Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Genesis 30 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 When Rachel saw that she bore Jacob no children, Rachel envied her sister. She said to Jacob, "Give me children, or I will die!" Rechel hụrụ na ya amụghị nwa ọbụla nye Jekọb, o kworo ekworo megide nwanne ya nwanyị. Ya mere, ọ sịrị Jekọb, “Nye m ụmụ. Ọ bụrụ na i meghị otu a, aga m anwụ.”
2 Jacob was furious with Rachel. He said, "Am I in our Father's place, who has withheld from you the fruit of the womb?" Jekọb were iwe megide Rechel, sị ya, “Abụ m Chineke onye gbochiri gị mkpụrụ nke afọ?”
3 She said, "Here is my servant Bilhah. Go in to her, that she may bear children for me, and through her I too may build a family." Mgbe ahụ Rechel gwara Jekọb sị ya, “Lee odibo m nwanyị Bilha, bakwuru ya ka ọ mụọ nwa nʼikpere m abụọ, ka mụ onwe m site na ya bụrụkwa onye mụtara ụmụ.”
4 So she gave him Bilhah her servant as a wife, and Jacob was intimate with her. Rechel nyere Jekọb Bilha, odibo nwanyị ya, Jekọb bakwuuru ya.
5 Bilhah conceived and bore Jacob a son. Bilha tụụrụ ime mụọra Jekọb nwa nwoke.
6 Then Rachel said, "Our Father has judged me; he has also heard my voice and given me a son." Therefore she named him Dan. Nke a mere ka Rechel kwuo sị, “Chineke ekpepụtala m. Ọ nụla arịrịọ m nye m nwa nwoke.” Nʼihi nke a, Rechel gụrụ nwa ahụ Dan.
7 Bilhah, Rachel's servant, conceived again and bore Jacob a second son. Bilha, odibo nwanyị Rechel, tụụrụ ime ọzọ mụtara Jekọb nwa nwoke nke abụọ.
8 Rachel said, "I have wrestled fiercely with my sister, and I have won." So she named him Naphtali. Rechel kwuru sị, “Mgba dị ukwuu ka mụ na nwanne m nwanyị gbara, m merie.” Ọ kpọọ ya Naftalị.
9 When Leah saw that she had stopped bearing children, she took Zilpah her servant and gave her to Jacob as a wife. Lịa hụrụ na ya akwụsịla ịmụ nwa, ọ kpọọrọ Zilpa, odibo ya nwanyị kpọnye Jekọb ka ọ bụrụ nwunye ya.
10 Then Leah's servant Zilpah bore Jacob a son. Zilpa, odibo nwanyị Lịa, mụtara Jekọb nwa nwoke.
11 Leah said, "Good fortune!" So she named him Gad. Mgbe nke a mere, Lịa kwuru sị, “Nke a bụ ihuọma.” Ọ kpọrọ nwa ahụ Gad.
12 Leah's servant Zilpah bore Jacob a second son. Zilpa, odibo nwanyị Lịa mụtaara Jekọb nwa nwoke nke abụọ.
13 Leah said, "How happy I am! For women will call me happy." So she named him Asher. Mgbe ahụ Lịa kwuru sị, “Ọṅụ ejula m obi, nʼihi na ụmụ nwanyị ibe m ga-akpọ m onye ihe na-agara nke ọma.” Lịa kpọrọ nwantakịrị nwoke ahụ Asha.
14 In the days of wheat harvest Reuben went out and found mandrakes in the field and brought them to his mother Leah. Then Rachel said to Leah, "Please give me some of your son's mandrakes." Otu ụbọchị, nʼoge a na-aghọ ọka wiiti, Ruben nwa Lịa, gara nʼọhịa hụ ahịhịa a na-akpọ mandreki. Ọ kụtaara nne ya ụfọdụ nʼime ahịhịa a. Mgbe Rechel hụrụ ahịhịa a, ọ rịọrọ Lịa sị ya, “Biko nyetụ m ụfọdụ nʼime mandreki ndị a nwa gị nwoke kụtara.”
15 But Leah replied, "Wasn't it enough to take my husband? Now you'd take my son's mandrakes too?" Rachel said, "Fine—he can sleep with you tonight for your son's mandrakes." Ma Lịa zara sị ya, “O zubeere gị na ị napụrụ m di m? Ị chọkwara ịnapụ m mandreki ndị a nwa m nwoke wetaara m?” Rechel zara Lịa sị, “Ọ dị mma, ka gị na ya dinaa nʼabalị a ka ọ bụrụ ihe mgbanwo maka mandreki nwa gị nwoke.”
16 When Jacob came from the field in the evening, Leah went out to meet him and said, "You must sleep with me, for I have indeed hired you with my son's mandrakes." So he was intimate with her that night. Ya mere, mgbe Jekọb si nʼọhịa na-alọbata nʼuhuruchi ụbọchị ahụ, Lịa pụrụ izute ya, sị ya, “Ị ga-abakwute m nʼihi na m ejirila m ahịhịa mandreki nwa m nwoke m zụta gị.” Ha dinara nʼabalị ahụ.
