Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

2 Samuel 2 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Later, David inquired of our Father, "Should I go up to one of the cities of Judah?" Our Father said, "Go up." David said, "Where?" "Hebron," he said. Dịka oge na-aga, Devid jụrụ Onyenwe anyị ase sị, “M ga-ebili gbagoo nʼotu obodo dị na Juda?” Onyenwe anyị sịrị, “Gbagoo.” Devid jụkwara, “Olee ebe m ga-agbago?” Onyenwe anyị zara, “Hebrọn.”
2 David went up there with his two wives, Ahinoam of Jezreel and Abigail, Nabal the Carmelite's widow. Devid na nwunye ya abụọ, Ahinoam onye Jezril, na Abigel nwunye ochie Nebal onye Kamel gara nʼebe ahụ.
3 David brought up his men who were with him, each with his household, and they settled in Hebron's towns. Devid kpọkwaara ndị ikom ahụ ya na ha so, onye ọbụla nʼime ha durukwaara ezinaụlọ ya, ga biri na Hebrọn na obodo ndị ọzọ gbara ya gburugburu.
4 Then Judah's men came and anointed David king over Judah's house there. They told David that Jabesh-gilead's men had buried Saul. Ndị ikom Juda bịakwutere Devid na Hebrọn. Tee ya mmanụ ịbụ eze ebo Juda niile. Mgbe Devid nụrụ na ọ bụ ndị ikom Jebesh Gilead liri Sọl,
5 He sent messengers to the men of Jabesh-gilead: "May our Father bless you for this kindness to your lord Saul, burying him. o zigaara ha ndị ozi ka ha sị ha, “Ka Onyenwe anyị gọzie unu nʼihi obiọma unu gosiri site nʼili Sọl, nna unu ukwu, nʼụzọ kwesiri ekwesi.
6 Now may our Father show you kindness and faithfulness; I too will treat you well for doing this. Ka Onyenwe anyị gosikwa unu obiọma na ikwesi ntụkwasị obi. Mụ onwe m ga-egosikwa unu otu ụdị amara a, nʼihi ihe a unu mere.
7 Be strong and take courage, for your master Saul is dead, and Judah's house has also anointed me king over them." Ma ugbu a, bụrụnụ dike na dimkpa, nʼihi na Sọl nna unu ukwu anwụọla. Ọzọkwa, ndị Juda niile eteela m mmanụ ịbụ eze ha.”
8 But Abner son of Ner, Saul's army commander, took Ish-bosheth son of Saul and brought him across to Mahanaim. Ma Abna nwa Nea, ọchịagha ndị agha Sọl edurularịị Ishboshet, nwa Sọl, dubata ya nʼobodo Mahanaim.
9 He made him king over Gilead, over the Ashurites, over Jezreel, over Ephraim, over Benjamin—over all Israel. Ọ nọrọ nʼebe ahụ mee ya eze ndị Gilead, ndị Ashuri na ndị Jezril; na ndị Ifrem, ndị Benjamin na Izrel niile.
10 Ish-bosheth son of Saul was forty when he became king over Israel; he reigned two years. But Judah's house followed David. Ishboshet nwa Sọl gbara iri afọ anọ mgbe ọ ghọrọ eze ndị Izrel. Ọ chịkwara afọ abụọ. Ma otu ọ dị, ndị Juda niile nọgidere nʼokpuru Devid.
11 David was king in Hebron over the house of Judah for seven years and six months. Ogologo oge niile Devid chịrị dịka eze ndị Juda na Hebrọn bụ afọ asaa na ọnwa isii.
12 Abner son of Ner, with Ish-bosheth son of Saul's servants, left Mahanaim for Gibeon. Otu ụbọchị, Abna nwa Nea, duuru ndị agha Ishboshet nwa Sọl site na Mahanaim jee Gibiọn.
13 Joab son of Zeruiah and David's servants also went out and met them together at Gibeon's pool—one side sitting on one bank, the other on the opposite bank. Ma Joab, nwa Zeruaya dukwaara ndị agha Devid pụọ izute ha nʼọdọ mmiri Gibiọn. Otu ndị nọdụrụ ala nʼotu akụkụ ọdọ mmiri, ndị nke ọzọ nʼakụkụ ọzọ nke ọdọ mmiri ahụ. Ha cherịtara onwe ha ihu.
14 Abner said to Joab, "Let the young men get up and compete before us." Joab said, "Let them get up." Abna gwara Joab sị, “Ka ụfọdụ ụmụ okorobịa pụta nʼihu anyị maa aka mgba.” Joab sịrị, “Ka ha pụta.”
15 So they got up and crossed over by count, twelve for Benjamin and Ish-bosheth son of Saul, twelve from David's servants. Ha pụtara ka a gụpụtachara ha. Ha dị mmadụ iri na abụọ site nʼetiti ndị agha Benjamin na Ishboshet nwa Sọl, mmadụ iri na abụọ site nʼetiti ndị agha Devid.
16 Each man gripped his opponent's head and drove his sword into his side, and they fell together. So the place in Gibeon was named Helkath-hazzurim. Nwoke ọbụla jidere ibe ya nʼisi were mma agha ya manye ya nʼakụkụ, si otu a wetara onwe ha ọnwụ. Ọ bụ nke a mere e ji kpọọ ebe ahụ dị na Gibiọn, Helkat Hazurim, nke pụtara Ala mma agha.
17 The fighting that day was very fierce; Abner and Israel's men fell before David's servants. Agha siri ike dara nʼụbọchị ahụ. Ma ndị agha Devid lụgburu Abna na ndị agha Izrel.
