Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

2 Samuel 3 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 The war between Saul's house and the house of David dragged on a long time. David grew steadily stronger, while Saul's house grew weaker and weaker. Agha dị nʼetiti ndị ụlọ Sọl na ụlọ Devid dịịrị ruo oge toro ogologo. Ma ka Devid na-aga nʼihu na-esiwanye ike, ụlọ Sọl na-aga azụ na-ada ada.
2 Sons were born to David in Hebron. His firstborn was Amnon, whose mother was Ahinoam of Jezreel; A mụtaara ọtụtụ ụmụ ndị ikom nye Devid mgbe ọ nọ na Hebrọn. Ọkpara ya bụ Amnọn nke, Ahinoam bụ nwanyị Jezril mụrụ.
3 his second, Chileab, by Abigail, Nabal of Carmel's widow; the third, Absalom, son of Maacah, daughter of Talmai king of Geshur; Nke abụọ bụ Kiliab, nke Abigel, nwunye ochie Nebal, onye Kamel mụrụ. Nke atọ bụ Absalọm, nke Maaka nwa nwanyị Talmai, bụ eze Geshua mụrụ.
4 the fourth, Adonijah son of Haggith; the fifth, Shephatiah son of Abital; Nke anọ bụ Adonaịja, nwa nwoke Hagit. Nke ise bụ Shefataya nwa Abital;
5 and the sixth, Ithream, by David's wife Eglah. These were David's sons born in Hebron. nke isii bụ Itream, nwa nwoke Egla nwunye Devid. Ndị a ka a mụtaara Devid na Hebrọn.
6 During the war between the house of Saul and the house of David, Abner kept strengthening his position in Saul's house. O ruo, mgbe agha na-aga nʼihu nʼetiti ụlọ Sọl na ụlọ Devid, na Abna nọ na-eme ka ọnọdụ ya sie ike nʼụlọ Sọl.
7 Saul had a concubine named Rizpah, daughter of Aiah. Ish-bosheth said to Abner, "Why did you sleep with my father's concubine?" Ma Sọl nwererịị otu iko nwanyị aha ya bụ Rizpa, nwa Aịa. Ishboshet jụrụ Abna ajụjụ sị, “Gịnị mere gị na iko nwanyị nna m ji dinaa?”
8 Abner, very angry at Ish-bosheth's words, said, "Am I a dog's head loyal to Judah? Today I keep showing loyalty to your father Saul's house, his brothers and friends, and haven't handed you to David. Yet now you charge me over this woman! Iwe were Abna nke ukwuu nʼihi ihe Ishboshet kwuru. Ya mere, ọ zara, “Ọ bụ isi nkịta nke ụlọ Juda ka m bụ? Taa ka m ji obi m niile na-ejere ụlọ nna gị, bụ Sọl, na ezinaụlọ ya, na ndị enyi ya ozi. Ewerebeghị m gị nyefee nʼaka Devid. Ma lee, ugbu a i na-ebo m ebubo ajọ omume nʼihe metụtara nwanyị a.
9 May our Father do the same to Abner, and more, if I do not do for David what our Father swore to him, Ka Chineke mesoo Abna mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na m emereghị Devid ihe ndị ahụ niile Onyenwe anyị sitere nʼịṅụ iyi kwee nkwa inye ya.
10 to transfer the kingdom from Saul's house and set up David's throne over Israel and over Judah, from Dan to Beersheba." Ịnapụ ụlọ Sọl alaeze ahụ, na ime ka ocheeze Devid guzosie ike nʼebe Izrel niile na Juda niile nọ, site na Dan ruo Bịasheba.”
11 And Ish-bosheth could not say another word to Abner, because he was afraid of him. Ishboshet ekwughị ihe ọbụla nʼihi na ọ na-atụ Abna egwu.
12 Abner sent messengers to David on his behalf: "Whose is the land? Make your covenant with me, and my hand will be with you to bring all Israel over to you." Ngwangwa, Abna zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru Devid sị ya, “Onye nwee ala a? Ka mụ na gị gbaa ndụ. Aga m enyere gị aka kpọghachite ndị Izrel ka ha dịnyeere gị.”
13 David said, "Good; I'll make a covenant with you. But I require one thing: you won't see my face unless you first bring Michal, Saul's daughter, when you come." Devid sịrị, “Ọ dị mma. Mụ na unu ga-agba ndụ. Ma ọ dị otu ihe m chọrọ nʼaka unu. Unu agaghị ahụ ihu m anya ma ọ bụrụ na unu eduteghị Mikal, nwa Sọl, mgbe unu ga-abịa ịhụ m.”
