Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ecclesiastes 7 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 A good name is better than fine perfume, and the day of death than the day of birth. Ezi aha ka mma karịa mmanụ isi ụtọ. Ụbọchị mmadụ nwụrụ ka ụbọchị a mụrụ ya mma.
2 It is better to go to the house of mourning than to go to the house of feasting, for that is the end of everyone, and the living should take it to heart. Ọ kaara gị mma ije nʼebe a na-eru ụjụ karịa ebe a na-eri na-aṅụ. Nʼihi na ọnwụ dịịrị mmadụ ọbụla; ndị dị ndụ kwesiri iburu nke a nʼobi.
3 Sorrow is better than laughter, for a sad face is good for the heart. Iru ụjụ ka ịchị ọchị mma, ihu gbarụrụ agbarụ na-enyere obi aka
4 The heart of the wise is in the house of mourning, but the heart of fools is in the house of pleasure. Onye maara ihe na-eche echiche banyere ọnwụ, ma onye nzuzu na-eche naanị banyere ikpori ndụ.
5 It is better to hear the rebuke of the wise than to hear the song of fools. Ọ ka mma ige ntị nye mba onye maara ihe karịa ịṅa ntị nʼabụ ndị na-enweghị uche na-abụ.
6 For like the crackling of thorns under a pot, so is the laughter of the fool. This too is fleeting. Ọchị onye nzuzu dị ka mkpọtụ nke ogwu na-ere ọkụ na-eme nʼokpuru ite. Ihe a bụkwa ihe efu.
7 Surely oppression turns a wise person into a fool, and a bribe corrupts the heart. Iji anya ike nara mmadụ ihe na-eme ka onye mara ihe ghọọ onye nzuzu, iri ngarị na-emerụ obi mmadụ.
8 The end of a matter is better than its beginning, and a patient spirit is better than a proud spirit. Ọgwụgwụ ihe ọbụla dị mma karịa mmalite ya! Ogologo ntachiobi dị mma karịa mpako!
9 Do not be quick in your spirit to become angry, for anger settles in the lap of fools. Abụla onye na-ewe iwe ọsịịsọ, nʼihi na iwe bụ oke ndị nzuzu.
10 Do not say, "Why were the former days better than these?" For it is not from wisdom that you ask this. Asịla, “Gịnị mere ụbọchị gara aga ji dị mma karịa ụbọchị ndị a?” Nʼihi na ọ bụghị amamihe ị jụ ajụjụ dị otu a.
11 Wisdom is good with an inheritance, an advantage to those who see the sun. Amamihe dịka ihe nketa, bụ ihe dị mma. Ọ na-abara uru nye ndị na-ahụ anyanwụ anya.
12 For wisdom is a shelter, just as money is, but the advantage of knowledge is this: wisdom preserves the life of the one who has it. Amamihe bụ ndo dịka ego si bụrụkwa ndo, ma ụzọ ihe ọmụma ji dị mma karịa bụ nke a: Amamihe na-echebe ndụ ndị nwere ya.
13 Consider the work of God: who can straighten what he has made crooked? Chee echiche banyere ihe Chineke na-eme. Mmadụ ọ pụrụ ime ka ọ dịzie adịzie, bụ ihe Chineke mere ka ọ gbagọọ agbagọ?
14 In the day of prosperity be joyful, and in the day of adversity consider: God has made the one as well as the other, so that no one can find out anything that will come after them. Mgbe ihe na-agara gị nke ọma, ṅụrịa ọṅụ, nʼihi ọ dịrị gị mma, ma mgbe mmekpa ahụ batara, mata nke ọma na Chineke onye na-enye ọnọdụ ọma makwa ihe banyere ọnọdụ ọjọọ. Ya mere, o nweghị onye ọbụla nwere ike ịchọpụta ọdịnihu ya.