17 And our Father listened to Leah, and she conceived and bore Jacob a fifth son. Chineke nụrụ olu Lịa, ọ tụụrụ ime mụtara Jekọb nwa nwoke nke ise.
18 Leah said, "Our Father has given me my wages because I gave my servant to my husband." So she named him Issachar. Lịa sịrị, “Chineke akwụọla m ụgwọ maka odibo m nwanyị m nyere di m.” Ya mere ọ kpọrọ aha ya Isaka.
19 Leah conceived again and bore Jacob a sixth son. Lịa tụkwaara ime ọzọ mụtara Jekọb nwa nwoke nke isii.
20 Then Leah said, "Our Father has endowed me with a good gift. Now my husband will honor me, because I have borne him six sons." So she named him Zebulun. Ugbu a Lịa kwuru sị, “Chineke enyela m ezi onyinye dị oke ọnụ. Ugbu a, di m ga-eji nkwanye ugwu leta m nʼihi na amụọrala m ya ụmụ ndị ikom isii.” Ọ kpọrọ aha ya Zebụlọn.
21 Afterward she bore a daughter and named her Dinah. Emesịa, Lịa mụrụ nwa nwanyị, kpọọ ya Daịna.
22 Then our Father remembered Rachel; he listened to her and opened her womb. Chineke chetara Rechel. Ọ nụrụ olu ya, meghee akpanwa ya.
23 She conceived and bore a son, and said, "Our Father has taken away my disgrace." Nʼihi ya, Rechel tụụrụ ime mụta nwa nwoke. Ọ sịrị, “Chineke ewepụla nkọcha dịịrị m.”
24 She named him Joseph, saying, "May our Father add to me another son." Rechel kpọrọ aha ya Josef, dị ka ọ sịrị, “Ka Onyenwe anyị nyekwa m nwa nwoke ọzọ.”
25 As soon as Rachel had borne Joseph, Jacob said to Laban, "Let me go back to my own home and country. Mgbe Rechel mụsịrị Josef, Jekọb jekwuru Leban sị ya, “Zilaga m ka m laghachi nʼebe m na ala nke m.
26 Give me my wives and my children for whom I have served you, and let me go. You know the service I have given you." Kpọnye m ndị nwunye m, ndị m ji nʼihi ha gbara gị odibo, ha na ụmụ m, ka m lakwaa. Ị maara otu m siri gbaara gị odibo. Kpọnye m ha ka m duru ha laghachi ebe m si bịa.”
27 But Laban said to him, "If I have found favor in your eyes—I have learned by divination that God has blessed me because of you." Leban sịrị Jekọb, “Ọ bụrụ na m achọtala amara nʼihu gị biko nọdụ, nʼihi na esi m nʼịgba afa chọpụta na Onyenwe anyị agọziela m nʼihi gị.”
28 He said, "Name your wages, and I will give it." Leban sịrị, “Kwuo ego ole ị chọrọ ka m kwụọ gị, aga m akwụ ya.”
29 Jacob said to him, "You yourself know how I have served you, and how well your livestock has done under my care. Jekọb zara sị Leban, “Gị onwe gị maara otu m si gbara gị odibo na ihe mere igwe anụ ụlọ gị ndị m lekọtara.
30 For you had little before I came, and it has increased greatly; our Father has blessed you wherever I turned. But now, when will I provide for my own household also?" Nʼihi na ole na ole ka i nwere mgbe m bịara, ma ugbu a, ha abaala ụba nke ukwuu. Onyenwe anyị esitela nʼụkwụ m gọzie gị. Ugbu a, kedụ mgbe m ga-arụkwanụ ọrụ nke mụ onwe m maka ezinaụlọ m?”
31 He asked, "What should I give you?" Jacob replied, "Give me nothing. If you'll do this one thing for me, I'll go back to grazing and guarding your flock. Leban jụrụ Jekọb sị, “Kedụ ihe m ga-enye gị?” Jekọb gwara ya sị, “Enyela m ihe ọbụla, kama o nwere otu ihe m chọrọ ka i mee. Ọ bụrụ na i mee ya, aga m alaghachi ilekọta igwe anụ ụlọ gị.
32 Let me pass through all your flock today, removing from it every speckled and spotted sheep and every black lamb, and the spotted and speckled among the goats, and that will be my wages. Kwere ka m jegharịa nʼetiti igwe anụ ụlọ gị, ka m họpụta site nʼetiti igwe atụrụ gị ndị niile tụrụ agwa agwa, na ụmụ atụrụ niile dị oji, na ewu niile tụrụ agwa agwa. Atụrụ na ewu ndị a niile m ga-ahọpụta ga-abụ ụgwọ ọrụ m.
