Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Genesis 41 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 After two full years had passed, Pharaoh had a dream: he was standing beside the Nile. O ruo mgbe afọ abụọ gasịrị, Fero rọrọ nrọ hụ onwe ya ka o guzo nʼakụkụ mmiri Naịl.
2 Seven cows, sleek and fat, came up from the Nile and grazed among the reeds. Nʼebe ahụ, ọ hụrụ ehi asaa ndị si nʼosimiri Naịl na-apụta. Ehi ndị a buru ibu, maa mma. Ahụ ha na-akwọ mụrụmụrụ. Ha pụtara, bido ịta nri nʼetiti ahịhịa riidi.
3 Seven other cows, ugly and bony, came up after them from the Nile and stood beside them on the Nile's bank. Nʼatụfughị oge, ehi asaa ọzọ soro ha nʼazụ sikwa nʼosimiri Naịl na-apụta. Ma ehi ndị a tara ahụ nke ukwuu. Ha bụ nnọọ ọkpụkpụ ọkpụkpụ, jọọ njọ ile anya. Ha bịara guzo nʼakụkụ ehi ndị ahụ buru ibu.
4 Ugly, thin cows ate the seven fine, fat cows, and Pharaoh woke up. Mgbe ahụ, ehi ndị a bụ naanị ọkpụkpụ ọkpụkpụ bịara richapụ ehi ndị ahụ buru ibu. Mgbe nke a mere Fero kwolitere.
5 He fell asleep again and had a second dream: seven heads of grain, plump and good, grew on one stalk. Emesịa, Fero rahụkwara ụra ọzọ, rọọ nrọ nke ugboro abụọ, hụ ogbe ọka asaa ndị mịrị nʼotu ukwu ọka. Ogbe ọka ndị a buru ibu maa ezi mma.
6 Then after them, seven heads of grain sprouted up—thin and scorched by the east wind. Emesịa, ọ hụkwara ogbe ọka asaa ọzọ ka ha mịkwara nʼotu ukwu ọka ahụ. Ma ndị a ọ hụrụ kpọnwụsịrị akpọnwụ, fịkpọkwa afịkpọ. Ọ bụ ikuku si nʼọwụwa anyanwụ mere ka ha kpọnwụọ.
7 The thin heads swallowed the seven plump, full heads. Then Pharaoh woke up—it had been a dream. Ogbe ọka ndị a fịkpọrọ afịkpọ loro ogbe ọka asaa ndị ahụ buru ibu. Fero kwolitere hụ na ihe ndị a bụ nrọ.
8 In the morning his spirit was troubled; he sent and called all Egypt's magicians and all its wise men. Pharaoh told them his dreams, but none could interpret them for him. Mgbe chi bọrọ, o nweghị udo na mmụọ ya. O ziri ozi kpọkọta ndị majiki niile, na ndị ọkachamara niile nke Ijipt. Fero kọọrọ ha ihe ọ rọrọ na nrọ. Ma ọ dịghị onye nwere ike ịkọwara ya ihe nrọ ya pụtara.
9 Then the chief cupbearer said to Pharaoh, "Today I am reminded of my offenses. Ma nʼoge ahụ, onyeisi ndị na-ebu iko jekwuuru Fero gwa ya sị, “Taa ka m chetara mmehie m.
10 Pharaoh was angry with his servants and put me in custody in the guard captain's house, with the chief baker. Oge ahụ Fero were iwe megide ndị na-ejere ya ozi, o tinyere mụ na onyeisi ndị na-esi nri nʼụlọ mkpọrọ nke dị nʼebe onyeisi ndị nche eze bi.
11 I and he each dreamed the same night, each dream with its own meaning. Onye ọbụla nʼime anyị abụọ rọrọ nrọ nʼotu abalị, nrọ ọbụla nwekwara nkọwa nke ya.
12 A young Hebrew, servant of the guard captain, was with us. We told him our dreams, and he interpreted each according to its own meaning. O nwere nwokorobịa onye Hibru anyị na ya nọ nʼụlọ mkpọrọ nʼoge ahụ. Ọ bụ ohu onyeisi ndị nche eze. Anyị kọọrọ ya nrọ anyị rọrọ. Ọ kọwakwaara anyị ihe nrọ anyị pụtara nye onye ọbụla nkọwa nke nrọ ya.
13 Just as he interpreted for us, it happened: I was restored to my position, the other was hanged." Ihe niile mere dịka o si kọwara anyị. E nyeghachiri m ọnọdụ m, ma kwụba onye nke ọzọ nʼosisi.”