15 In my fleeting days I've seen it all: a righteous man dying in his righteousness, a wicked man living long in his evil. Ndụ m nʼụwa a bụ ihe efu, ahụla m ihe abụọ ndị a; onye ezi omume na-anwụ nʼezi omume ya, ma onye na-emebi iwu na-ebi ogologo ndụ na mmebi iwu ya.
16 Do not be excessively righteous, and do not make yourself overly wise; why should you destroy yourself? Nʼihi ya, abụbigala onye ezi omume oke, emekwala onwe gị onye mabigara ihe oke. Gịnị mere i ji achọ igbu onwe gị?
17 Don't be too wicked, and don't be foolish—why die before your time? Abụbigala onye na-emefe ajọ omume oke, abụkwala onye nzuzu! Gịnị ka ị ga-eji nwụọ mgbe oge gị na-erubeghị?
18 Good to grasp this, and not let go of that too, for whoever fears God comes through both. Ọ dị mma ijide otu na-esepụghị aka na nke ọzọ, onye na-atụ egwu Chineke ga-enweta uru nʼime ha abụọ.
19 Wisdom makes the wise person stronger than ten rulers who are in a city. Amamihe na-eme ka otu onye dị ike karịa mmadụ iri na-achị otu obodo.
20 Surely there is no one righteous on earth who does good and never sins. Gbaa ụwa niile gburugburu, ọ dịghị otu onye bụ onye ezi omume, ọ dịghị onye na-eme ihe ziri ezi nke na-adịghị eme mmehie mgbe ọbụla.
21 Also, do not take to heart everything people say, or you may hear your servant cursing you, Egela ntị nʼihe niile ndị mmadụ na-ekwu, ị pụrụ ịnụ nkọcha nke ohu gị na-akọcha gị.
22 for your own heart knows that many times you yourself have cursed others. Gị onwe gị maara na ọtụtụ oge, ị na-akọchakwa ndị ọzọ.
23 I tested all this by wisdom. I said, "I am determined to be wise"—but it was beyond me. Agbalịsiela m ike inwe nghọta. Ekwuru m sị, “Aga m abụ onye amamihe,” ma nke a karịrị m.
24 Whatever exists is far off and deep, very deep—who can discover it? Amamihe adịghị mfe inweta, ọ dị omimi nke ukwuu; ọ bụ onye pụrụ ịchọpụta ya?
25 I turned my heart to know, explore, and seek wisdom and the sum of things, and to know the evil of foolishness and the foolishness that is madness. A tụgharịrị uche m ka m ghọta, iledo na ịchọpụta amamihe na atụmatụ otu ihe niile si dị na ịghọtakwa nzuzu nke dị na ajọ omume na ịyị ara nke dị na enweghị uche.
26 I find the woman more bitter than death: her heart is snares and nets, her hands chains. One good before God escapes her; the sinner is caught by her. Achọpụtara m na ọ dị ihe dị ilu karịa ọnwụ, ihe ahụ bụ nwanyị. Obi ya dị ka ụgbụ. Otu a kwa, aka o ji ejikụ gị dị ka ụdọ igwe. Onye ahụ na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ na-esi nʼaka ya gbapụ, ma ndị mmehie ka ọ na-enwude nʼọnya ya.
27 "See, this is what I found," says the Teacher, "adding one to another to find the sum, “Lee, Ihe a ka m chọpụtara,” ka onye nkuzi kwuru: “Site nʼịtụkwasị otu ihe nʼelu ibe ya ka m matara isi ihe niile.
28 which my soul kept seeking but didn't find. One man in 1,000 I found, but a woman among all these I didn't find. Mgbe m ka na-achọ ma achọtaghị m, nʼetiti puku mmadụ ndị ikom, achọtara m otu onye aka ya dị ọcha, ma ọ dịghị otu nwanyị m chọtara nʼetiti ha.
29 Look, this alone I found: God made humanity upright, but they sought many schemes." Achọpụtara m naanị nke a, Chineke mere ndị mmadụ ka ha bụrụ ndị ụzọ ha ziri ezi, ma ha atụgharịala chọrọ ọtụtụ ihe nchepụta gawa.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]