Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Genesis 21 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Now our Father visited Sarah, just as he had said, and did for her what he had promised. Onyenwe anyị jiri amara leta Sera dịka o kwuru na ọ ga-eme. Onyenwe anyị meere Sera ihe o kwere na nkwa.
2 Sarah conceived, bore Abraham a son in his old age, at the set time our Father had promised him. Sera tụụrụ ime, mụọra Ebraham nwa nwoke nʼoge o merela agadi. Ọ mụrụ ya nʼoge ahụ a kara aka Chineke kwere ya na nkwa.
3 Abraham named the son Sarah had borne him Isaac. Ebraham gụrụ nwantakịrị ahụ Sera mụụrụ ya aha, kpọọ ya Aịzik.
4 Abraham circumcised his son Isaac at eight days old, as our Father had commanded him. Mgbe Aịzik nọrọ ụbọchị asatọ site nʼụbọchị a mụrụ ya, Ebraham biri ya ugwu dịka Chineke si nye ya nʼiwu.
5 Abraham was one hundred years old when his son Isaac was born to him. Ebraham agbaala narị afọ mgbe a mụrụ Aịzik nwa ya nwoke.
6 Sarah said, "our Father made me laugh; everyone who hears will laugh with me." Nʼoge ahụ, Sera kwuru sị, “Chineke ewetarala m ọchị. Ndị niile nụrụ akụkọ a ga-esoro m chịa ọchị.”
7 She added, "Who would have told Abraham that Sarah would nurse children? Yet I've borne him a son in his old age." O kwukwara sị, “Onye gaara agwa Ebraham sị ya na Sera ga-azụlite ụmụntakịrị. Ma otu ọ dị, amụtarala m ya nwa nwoke ugbu a o merela agadi.”
8 The child grew and was weaned; the day Isaac was weaned, Abraham threw a great feast. Nwata ahụ tokwara, ruo mgbe a kwụsịrị ya ara. Nʼụbọchị ahụ a kwụsịrị ya ara, Ebraham kpọrọ oriri.
9 But Sarah saw the son whom Hagar the Egyptian had borne to Abraham, and he was mocking. Ma mgbe Sera hụrụ na nwa nwoke ahụ Hega onye Ijipt mụtaara Ebraham nọ na-akwa emo,
10 She said to Abraham, "Drive out this slave woman and her son; this slave woman's son will never inherit with my son Isaac." ọ gwara Ebraham okwu sị ya, “Chụpụ ohu nwanyị a na nwa ya. Nʼihi na nwa nwoke ohu nwanyị agaghị eso nwa m nwoke Aịzik keta oke nʼihe nketa.”
11 This troubled Abraham deeply, because it concerned his son. Okwu a wutere Ebraham nke ukwuu nʼihi na ihe banyere nwa ya nwoke Ishmel na-emetụ ya nʼobi.
12 But our Father said to Abraham, "Don't be upset about the boy and your slave woman. Listen to Sarah in all she tells you, for your offspring will be named through Isaac. Ma Chineke gwara Ebraham sị, “Ekwela ka obi jọọ gị njọ nʼihi nwantakịrị a na ohu gị nwanyị. Gee ntị nʼihe ọbụla Sera gwara gị. Nʼihi na ọ bụ site nʼAịzik ka a ga-akpọ mkpụrụ gị aha.
13 I will also make the slave woman's son a nation, since he is your offspring." Aga m eme ka nwa gị nwoke nke ohu gị mụtara ghọọ mba dị ukwuu, nʼihi na mkpụrụ afọ gị ka ọ bụ.”
14 Early next morning Abraham took bread and a skin of water, gave them to Hagar, put them on her shoulder along with the child, and sent her away. She left and wandered the wilderness of Beersheba. Ebraham biliri nʼisi ụtụtụ echi ya, kwadoo ihe oriri na mmiri ọṅụṅụ nke dị nʼime karama akpụkpọ, bunye ha Hega. O bukwasịrị ha nʼubu Hega, zipụ ya na nwa ya nwoke. Hega si nʼebe ahụ pụọ wagharịa nʼime ọzara Bịasheba.
15 When the water in the waterskin was gone, she put the boy under one of the bushes. Mgbe mmiri dị na karama akpụkpọ ahụ gwụsịrị, o nibere nwantakịrị ahụ nʼokpuru otu osisi ọhịa.
16 She went and sat down about a bowshot away, for she said, "I can't watch the boy die." Then she sat there, lifted her voice, and wept. Hapụ ya gaa nọdụ ala nʼebe dịtụ anya, ihe dịka narị nzọ ụkwụ, nʼihi na o kwuru nʼobi ya sị, “Achọghị m ịhụ nwantakịrị nwoke a anya mgbe ọ na-anwụ.” Mgbe ọ nọdụrụ ebe ahụ, o bidoro ịkwa akwa.
