Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Genesis 22 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Some time later, our Father tested Abraham. He said to him, "Abraham!" "Here I am," Abraham replied. Mgbe ihe ndị a gasịrị, Chineke nwara Ebraham. Ọ sịrị ya, “Ebraham.” Ebraham zara sị, “Lekwa m.”
2 Then our Father said, "Take your son, your only son, whom you love—Isaac. Go to the land of Moriah and offer him there as a burnt offering on one of the mountains I will name." Chineke sịrị, “Duru nwa gị nwoke, naanị otu nwa gị nwoke, Aịzik onye ị hụrụ nʼanya, gaa nʼala Mọrịa. Jiri ya chụọrọ m aja nsure ọkụ nʼelu otu nʼime ugwu dị nʼebe m ga-egosi gị.”
3 Early next morning Abraham saddled his donkey, took two of his young men and his son Isaac, split the wood for the burnt offering, and set out for the place our Father had told him about. Nʼisi ụtụtụ echi ya, Ebraham biliri kwadoo ịnyịnya ibu ya. O duuru ndị ikom abụọ na-ejere ya ozi, na nwa ya nwoke Aịzik. O gbutere nkụ ga-ezuru ya ịchụ aja nsure ọkụ, bilie gawa ebe ahụ Chineke gwara ya maka ya.
4 On the third day Abraham looked up and saw the place in the distance. Nʼụbọchị nke atọ, Ebraham lepụrụ anya hụ ebe ahụ nʼebe dị anya.
5 He told his young men, "Stay here with the donkey. The boy and I will go over there, worship, and return to you." Ọ gwara ndị na-ejere ya ozi sị, “Nọdụnụ nʼebe a, unu na ịnyịnya ibu anyị, ka mụ na nwokorobịa a gaa nʼebe ahụ. Anyị feecha ofufe, anyị ga-alọghachikwute unu ọzọ.”
6 Abraham took the burnt offering wood and laid it on his son Isaac, carrying the fire and knife himself. The two walked on together. Ebraham boro nwa ya nwoke Aịzik ukwu nkụ ahụ e ji achụ aja nsure ọkụ nʼisi, ma ya onwe ya jidere ọkụ na mma.
7 Isaac said to his father Abraham, "My father?" "Here I am, my son," Abraham replied. "The fire and wood are here," Isaac said, "but where is the lamb for the burnt offering?" Aịzik gwara nna ya Ebraham sị, “Nna m.” Ebraham zara, “Ehee, nwa m.” Aịzik sịrị, “Ọkụ na nkụ dị nʼebe a, olee nwa atụrụ e ji achụ aja nsure ọkụ?”
8 Abraham answered, "Our Father himself will provide the lamb for the burnt offering, my son." And the two walked on together. Ebraham zara, “Nwa m, Chineke nʼonwe ya ga-eweta nwa atụrụ e ji achụ aja nsure ọkụ.” Ha abụọ gakwara nʼihu nʼije ha.
9 When they reached the place our Father had told him about, Abraham built the altar, arranged the wood, tied up his son Isaac, and laid him on the altar atop the wood. Mgbe ha ruru ebe ahụ Chineke gwara ya maka ya, Ebraham wuru ebe ịchụ aja nʼebe ahụ, doo nkụ ndị ahụ niile nʼusoro nʼelu ya. O kere nwa ya Aịzik agbụ, tụkwasị ya nʼelu ebe ịchụ aja ahụ, na nʼelu nkụ ndị ahụ.
10 Then Abraham reached out his hand and took the knife to kill his son. Mgbe ahụ Ebraham setịpụrụ aka ya, welite mma ka o gbuo nwa ya nwoke.
11 But our Father's messenger called to him from heaven, "Abraham! Abraham!" "Here I am," he answered. Ma mmụọ ozi Onyenwe anyị si nʼeluigwe kpọọ ya oku sị ya, “Ebraham! Ebraham!” Ebraham zara, “Lekwa m nʼebe a.”