18 Zeruiah's three sons were there: Joab, Abishai, and Asahel—Asahel as fast-footed as a wild gazelle. Ụmụ Zeruaya atọ nọ nʼebe ahụ, ya bụ, Joab, na Abishai na Asahel. Asahel bụ nwoke na-agba ọsọ dịka mgbada.
19 He chased Abner, turning neither to the right nor to the left as he pursued him. Ọ chụwara Abna ọsọ, ọ dịghị mgbe ọ tụgharịrị gaa nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe mgbe ọ nọ na-achụ ya ọsọ.
20 Abner looked back and said, "Is that you, Asahel?" "It is," he answered. Mgbe Abna lere anya nʼazụ hụ ya ka ọ na-abịa, ọ kpọrọ ya oku sị ya, “Ọ bụ gị Asahel?” Asahel zara sị, “Ọ bụ m.”
21 Abner told him, "Turn right or left, seize one of the young men, take his gear." But Asahel refused to stop chasing him. Abna gwara ya okwu sị ya, “Tụgharịa nʼakụkụ aka nri maọbụ aka ekpe, jide otu nʼime ụmụ okorobịa ndị a. Napụ ya ngwa agha ya niile.” Ma Asahel akwụsịghị ịchụ ya ọsọ.
22 Abner told Asahel again, "Turn back. Why force me to strike you down? How could I face your brother Joab?" Abna gwara Asahel ọzọ sị, “Laghachi azụ. Kwụsị ịchụ m ọsọ! Gịnị mere m ga-eji tigbuo gị? Olee otu m ga-esi lekwasị nwanne gị Joab anya nʼihu ma m gbuo gị?”
23 He refused to turn aside, so Abner struck him in the stomach with the butt of his spear; it came out through his back. He fell there and died on the spot. Everyone who came to where Asahel had fallen and died stood still. Ma Asahel jụrụ ịlaghachi azụ. Nʼihi ya, Abna weere isi ùbe ya mapuo ya afọ. Ùbe ahụ sikwa ya nʼazụ pụta. Ọ dara nʼala, nwụọ otu mgbe ahụ. Ndị niile bịaruru ebe ahụ ọ dara nwụọ kwụsịrị. Ha agakwaghị nʼihu ịchụ ndị ọzọ.
24 Joab and Abishai pursued Abner; at sunset they reached the hill of Ammah, near Giah on the way to the wilderness of Gibeon. Ma Joab na Abishai chụgidere Abna ọsọ. Anwụ adaala mgbe ha bịarutere nʼugwu nta Ama, nke dị Gịa nso, nʼụzọ e si aga nʼọzara Gibiọn.
25 Benjamin's men gathered behind Abner, formed one band, and stood atop a hill. Ndị ikom Benjamin chịkọtara onwe ha ọnụ dịnyere Abna. Ha niile guzooro nʼelu otu ugwu dịka otu usuu ndị agha.
26 Abner called to Joab: "Must the sword devour forever? Don't you know this will end bitterly? How long until you tell the people to turn back from chasing their brothers?" Mgbe ahụ, Abna kpọrọ Joab oku sị ya, “Ọ bụ ruo ole mgbe ka anyị ga na-eji mma agha na-egburita onwe anyị? Olee mgbe ị ga-akpọghachi ndị gị ka ha hapụ ịchụ na igbu ụmụnne ha? Ị maghị na ihe dị otu a ga-eweta obi ilu?”
27 Joab said, "As surely as our Father lives, if you had not spoken, the people would have kept pursuing their brothers until morning." Joab zara sị, “Eji m aha Chineke ṅụọ iyi na-asị na ọ bụrụ na i gbara nkịtị, ndị a gaara achụso ụmụnna ha ọsọ na-akwụsịghị ruo nʼụtụtụ echi.”
28 Joab blew the trumpet; all the troops stopped, no longer pursuing Israel or fighting. Mgbe ahụ, Joab fụrụ opi ike ya. Nke a mere ka ndị ya kwụsị ịchụ ndị Izrel. Ha kwụsịkwara ibu agha.
29 Abner and his men marched through the Arabah all that night, crossed the Jordan, went through all Bithron, and reached Mahanaim. Nʼabalị ahụ, Abna na ndị ikom ya jere ije gafee ndagwurugwu Jọdan, gabigakwa osimiri Jọdan, jee ije nʼụtụtụ echi ya tutu ha eruo Mahanaim.
30 Joab turned back from chasing Abner, gathered all the troops, and found nineteen of David's men missing, besides Asahel. Joab kwụsịrị ịchụ Abna ọsọ, ọ chịkọtara ndị agha niile. Mgbe ọ gụrụ ha ọnụ, ọ chọpụtara na mmadụ iri na itoolu nʼime ndị ikom Devid, tinyere Asahel nwanne ya, bụ ndị na-alọtaghị agha.
31 But David's servants struck down 360 of the men of Benjamin who were with Abner. Ma ndị ikom Devid gburu narị ndị agha Benjamin atọ na iri isii, bụ ndị so Abna.
32 They carried Asahel, buried him in his father's tomb in Bethlehem; Joab and his men walked all night, reaching Hebron by dawn. Emesịa, Joab na ndị agha ya buuru ozu Asahel gaa lie ya na Betlehem, nʼili nna ya. Ha jere ije abalị ahụ niile tutu ha erute Hebrọn mgbe chi bidoro ịbọ.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]