33 So my honesty will testify for me later, when you come to look into my wages. Every one that is not speckled and spotted among the goats and black among the lambs, if found with me, will be counted stolen." Ezi omume m ga-azara nʼọdịnihu, mgbe ọbụla ị bịara nyochaa ụgwọ ọrụ ị kwụrụ m. Ewu ọbụla na-atụghị agwa agwa, maọbụ atụrụ ọbụla na-ejighị oji ị chọpụtara nʼetiti igwe ewu na atụrụ nke m ka a ga-agụ dị ka ihe e zuru nʼohi.”
34 Laban said, "Good! Let it be as you have said." Leban zara sị ya, “Ọ dị mma. Ya dịrị dịka i kwuru.”
35 That day Laban removed the striped and spotted male goats, all the speckled and spotted female goats—each with white on it—and every dark lamb, handing them to his sons. Nʼotu ụbọchị ahụ, ọ họpụtachara mkpi niile tụrụ agwa maọbụ ntụpọ na nne ewu niile ndị nwere tụrụ agwa maọbụ ntụpọ na nke ọbụla nwere ajị ọcha nʼahụ ya. Ọ họpụtakwara atụrụ ojii niile, nyefee ha nʼaka ụmụ ya ka ha lekọtaa ha.
36 He set a distance of three days' journey between himself and Jacob, and Jacob pastured the rest of Laban's flock. Leban jere ije abalị atọ nke kewapụrụ ha site nʼebe Jekọb nọ. Ma Jekọb nọgidere na-elekọta igwe anụ ụlọ Leban ndị ọzọ.
37 Then Jacob took fresh branches from poplar, almond, and plane trees, and peeled white streaks in them, exposing the white of the wood. Mgbe ahụ Jekọb gara gbute ngalaba osisi pọpla, na osisi alụmọnd, na osisi plenụ, kpechapụ ahụ agbụgbọ osisi ndị a, si otu a mee ka ime ime ngalaba osisi ndị a dị ọcha pụta ìhè.
38 He placed the peeled branches in the watering troughs in front of the flocks—the places where they came to drink. And since they bred when they came to drink, Ọ tọgbọrọ osisi ndị a o kpechapụtara nʼebe ewu na atụrụ ndị a na-aṅụ mmiri, ka ha cherịta ịhụ ebe igwe anụ ụlọ ndị a nọ mgbe ọbụla ha na-aṅụ mmiri. Nke a mere mgbe igwe anụ ụlọ ndị a na-enwe ekpomọkụ nke ịgba ibe ha, nʼoge ha bịara ịṅụ mmiri,
39 the flocks bred in front of the sticks and so brought forth striped, speckled, and spotted young. ọ bụ nʼihu ngalaba osisi ndị a ka ha na-anọ na-agba onwe ha. Mgbe anụ ụlọ ndị a mụrụ ụmụ, ahụ ụmụ ha na-atụ agwa agwa maọbụ nwe ntụpọ.
40 Jacob separated the lambs and turned the flock to face the striped animals and all the black ones in Laban's flock. He kept his own flocks apart and did not mix them with Laban's flock. Jekọb na-edo ụmụ igwe ewu na atụrụ ndị a nʼotu akụkụ, ma ọ na-eme ka anụ ụlọ ndị ọzọ chee ihu ha nʼanụ ụlọ Leban ndị tụrụ agwa agwa, maọbụ na-eji oji. Nʼụzọ dị otu a, ọ kewapụtaara onwe ya anụ ụlọ nke ya. O tinyekọtaghị ha nʼanụ ụlọ Leban.
41 Whenever the stronger animals were breeding, Jacob would place the branches in the troughs in sight of the flock, so they would breed among the branches, Mgbe ọbụla nne anụ ụlọ ndị ahụ siri ike nọ nʼọnọdụ ịtụrụ ime, Jekọb na-edobe ngalaba osisi ndị ahụ nʼakụkụ ebe ha na-aṅụ mmiri nʼihu ha, ka ha nọrọ nʼebe ahụ gbaa onwe ha.
42 but for the weaker animals he would not lay them there. So the weaker animals went to Laban, and the stronger ones to Jacob. Ma ọ bụrụ na anụ ụlọ ndị ahụ adịghị ike, Jekọb anaghị edebe osisi ndị a nʼihu ha. Ya mere, igwe ewu na atụrụ ndị na-esighị ike gaara Leban. Ma ndị siri ike gaara Jekọb.
43 So the man became exceedingly rich and had large flocks, female servants and male servants, and camels and donkeys. Site nʼụzọ dị otu a, Jekọb ghọrọ onye nwere akụ hie nne. O nwekwara ọtụtụ igwe anụ ụlọ na ọtụtụ ndị na-ejere ya ozi nwoke na nwanyị, na ọtụtụ ịnyịnya kamel, na ọtụtụ ịnyịnya ibu ndị ọzọ.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]