12 "Don't lay a hand on the boy," he said. "Do nothing to him. Now I know you fear me, since you haven't held back your son, your only son, from me." Ọ sịrị ya, “Emetụkwala nwokorobịa ahụ aka. Emekwala ya ihe ọbụla. Nʼihi na amatala m ugbu a na ị na-atụ egwu Chineke, ebe ọ bụ na i kwenyere iji nwa gị nwoke, naanị otu nwa nwoke i nwere chụọrọ m aja.”
13 Abraham looked up and saw a ram behind him, caught by its horns in a thicket. He went, took the ram, and offered it as a burnt offering instead of his son. Ebraham leliri anya hụ otu ebule nke eriri ọhịa jidere na mpi ya. Ebraham gara jide ebule ahụ, were ya chụọ aja nsure ọkụ nʼọnọdụ nwa ya nwoke.
14 Abraham named that place "The Father Will Provide," meaning "our Father will provide." To this day it is said, "On his mountain it will be provided." Ya mere, Ebraham kpọrọ ebe ahụ, “Onyenwe anyị ga-arọpụta.” Ya mere ruo taa a na-asị, “Nʼugwu Onyenwe anyị, a ga-arọpụta.”
15 The messenger of our Father called to Abraham from heaven a second time, Mmụọ ozi Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe kpọọ Ebraham oku nke ugboro abụọ,
16 and said, "I swear by myself, declares our Father: because you have done this and not held back your son, your only son, sị, “Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, ji onwe m na-aṅụ iyi na-ekwupụta sị, ebe ọ bụ na i mere ihe dị otu a, na i kwenyere iji nwa gị nwoke, naanị otu nwoke i nwere chụọrọ m aja,
17 I will surely bless you and surely multiply your offspring like the stars of the sky and the sand on the seashore. Your offspring will possess the gate of his enemies, aga m agọzi gị nʼezie, mekwa ka ụmụ ụmụ gị mụbaa nʼọnụọgụgụ dịka kpakpando nke mbara eluigwe na dịka aja dị nʼọnụ mmiri osimiri. Ụmụ ụmụ gị ga-enwetara onwe ha ọnụ ụzọ ama ndị iro ha.
18 and through your offspring all nations of the earth will be blessed, because you obeyed my voice." Sitekwa na mkpụrụ gị ka a ga-agọzikwa agbụrụ niile nọ nʼụwa, nʼihi na i rubeere m isi.”
19 Abraham returned to his young men, and they set out together for Beersheba. Abraham settled in Beersheba. Emesịa, Ebraham laghachikwuru ndị na-ejere ya ozi. Ha niile laghachikwara Bịasheba. Ebraham birikwara na Bịasheba.
20 Some time later, Abraham was told, "Milcah too has borne sons to your brother Nahor: Mgbe ihe ndị a gasịrị, e ziri Ebraham ozi si ya, “Lee, Milka ya onwe ya amụkwaarala nwanne gị nwoke bụ Nahọ, ụmụ ndị ikom.
21 Uz the firstborn, Buz his brother, Kemuel (the father of Aram), Aha ha bụ Uz, onye bụ ọkpara, na Buz nwanne ya, Kemuel bụ (nna Aram),
22 Chesed, Hazo, Pildash, Jidlaph, and Bethuel." Kesed, Hazọ, Pildash, Jidlaf na Betuel.”
23 Bethuel became the father of Rebekah. These were the eight sons Milcah bore to Nahor, Abraham's brother. Betuel mụrụ Ribeka. Milka mụtaara Nahọ, nwanne Ebraham ụmụ ndị ikom asatọ ndị a.
24 Nahor's concubine, whose name was Reumah, also bore children: Tebah, Gaham, Tahash, and Maacah. Iko ya nwanyị, onye aha ya bụ Reuma, mụkwaara ya ụmụ ndị ikom. Ha bụ Teba, Gaham, Tahash na Maaka.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]