14 Pharaoh sent for Joseph, and they rushed him from the dungeon. He shaved, changed his clothes, and came before Pharaoh. Ya mere Fero ziri ozi ka a kpọọ Josef. E mere ngwangwa wepụta ya site nʼụlọ mkpọrọ ahụ. Mgbe ọ kpụchara afụọnụ ya, gbanwee uwe ya, ọ bịakwara nʼihu Fero.
15 Pharaoh said to Joseph, "I've had a dream no one can interpret. I've heard about you that when you hear a dream, you can interpret it." Fero gwara Josef sị, “Arọrọ m nrọ ma o nweghị onye ọbụla nwere ike ịkọwara m ihe nrọ m rọrọ pụtara. Ma anụla m na a kọọrọ gị nrọ a rọrọ, i nwere ike ịkọwa ihe nrọ ahụ pụtara.”
16 "I can't do that on my own," Joseph replied. "Our Father will give Pharaoh a favorable answer." Josef zara sị ya, “Enweghị m ike ịkọwa nrọ nʼike aka m. Ma Chineke ga-enye Fero ọsịsa udo dịka ọ chọrọ.”
17 Then Pharaoh said to Joseph, "In my dream I was standing on the bank of the Nile. Mgbe ahụ, Fero malitere ịkọwara Josef nrọ ya. O kwuru sị, “Eguzoro m nʼakụkụ osimiri Naịl na nrọ m.
18 Seven fat, sleek cows came up from the Nile and grazed among the reeds. Mgbe ahụ, ahụrụ m ehi asaa si na mmiri ahụ pụta. Ehi ndị a mara abụba, ma gbaa agba. Ha bidokwara ịta nri nʼetiti ahịhịa riidi.
19 Then seven other cows came up after them—scrawny, very ugly, thin-fleshed—the like I had never seen in all the land of Egypt. Emesịa, a hụrụ m ehi asaa ọzọ ka ha sikwa nʼosimiri ahụ pụta. Ehi ndị a ejighị ahụ. Ha bụ ọkpụkpụ ọkpụkpụ, jọọ njọ ile anya. Nʼezie, ahụtụbeghị m ụdị ehi dị otu a nʼala Ijipt niile.
20 The gaunt, ugly cows ate the first seven fat cows. Ehi asaa ndị a jọrọ njọ riri ehi ndị ahụ buru ibu, bụ ndị bu ha ụzọ si nʼosimiri ahụ pụta.
21 Even after eating them, no one could tell, for they still looked as bad as before. Then I woke up. Ma mgbe ha risiri ehi ndị a, nri ahụ emeghị ka ụdịdị ha gbanwee. Ha dịkwa otu ha dị. Mgbe m hụsịrị ihe a, etetara m nʼụra.
22 In my dream I saw seven heads of grain grow on one stalk, full and good. “Mgbe m rọrọ nrọ ọzọ, a hụrụ m ogbe ọka asaa nke mịrị nʼotu ukwu ọka. Ọka asaa ndị a buru ibu, dị mma ile anya.
23 And after them sprouted seven heads of grain—withered, thin, and scorched by the east wind. Ogbe ọka asaa ọzọ mịkwara nʼelu ukwu ọka ahụ, ma ndị a kpọnwụrụ akpọnwụ, fịkpọkwa afịkpọ nʼihi nʼikuku si nʼọwụwa anyanwụ chakpọrọ ha.
24 The thin heads swallowed the seven good heads. I told the magicians, but none could explain it to me." Ma ọka ndị a fịkpọrọ afịkpọ lodara ọka asaa ndị ahụ mara mma. Akọọlara m ndị majiki ihe ndị a, ma ọ dịghị onye nʼime ha nwere ike ịkọwara m ihe nrọ ndị a pụtara.”
25 Joseph said to Pharaoh, "Pharaoh's dreams are one: our Father has revealed to Pharaoh what he's about to do. Mgbe ahụ, Josef sịrị Fero, “Nrọ abụọ Fero rọrọ pụtara otu ihe. Chineke esitela na nrọ ndị a gwa Fero ihe ọ na-aga ime.
26 The seven good cows are seven years, and the seven good heads of grain are seven years—it is one dream. Ehi asaa ndị ahụ buru ibu bụ afọ asaa. Ogbe ọka asaa ndị ahụ buru ibu bụkwa afọ asaa. Ọ bụ otu nrọ ahụ, ọ bụ ezie na ị rọrọ ya ugboro abụọ.
27 The seven thin, ugly cows that came up after them are seven years, and the seven empty heads scorched by the east wind are seven years of famine. Ehi asaa ndị ọzọ ahụ dị ọkpụkpụ ọkpụkpụ ndị pụtara mgbe ndị nke mbụ pụtachara bụ afọ asaa. Otu a kwa ogbe ọka ndị ọzọ fịkpọrọ afịkpọ nke ikuku si nʼọwụwa anyanwụ mere ka ha fịkpọọ bụ afọ asaa. Ha na-egosi afọ asaa mgbe oke ụnwụ ga-adị.