14 David sent messengers to Ish-bosheth, Saul's son: "Give me my wife Michal, whom I betrothed to me for one hundred Philistine foreskins." Devid ziri Ishboshet nwa Sọl ozi sị ya, “Dulatara m nwunye m Mikal, nʼihi na ọ bụ narị apị ndị Filistia ka m ji lụtara ya onwe m.”
15 So Ish-bosheth sent and took her from her husband, Paltiel son of Laish. Na-atụfughị oge, Ishboshet nyere iwu ka e site nʼaka di ya bụ Paltiel, nwa Laish, kpọpụta ya.
16 Her husband went with her, weeping as he followed her to Bahurim. Then Abner told him, "Go back." So he returned. Mgbe ha du ya na-aga, Paltiel sogidere ya nʼazụ na-akwa akwa tutu ha eruo Bahurim. Nʼebe ahụ ka Abna nọ sị ya, “Laghachi ugbu a.” Ọ tụgharịrị laa.
17 Abner spoke with Israel's elders: "You've long wanted David as king over you. Abna na ndị okenye Izrel kparịtara ụka. Ọ chetaara ha sị ha, “Ọ dịla anya kemgbe unu na-achọ ka Devid bụrụ eze unu.
18 Now act, for our Father promised David: 'By my servant David's hand I will save my people Israel from the Philistines and all their enemies.'" Ugbu a meenụ ya, nʼihi na Onyenwe anyị kweere Devid nkwa, ‘Site nʼaka ohu m bụ Devid ka m ga-esi zọpụta ndị m bụ Izrel site nʼaka ndị Filistia, nakwa site nʼaka ndị iro ha niile.’ ”
19 Abner also spoke to Benjamin, then went to Hebron to tell David all that Israel and the whole house of Benjamin had agreed to do. Abna gwakwara ndị Benjamin okwu. Emesịa, o jere Hebrọn ịgwa Devid ihe niile ndị Izrel na ndị Benjamin zubere ime.
20 When Abner came to David at Hebron with twenty men, David held a feast for Abner and his men. Abna, ya na iri ndị ikom abụọ so gakwuru Devid na Hebrọn. Mgbe ha ruru, Devid meere ha oke oriri.
21 Abner told David, "Let me go gather all Israel to my lord the king, so they make a covenant with you and you reign over all your heart desires." So David sent Abner off, and he left in peace. Mgbe ahụ, Abna sịrị Devid, “Ka m gaa ngwangwa ga kpọkọtaa ndị Izrel niile, nye onyenwe m bụ eze, ka gị na ha gbaa ndụ, ka ị bụrụ eze ndị niile mkpụrụobi gị na-achọsi ike.” Ya mere Devid zilara Abna. Ọ laa nʼudo.
22 Just then David's servants and Joab returned from a raid with much plunder. But Abner was not with David at Hebron, for David had sent him away, and he had gone in peace. Nʼotu mgbe ahụ, ndị ikom Devid na Joab si nʼebe ha gara ịpụnara ndị mmadụ ihe lọta, bukọrọ ọtụtụ ihe nkwata. Ma Abna anọghịkwa na Hebrọn ya na Devid, nʼihi na Devid ezipụla ya, ọ pụọla nʼudo.
23 When Joab and all his army arrived, he was told, "Abner son of Ner came to the king, who sent him off, and he left in peace." Mgbe Joab na ndị agha ya lọtara, a kọọrọ ya na Abna, nwa Nea, bịara hụ eze, na ọ laakwala nʼudo.
24 So Joab went to the king: "What have you done? Abner came to you—why did you send him off, and now he's gone? Ya mere Joab jekwuuru eze sị ya, “Gịnị ka i mere? Lee, Abna bịakwutere gị. Gịnị mere i ji hapụ ya ka ọ laa? Lee ya ugbu a, ọ laala!
25 You know Abner son of Ner came to deceive you, to learn your movements and everything you're doing." Ị maara onye Abna nwa Nea bụ? Ọ bịara ịghọ gị aghụghọ, na inyocha njegharị gị, ịchọpụta ihe niile ị na-eme.”
26 When Joab left David, he sent messengers after Abner, who brought him back from the well of Sirah. But David knew nothing. Mgbe Joab si nʼihu Devid pụta, o zipụrụ ndị ozi ka ha sochie Abna azụ, gwa ya ka ọ laghachi. Ha hụrụ ya nʼolulu mmiri Sira. O sokwara ha laghachi, ma Devid amaghị ihe banyere nke a.