17 Our Father heard the boy's voice; his messenger called to Hagar from heaven: "What's wrong, Hagar? Don't be afraid—our Father has heard the boy's voice where he lies. Ma Chineke nụrụ ịkwa akwa nwantakịrị nwoke ahụ. Mmụọ ozi Chineke sikwa na mbara eluigwe kpọọ Hega oku sị ya, “Hega, gịnị na-eme gị? Atụla egwu, nʼihi na Chineke anụla olu akwa nwantakịrị ahụ nʼebe ahụ o dina.
18 Get up, lift the boy and take him by the hand, for I will make him a great nation." Gaa kulite nwantakịrị ahụ kasịe ya obi, nʼihi na aga m eme ya ka ọ ghọọ mba dị ukwuu.”
19 Then our Father opened her eyes; she saw a well of water, went and filled the waterskin, then gave the boy a drink. Mgbe ahụ, Chineke meghere anya ya, mee ka ọ hụ olulu mmiri dị nʼebe ahụ. Ọ gara kujuo karama akpụkpọ ahụ mmiri, ma nye nwantakịrị ahụ mmiri ka ọ ṅụọ.
20 Our Father was with the boy as he grew up. He lived in the wilderness and became an archer. Chineke nọnyeere nwantakịrị ahụ mgbe ọ na-eto. O biri nʼọzara ahụ ghọọ onye na-agba àkụ nke ọma.
21 He lived in the wilderness of Paran, and his mother got him a wife from Egypt. Mgbe o bi nʼọzara Paran, nne ya chọtaara ya nwunye site nʼIjipt.
22 At that time, Abimelech and Phicol, commander of his army, said to Abraham, "God is with you in all you do. Nʼoge a, Abimelek na Fikọl onyeisi ndị agha ya, bịakwutere Ebraham sị ya, “Chineke nọnyeere gị nʼihe niile ị na-eme.
23 Now swear to me here by God that you won't betray me, my children, or my descendants. Show me and this land where you've lived as a foreigner the same kindness I've shown you." Ugbu a, ṅụọra m iyi nʼaha Chineke na ị gaghị aghọgbu m maọbụ ghọgbuo ụmụ m, maọbụ ụmụ ụmụ m. Gosi m nʼobodo a i bi nʼime ya dịka onye ọbịa ụdị obiọma m gosiri gị.”
24 Abraham said, "I swear it." Ebraham zara sị ya, “Ọ dị mma, aga m aṅụrụ gị iyi.”
25 Then Abraham complained to Abimelech about a well of water that Abimelech's servants had seized. Mgbe ahụ, Ebraham kọsaara Abimelek ihe banyere olulu mmiri nke ndị na-ejere ya ozi ji anya ike nara ndị na-ejere Ebraham ozi.
26 Abimelech replied, "I don't know who did this. You didn't tell me, and I only heard of it today." Abimelek zara sị, “Amaghị m onye mere ihe dị otu a. Ị gwaghị m na ihe dị otu a mere, anụghị m ya ma ọ bụghị naanị taa.”
27 Abraham took sheep and cattle and gave them to Abimelech, and the two made a covenant. Mgbe ahụ, Ebraham kpụpụtara atụrụ, na ehi, nye Abimelek. Ha abụọ gbara ndụ nkwekọrịta.
28 Abraham set apart seven ewe lambs from the flock, Mgbe Ebraham sitere nʼigwe atụrụ ya wepụta nne atụrụ asaa nupu ha ka ha nọpụ iche,
29 and Abimelech asked Abraham, "What is the meaning of these seven ewe lambs you have set apart?" Abimelek jụrụ Ebraham sị ya, “Gịnị ka i ji nne atụrụ asaa ndị a ị họpụtara iche eme?”
30 He replied, "Accept these seven ewe lambs from me as proof that I dug this well." Ebraham zara sị, “Nabata ụmụ atụrụ asaa ndị a dịka ihe akaebe na-egosi na ọ bụ m gwuru olulu mmiri a.”
31 So that place was called Beersheba, because there the two of them swore an oath. Ya mere, e bidoro ịkpọ ebe ahụ Bịasheba, nʼihi na nʼebe ahụ ka mmadụ abụọ a nọ ṅụrịtaara onwe ha iyi.
32 So they made a covenant at Beersheba. Then Abimelech and Phicol, his army commander, returned to Philistine land. Mgbe ha gbachara ndụ nkwekọrịta na Bịasheba, Abimelek na Fikọl onyeisi agha ya laghachiri azụ nʼala ndị Filistia.
33 Abraham planted a tamarisk in Beersheba, and there he called on the name of our Father, El Olam—our everlasting Father. Ebraham kụrụ osisi tamarisk na Bịasheba. Ebe ahụ ka ọ nọ kpọkuo aha Onyenwe anyị, Chineke ebighị ebi.
34 And Abraham stayed in the land of the Philistines for a long time. Ebraham bigidere nʼala ndị Filistia ogologo oge.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]