28 This is what I told Pharaoh: our Father has shown Pharaoh what he is about to do. “Dịka m gwara Fero na mbụ, Chineke egosila gị ihe ọ chọrọ ime.
29 Seven years of great abundance are coming throughout all the land of Egypt. Afọ asaa na-abịa ga-abụ afọ asaa mgbe nri ga-adị ukwuu nʼala Ijipt niile.
30 Then seven years of famine will follow. All the plenty in Egypt will be forgotten, and famine will devour the land. Emesịa afọ asaa oke ụnwụ ga-eso ha. Mgbe ahụ, a ga-echefu ụba niile nke ala Ijipt. Ụnwụ a ga-ala obodo nʼiyi.
31 The abundance will be forgotten in the land, since the famine afterward will be so severe. Agaghị echetakwa na e nwere oge ịba ụba ihe oriri nʼala a, nʼihi oke ụnwụ ahụ nke ga-eso ya ga-adị oke ukwuu.
32 Pharaoh's dream repeated twice means our Father has firmly fixed this matter, and our Father will soon carry it out. Ihe mere Fero ji rọọ nrọ a ugboro abụọ bụ nʼihi na Chineke ekpebiela na ihe ndị a ga-emezuriri. Chineke ga-emekwa ya nʼoge na-adịghị anya.
33 So let Pharaoh find a discerning, wise man and put him over Egypt's land. “Ma ugbu a, ka Fero chọọ onye nwere ezi nghọta na amamihe. Ya mee ya onyeisi ọchịchị nʼala Ijipt niile.
34 Let Pharaoh take action and appoint overseers over the land, and take a fifth of Egypt's produce during the seven years of abundance. Ka Fero mee nhọpụta ndị nlekọta ala Ijipt. Ka e debe otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke nri niile a ga-enweta nʼoge ahụ nri ga-adị ukwuu nʼala Ijipt.
35 Let them gather all the food of these good coming years, and store grain under Pharaoh's hand as food in the cities, and guard it. Ka ha kpokọtaa nri niile ga-adị nʼoge ịba ụba nke ihe oriri, nke ga-adị nʼafọ ndị a na-abịa. Ka ha kpokọta ha nʼụlọ ichebe nri nke ga-adị nʼokpuru ọchịchị Fero. Ka ọ bụrụ nri e debere nʼobodo dị iche iche.
36 That food will be a reserve for the land during the seven years of famine coming on the land of Egypt, so the land won't be cut off by famine." A ga-echebe nri ndị a nke ọma maka ndị bi nʼala a, ka ọ bụrụ nri a ga-eri nʼime afọ asaa ndị ahụ nke ụnwụ ga-adị nʼala Ijipt, ka ụnwụ ghara ibibi ala a.”
37 The plan seemed good to Pharaoh and to all his servants. Ntụpụta ahụ dị mma nʼanya Fero na ndịisi ọchịchị ya.
38 Pharaoh said to his servants, "Can we find anyone like this, a man with God's Spirit in him?" Fero jụrụ ndịisi ọchịchị ya, “Anyị ga-achọtali onye ọzọ dịka nwoke a, onye mmụọ nke Chineke dị nʼime ya?”
39 Pharaoh said to Joseph, "Since God has shown you all this, none is as discerning and wise as you. Ya mere Fero tụgharịrị sị Josef, “Ebe Chineke kpugheere gị ihe ndị a, o nweghị onye ọzọ nwere ezi nghọta na amamihe dịka gị.
40 You will be over my house; all my people will obey your command. Only in the throne will I be greater than you." Gị onwe gị ga-abụ onye na-elekọta ụlọeze m. Ndị m niile ga-erube isi nʼiwu ọbụla i nyere. Ọ bụ naanị nʼocheeze ka m ga-eji dị ukwuu karịa gị.”
41 And Pharaoh said to Joseph, "See, I have set you over all the land of Egypt." Fero gwara Josef, “Lee, emeela m gị onye nlekọta ala Ijipt niile.”
42 Pharaoh took the signet ring from his hand and put it on Joseph's hand, dressed him in fine linen, and put a gold chain on his neck. Mgbe ahụ, Fero gbapụtara mgbaaka eze ya gbanye ya Josef nʼaka. O yikwasịkwara Josef uwe e ji ezi akwa ọcha duo, nyanye ya ihe ịnya nʼolu nke e ji ọlaedo kpụọ.
