gị nche ịhụ na onye ọbụla nʼime anyị debere ọgbụgba ndụ a, mgbe anyị na-anọghị ibe anyị nso.
50 If you mistreat my daughters or take wives besides them, though no one else is here, God witnesses between you and me." Ọ bụrụ na i mee ụmụ m ndị inyom ihe ọjọọ, maọbụ lụọ ndị inyom ndị ọzọ tinyere ha, o nweghị onye nʼime anyị ga-amata, ma cheta na Chineke ga-abụ onyeama nʼetiti mụ na gị.”
51 Laban said to Jacob, "Look at this heap and this pillar I've set between you and me. Leban gwakwara Jekọb sị, “Lee nkume ndị a a wụsara nʼebe a na ogidi m mere ka o guzo nʼetiti mụ na gị.
52 This mound witnesses, this pillar witnesses: I won't cross this mound to you, and you won't cross this mound and pillar to me, for harm. Nkume ndị a a wụsara bụ akaebe, ogidi a bụkwa ihe ama. Agaghị m agabiga nkume ndị a a wụsara gafeeta nʼakụkụ nke gị ime gị ihe ọjọọ. Gị onwe gị agaghị agabiga nkume ndị a a wụsara na ogidi a gafeeta nʼakụkụ nke m ime m ihe ọjọọ.
53 God of Abraham and God of Nahor, the God of their father, judge between us." So Jacob swore by the Fear of his father Isaac. Ka Chineke Ebraham na Chineke Nahọ, Chineke nna ha, bụrụ onye ikpe nʼetiti mụ na gị.” Ya mere Jekọb ji onye ahụ a na-atụ egwu nke nna ya Aịzik ṅụọ iyi.
54 Jacob sacrificed on the mountain, called his relatives to eat bread; they ate bread and spent the night on the mountain. Ọ chụrụ aja nʼala ugwu ugwu ahụ, kpọọ ndị ikwu ya niile oriri. Mgbe ha richara nri, ha rahụrụ ụra nʼebe ahụ.
55 Laban rose early, kissed his grandchildren and daughters, blessed them, left, and returned home. Nʼisi ụtụtụ echi ya, Leban biliri sutu ụmụ ya ndị inyom na ụmụ ụmụ ya ọnụ. Ọ gọziri ha, hapụ ha laghachi ụlọ ha.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]