Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Genesis 23 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Sarah lived to be 127 years old; these were the years of Sarah's life. Sera dị ndụ ruo narị afọ na iri afọ abụọ na asaa.
2 Sarah died at Kiriath-arba, Hebron, in Canaan. Abraham came to mourn and weep for her. Ọ nwụrụ na Kiriat Arba (nke bụ Hebrọn), nʼala Kenan. Ebraham ruru ụjụ nʼihi Sera, kwaa akwa nke ukwuu nʼihi ọnwụ ya.
3 Then Abraham rose from beside her body and said to the Hittites, Ebraham sitere nʼebe ozu nwunye ya dị pụọ, jekwuru ụmụ Het gwa ha sị,
4 "I am a foreigner and stranger among you; give me burial ground among you, to bury my dead out of my sight." “Abụ m ọbịa na onye obodo ọzọ nʼetiti unu. Resinụ m ala m ji eme ebe olili nʼebe a, ka m nwee ike lie onye m nwụrụ anwụ.”
5 The Hittites replied to Abraham. Ụmụ Het zara Ebraham sị,
6 "Hear us, my lord: you are a prince of God among us. Bury your dead in our best tomb; none of us will refuse you his tomb for burying your dead." “Nna anyị ukwu, gee anyị ntị. Nwa eze dị ukwu ka ị bụ nʼetiti anyị, lie onye gị nwụrụ anwụ nʼili ahụ nke kachasị mma nʼime ili anyị nwere. O nweghị onye ọbụla nʼime anyị ga-ajụ inye gị ala olili ya maka ili onye gị nwụrụ anwụ.”
7 Abraham rose and bowed low before the people of the land, the Hittites. Mgbe ahụ, Ebraham biliri kpọọ isiala nʼihu ndị nwe ala, bụ ndị Het,
8 He said to them, "If you're willing I bury my dead away from me, hear me, and plead with Ephron son of Zohar for me, sị ha, “Ọ bụrụ ọchịchọ unu ka m lie onye m nwụrụ anwụ, geenụ m ntị ma rịọrọ m Efrọn nwa Zoha,
9 to give me his cave of Machpelah, at his field's edge. Let him sell it to me among you, for full price, as burial property." ka o resi m ọgba Makipela, nke bụ nke ya, nke dị na ngwụsị ọhịa ya. Gwa ya ka o resi m ya nʼọnụ ahịa o ruru ka ọ bụrụ ebe olili m nwere nʼetiti unu.”
10 Ephron the Hittite, sitting among the Hittites, answered Abraham before all the Hittites entering his city's gate. Efrọn onye Het nʼonwe ya so nọdụ nʼebe ahụ nʼetiti ndị ya. Ọ zara Ebraham nʼihu ndị Het niile bịara nʼọnụ ụzọ ama obodo
11 "No, my lord, listen: I give you the field, I give you the cave in it. Before my people I give it to you. Bury your dead." sị ya, “Mba! Nna m ukwu, gee m ntị. Ana m enye gị ala ahụ na ọgba dị nʼime ya nʼihu ndị a niile bụ ndị m. Gaa lie onye gị nwụrụ anwụ nʼime ya.”
12 Again Abraham bowed before the people of the land. Ọzọ Ebraham kpọrọ isiala nye ndị nwe ala,
13 He said to Ephron before the people, "If you're willing, hear me: I'll pay for the field—take it from me, so I can bury my dead there." ọ sịrị Efrọn, nʼihu ha niile, “Biko gee m ntị, aga m akwụ gị ọnụahịa iji zụọ ala ahụ. Nara m ya ka m nwee ike lie onye m nwụrụ anwụ nʼime ya.”
14 Ephron replied to Abraham. Efrọn zara Ebraham,
15 "My lord, hear me: land worth about ten pounds of silver—what is that between us? Bury your dead." “Gee m ntị, nna m ukwu, ọ bụ ezie na ala ahụ ruru narị shekel ọlaọcha anọ, ma gịnị ka nke a bụ nʼetiti mụ na gị? Gaa lie onye gị nwụrụ anwụ nʼime ya.”
16 Abraham agreed to Ephron's terms and weighed out for him the price he had named before the Hittites: about ten pounds of silver, at the standard weight used by merchants. Ebraham kwenyere nʼego ole Efrọn chọrọ ka ọ kwụọ. O ji ihe ọtụtụ tụpụtara Efrọn ego ruru ọnụahịa ọ kpọrọ aha nʼihu ndị Het niile, narị shekel ọlaọcha anọ, dịka ihe ọtụtụ nke dị nʼoge ahụ nʼetiti ndị na-azụ ahịa.
17 Ephron's field in Machpelah, facing Mamre—the field, its cave, and every tree within its borders, all around—was confirmed, Site nʼoge ahụ, ala ahụ Efrọn nwere na Makipela, nke dị nso na Mamre, ala ahụ na ọgba dị nʼime ya, na osisi niile dị nʼime ala ahụ niile gburugburu,
18 to Abraham as his property, before all the Hittites who came to his city's gate. ghọrọ nke Ebraham dịka ihe nzụta ya nʼihu ụmụ Het, nʼihu ndị niile ndị bịara nʼọnụ ụzọ e si abata obodo ahụ.
19 After this, Abraham buried Sarah his wife in the cave of Machpelah's field, facing Mamre—Hebron—in the land of Canaan. Emesịa, Ebraham liri Sera nwunye ya nʼime ọgba ahụ dị nʼala dị na Makipela na nso Mamre (nke dị na Hebrọn) nʼala ndị Kenan.
20 So the field and its cave were deeded to Abraham by the Hittites as a burial holding. Ya mere, ala ahụ na ọgba dị nʼime ya ka ndị Het resiri Ebraham ka ọ bụrụ nke ya, ebe a na-eli ozu.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]