43 Pharaoh had Joseph ride in his own second chariot, had men call out before Joseph, "Kneel!" and set him over all Egypt's land. O mere ka ọ nyaa ịnyịnya ụgbọ ya nke abụọ. Ndị oti mkpu na-etikwa nʼihu ya, “Gbuonụ ikpere nʼala.” Otu a ka Fero si mee Josef onye na-achị ala Ijipt niile.
44 Pharaoh said to Joseph, "I am Pharaoh; without you, no one moves hand or foot in all the land of Egypt." Fero gwakwara Josef sị, “Ọ bụ mụ onwe m bụ Fero! O nweghị onye ọbụla ga-ewelita aka maọbụ ụkwụ ya nʼala Ijipt niile ma ọ bụghị site nʼike i nyere ya.”
45 Pharaoh named Joseph Zaphenath-paneah and gave him Asenath, daughter of Potiphera, priest of On, as wife. Then Joseph went out over the land of Egypt. Fero gụrụ Josef aha Zafenat-Pania. Ọ kpọnyekwara ya, Asenat, nwa Pọtifera, onye nchụaja obodo a na-akpọ On, ka ọ bụrụ nwunye ya. Josef bịara gazuo ala Ijipt.
46 Joseph was thirty when he stood before Pharaoh king of Egypt. He left Pharaoh's presence and traveled through all the land of Egypt. Josef gbara iri afọ atọ mgbe o bidoro iguzo nʼihu Fero eze Ijipt. O si nʼihu Fero pụọ, malite ijegharị ebe niile nʼala Ijipt.
47 During the seven years of abundance, the land produced bountifully. Nʼafọ asaa ahụ nke a na-eriju afọ, ala mepụtara nri nʼebe ọ dị ukwuu.
48 He collected all the food of the seven years in Egypt and stored it in the cities, in each city the food of the fields around it. Nʼime afọ asaa ndị a nke nri juru ebe niile nʼIjipt, Josef chịkọtara nri niile nke si nʼubi, ma chekwaa ha nʼụlọ e wuru maka iche nri nʼobodo niile ahụ. Nʼobodo ọbụla, ka ọ na-etinye ihe oriri nke si nʼubi gbara ya gburugburu.
49 Joseph stored grain like the sand of the sea—so much he stopped counting; it was uncountable. Josef chekwara ọka dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, dịka aja dị nʼakụkụ osimiri. A kwụsịrị ịgụ ha ọnụ nʼihi na ha hiri nne nke ukwuu nke na ha enweghị ọnụọgụgụ.
50 Before the famine years, Joseph fathered two sons with Asenath, daughter of Potiphera, priest of On. Tupu oge ụnwụ ahụ ebido, Asenat nwa nwanyị Pọtifera, onye nchụaja nke On, mụtara Josef ụmụ ndị ikom abụọ.
51 Joseph named the firstborn Manasseh: "Because our Father made me forget all my hardship and all my father's house." Josef gụrụ ọkpara ya Manase, nʼihi na ọ sịrị, “Chineke emeela ka m chefuo ahụhụ m niile, mekwa ka m chefuo ndị ezinaụlọ nna m.”
52 He named the second Ephraim: "For our Father has made me fruitful in the land of my suffering." Josef gụrụ nwa ya nke abụọ Ifrem. Ọ sịrị, “Nʼihi na Chineke emeela ka m mịa mkpụrụ nʼala nke ahụhụ m.”
53 The seven years of abundance in the land of Egypt came to an end. Afọ asaa nke ụba nri nke dịrị nʼala Ijipt mechara gabiga.
54 The seven years of famine began, just as Joseph had said. Famine struck every land, but in all the land of Egypt there was bread. Afọ asaa nke ụnwụ bidoro bịawa dịka Josef kwuru. Ụnwụ nọ nʼobodo niile, ma nʼala Ijipt niile nri dị.
55 When famine struck all Egypt, the people cried to Pharaoh for bread. Pharaoh told all the Egyptians, "Go to Joseph; do whatever he tells you." Ka agụ jidere ala Ijipt niile, ndị mmadụ tikuru Fero ka o nye ha nri. Ma Fero gwara ndị Ijipt niile, “Jekwurunụ Josef. Ihe ọbụla ọ gwara unu meenụ ya.”
56 As the famine spread across the land, Joseph opened all the storehouses and sold grain to the Egyptians, since the famine was severe in Egypt. Mgbe ụnwụ ahụ gbasara ruo nʼakụkụ niile nke ala ahụ, Josef meghepụrụ ụlọ ichebe nri niile bido iresi ndị Ijipt nri, nʼihi na ụnwụ ahụ dị njọ nʼala Ijipt niile.
57 All the earth came to Egypt to buy grain from Joseph, for the famine gripped all the earth. Mba niile bịara Ijipt ịzụ nri site nʼaka Josef nʼihi na ụnwụ ahụ dị njọ nʼụwa niile.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]