Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

2 Samuel 4 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 When Saul's son Ish-bosheth heard Abner had died in Hebron, he lost his courage, and all Israel was shaken. Mgbe Ishboshet nwa Sọl nụrụ na Abna anwụọla na Hebrọn. Ọ tụrụ egwu. Ndị Izrel tụkwara egwu hie nne.
2 Saul's son had two raiding-band leaders: Baanah and Rechab, sons of Rimmon the Beerothite, of Benjamin—for Beeroth too is counted part of Benjamin, Nʼoge a, nwa Sọl nwere mmadụ abụọ ndị bụ ndịisi ndị na-aga apụnara ndị mmadụ ihe. Aha otu onye bụ Baana, aha onye nke ọzọ bụ Rekab. Ha abụọ bụ ụmụ Rimọn onye Beerọt, nke dị nʼebo Benjamin. A na-agụ ndị Beerọt dịka ndị Benjamin,
3 for the Beerothites had fled to Gittaim and have lived there as foreigners to this day. nʼihi na ndị Beerọt gbara ọsọ agha gbalaa Gitaim, obodo ndị Benjamin. Ha bikwa nʼebe ahụ ruo taa dịka ndị ọbịa.
4 Jonathan, Saul's son, had a boy lame in both feet. He was five when news of Saul and Jonathan came from Jezreel; his nurse grabbed him to flee, but as she rushed he fell and was crippled. His name was Mephibosheth. (Jonatan nwa Sọl nwere otu nwa nwoke dara ngwụrọ nʼụkwụ ya abụọ. Ọ gbara afọ ise mgbe akụkọ banyere Sọl na Jonatan si Jezril bịarute ha. Nwanyị na-eku ya kuuru ya bido ịgbapụ ọsọ, ma dịka ọ na-agba ọsọ, nwantakịrị nwoke ahụ dara nʼala ghọọ onye ngwụrọ. Aha ya bụ Mefiboshet.)
5 Rechab and Baanah, sons of Rimmon the Beerothite, came to Ish-bosheth's house in the heat of the day, while he took his noon rest. Nʼoge a, Rekab na Baana ụmụ Rimọn, onye Beerọt bịaruru nʼụlọ Ishboshet nʼoge ehihie, mgbe ọ nọ na-ezu ike.
6 They went into the middle of the house as if to get wheat, stabbed him in the belly, and Rechab and his brother Baanah escaped. Ha banyere nʼime ime ụlọ, dịka a ga-asị na ha na-aga iburu ọka wiiti. Mgbe ha banyere nʼebe ahụ, ha mara Ishboshet mma nʼafọ. Emesịa, Rekab na nwanne ya Baana si nʼụlọ ahụ zopu onwe ha.
7 They had entered the house while Ish-bosheth lay on his bed in his bedroom. They struck him down, killed him, cut off his head, and took it, traveling all night by way of the Arabah. Ha abatala nʼụlọ mgbe Ishboshet dinara nʼelu ihe ndina ya, nʼime ụlọ ndina ya. Mgbe ha machara ya mma, gbuo ya, ha bipụrụ ya isi. Buru isi ya gbalaga. Jee ije abalị ahụ niile gafee ọzara.
8 They brought Ish-bosheth's head to David at Hebron and told the king, "Here is the head of Ish-bosheth son of Saul, your enemy who sought your life. Today our Father has avenged my lord the king on Saul and his offspring." Ha buuru isi Ishboshet butere Devid na Hebrọn, sị eze, “Taa ka Onyenwe anyị bọọrọ onyenwe m eze ọbọ megide Sọl na mkpụrụ ya. Nke a bụ isi Ishboshet, nwa onye iro gị Sọl, onye chọsịrị ike iwepụ ndụ gị.”
9 But David answered Rechab and his brother Baanah, sons of Rimmon the Beerothite: "As surely as our Father lives, who has redeemed my life from every distress, Ma Devid zara Rekab na Baana ụmụ Rimọn onye Beerọt okwu sị ha, “Dịka Onyenwe anyị si adị ndụ, onye napụtara m site na nsogbu m niile,
10 when a man told me, 'Look, Saul is dead,' thinking he brought good news, I seized and killed him at Ziklag. That was the reward I gave him for his news! mgbe otu onye bịakwutere m gwa m na Sọl anwụọla, na-eche nʼobi ya na o wetaara m oziọma. Egburu m ya na Ziklag, si otu ahụ kwụọ ya ụgwọ oziọma ahụ o chere na ọ wetaara m.
11 How much more when wicked men kill a righteous man in his own house, on his own bed—should I not now demand his blood from you and remove you from the earth? Ọ bụladị karịa nke a, mgbe ndị ikom ajọ omume gburu nwoke onye aka ya dị ọcha nʼụlọ ya, nʼelu ihe ndina ya? M ga-ahapụ ịbọtara onye e gburu egbu ọbọ, si otu a kpochapụ unu nʼụwa!”
12 David ordered his young men, and they killed them, cut off their hands and feet, and hung the bodies by the pool in Hebron. But Ish-bosheth's head they buried in Abner's tomb at Hebron." Devid nyere ụmụ okorobịa ya iwu ka ha gbuo mmadụ abụọ ahụ. Ha gbukwara ha. Emesịa, ha bipụrụ aka ha na ụkwụ ha. Were ozu ha kwụba ya nʼakụkụ ọdọ mmiri Hebrọn. Ha wekwaara isi Ishboshet, lie ya nʼili Abna na Hebrọn.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]