27 When Abner returned to Hebron, Joab pulled him aside inside the gate as if to speak privately, and there stabbed him in the stomach. He died—for the blood of Joab's brother Asahel. Mgbe Abna lọghachiri na Hebrọn, Joab duuru ya gaa nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama, dịka ọ chọrọ ka ha kparịtaa ụka. Ngwangwa, ọ mịpụtara nwa mma ya, jiri ya magbuo Abna, nʼihi ịbọ ọbọ ọbara nwanne ya, bụ Asahel.
28 Later, when David heard, he said, "I and my kingdom are forever innocent before our Father of the blood of Abner son of Ner. Mgbe emesịrị, Devid nụrụ banyere ya, ọ sịrị, “Aka m dị ọcha, ya na nke alaeze m nʼihu Onyenwe anyị banyere ọbara Abna, nwa Nea.
29 May it fall on Joab's head and all his father's house! May Joab's house never lack someone with a discharge or skin disease, who leans on a crutch, falls by the sword, or lacks food." Ka ikpe ọmụma a dakwasị Joab nʼisi, nakwa ezinaụlọ nna ya niile, ka a gharakwa ịhụ nʼụlọ Joab onye na-adịghị arịa ọrịa ahụ ihe ntokasị, maọbụ ọrịa ekpenta, maọbụ onye ji mkpara eji akpa akwa, maọbụ onye ga-anwụ site na mma agha, maọbụ onye ụkọ nri adịghị akọ.”
30 So Joab and his brother Abishai killed Abner for killing their brother Asahel in the battle at Gibeon. Ya mere, Joab na Abishai nwanne ya gburu Abna, nʼihi na Abna gburu nwanne ha Asahel nʼagha Gibiọn.
31 David told Joab and all the people with him, "Tear your clothes, put on sackcloth, and mourn before Abner." King David walked behind the bier. Emesịa, Devid kpọrọ Joab na ndị niile so ya sị ha, “Dọwaanụ uwe unu, yikwasị onwe unu akwa mkpe, jegharịakwanụ nʼọnọdụ iru ụjụ nʼihi Abna.” Eze, bụ Devid nʼonwe ya so ndị bu ozu Abna nʼazụ.
32 They buried Abner in Hebron, and the king wept aloud at his grave, and all the people wept. Ha liri Abna na Hebrọn. Eze na ndị Izrel niile kwara akwa nʼakụkụ ili ahụ nʼihi Abna.
33 The king sang this lament for Abner: "Should Abner have died as a fool dies? Eze bụrụ abụ akwa nʼihi Abna, sị, “O kwesiri ka Abna nwụọ dịka onye nzuzu?
34 Your hands were not bound, your feet not set in chains. You fell as one falls before the wicked." And all the people wept over him again. E kekwaghị aka gị abụọ ihe. E kekwaghị ụkwụ gị abụọ agbụ. Ị nwụrụ dịka onye ndị ajọ omume gburu.” Mmadụ niile bekwara akwa ọzọ nʼihi ya.
35 Then all the people came to urge David to eat something while it was still day, but David swore: "May our Father do so to me, and worse, if I taste bread or anything else before sunset!" Mgbe ahụ, ndị mmadụ bịakwutere Devid rịọọ ka o ritụ ihe, mgbe ìhè ụbọchị ka dị, ma Devid ṅụrụ iyi sị, “Ka Chineke mesoo m mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na m edetụ achịcha maọbụ ihe ọbụla ọzọ ọnụ tutu ruo mgbe anyanwụ dara.”
36 All the people noticed and were pleased; everything the king did pleased all the people. Ndị mmadụ nụrụ ihe o kwuru, okwu ahụ tọkwara ha ụtọ. Nʼezie, ihe niile eze mere tọrọ ha ụtọ.
37 So that day all the people and all Israel knew the king had not willed the death of Abner son of Ner. Nʼụbọchị ndị mmadụ niile nọ ebe ahụ ka Izrel niile matara na eze amaghị ihe banyere ọnwụ Abna, nwa Nea.
38 The king told his servants, "Don't you know a prince and a great man has fallen today in Israel? Devid jụrụ ndị ikom ya ajụjụ sị, “Unu ghọtakwara na onye a dara nʼIzrel taa bụ nwa eze na onye dị mkpa?
39 Today, though the anointed king, I am weak, and these men, Zeruiah's sons, are too hard for me. May our Father repay the one who does evil for his evil." Ọ bụ ezie na m bụ onye Onyenwe anyị tere mmanụ ịbụ eze, ma o nweghị ihe m pụrụ ime ụmụ ndị ikom Zeruaya ndị a, nʼihi na ha dị ike karịa m. Ka Onyenwe anyị kwụghachi onye ọjọọ ihe ọjọọ ọ mere.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]