Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

2 Samuel 1 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 After the death of Saul, David returned from defeating the Amalekites and stayed in Ziklag two days. Mgbe Sọl nwụsịrị, Devid si ebe ọ gara tigbuo ndị Amalek lọghachi. Devid nọrọ ụbọchị abụọ na Ziklag.
2 On the third day a man came from Saul's camp, clothes torn, dirt on his head. Reaching David, he fell to the ground and bowed. O ruo, nʼụbọchị nke atọ, otu nwoke si nʼọmụma ụlọ ikwu Sọl bịakwutere ya. Uwe nwoke a yi nʼahụ dọwara adọwa. Isi ya dịkwa aja aja. Ọ batara daa nʼala nʼihu Devid nʼọnọdụ inye ya nsọpụrụ.
3 David asked him, "Where have you come from?" "I escaped from the camp of Israel," he replied. Devid jụrụ ya sị, “Ebee ka i si bịa?” Nwoke ahụ zara sị, “Esi m nʼọmụma ụlọ ikwu ndị Izrel gbapụta.”
4 "What happened?" David asked. "Tell me." He said, "The people fled the battle. Many fell and died. Saul and his son Jonathan are dead too." Devid jụrụ ya sị, “Gịnị mere? Biko gwa m.” Nwoke ahụ zara sị, “Ndị agha Izrel niile agbaala ọsọ. Ọtụtụ nʼime ndị agha Izrel anwụọkwala. Sọl na Jonatan nwa ya nwụkwara!”
5 David asked the young man who brought the news, "How do you know Saul and his son Jonathan are dead?" Devid jụrụ ya sị, “Olee otu i si mata na Sọl na Jonatan anwụọla?”
6 The young man said, "I happened onto Mount Gilboa, and there was Saul, leaning on his spear, the chariots and horsemen bearing down on him. Nwokorobịa ahụ sịrị ya, “Ọ dapụtara na m nọ nʼugwu Gilboa hụ Sọl mgbe ọ dabeere nʼùbe ya. Mgbe ahụ ụgbọ agha ndị iro na ndị na-agba ịnyịnya agha na-esosi ya ike.
7 He turned around, saw me, and called to me. I said, 'Here I am.' Mgbe ọ hụrụ m, ọ kpọrọ m ka m bịakwute ya. Azara m ya sị, ‘Gịnị ka m nwere ike ime?’
8 He asked me, 'Who are you?' I told him, 'I am an Amalekite.' “Ọ jụrụ m sị, ‘Ị bụ onye?’ “Azara m ya sị, ‘Abụ m onye Amalek.’
9 He said to me, 'Stand over me and kill me; anguish has seized me, but I'm still alive.' “Ọ sị m, ‘Biko, bịa guzo nʼakụkụ m ka ị gbuo m, nʼihi na ọ bụ ezie na m dị ndụ, ma anọ m nnọọ nʼoke ihe mgbu nke ọnwụ.’
10 So I stood over him and killed him, since I knew he wouldn't survive his fall. Then I took the crown from his head and the band on his arm, and brought them here to my lord." “Ya mere, eguzoro m nʼakụkụ ya, gbuo ya, nʼihi na amaara m na ọ gaghị adị ndụ tee anya. Ọ bụkwa mgbe m gbusịrị ya ka m kpupụrụ ya okpueze dị ya nʼisi, gbapụtakwa ya mgbaaka dị nʼogwe aka ya, chịrị ha, ka m chịtara gị ha, onyenwe m.”
11 Then David grabbed his own clothes and tore them, and so did all the men with him. Mgbe Devid na ndị ikom ya nụrụ ihe ndị a. Ha dọwara uwe ha.
12 They mourned, wept, and fasted until evening for Saul, his son Jonathan, our Father's people, and the house of Israel, because they had fallen by the sword. Ha ruru ụjụ. Kwaa akwa. Bukwaa ọnụ ruo oge anyasị nʼihi Sọl na Jonatan nwa ya nwoke, na nʼihi ndị agha Onyenwe anyị na ụlọ Izrel. Nʼihi na ha dara site na mma agha.
13 David asked the young man who brought the news, "Where are you from?" He said, "I'm the son of a foreigner, an Amalekite." Mgbe ahụ, Devid jụrụ nwokorobịa ahụ wetara ozi ahụ ajụjụ sị, “Olee ebe i si bịa?” Ọ zara sị ya, “Abụ m onye ọbịa, onye Amalek.”
14 David said, "How were you not afraid to raise your hand to kill our Father's anointed?" Devid jụrụ ya sị, “Gịnị mere i ji setịpụ aka gị, na-atụghị ụjọ, tigbuo onye Onyenwe anyị tere mmanụ?”
15 David called one of his young men and said, "Go, strike him down." He struck him, and he died. Devid kpọrọ otu nʼime ndị ikom ya sị ya, “Gbuo ya!” Nwoke ahụ weere mma agha gbuo ya.
16 David had said to him, "Your blood is on your own head, for your own mouth testified against you when you said, 'I killed our Father's anointed.'" Mgbe ahụ Devid sịrị ya, “Ọbara gị laa gị nʼisi, nʼihi na ị ji ọnụ gị kwupụta sị, ‘Egburu m onye Onyenwe anyị tere mmanụ.’ ”
17 Then David sang this lament over Saul and his son Jonathan, Emesịa, Devid depụtara abụ akwa a nʼihi Sọl na Jonatan.
18 and ordered the people of Judah taught this lament, called The Bow; it is written in the Book of Jashar: O nyere iwu ka akụziere ndị Juda, abụ ùta a. E dere ya nʼime akwụkwọ Jesha.
19 "Your glory, Israel, lies slain on your heights. How the mighty have fallen! “Ebube gị, gị Izrel, abụrụla ihe e gburu nʼebe gị niile dị elu. Lee ka ndị bụ dike si daa!
20 Don't tell it in Gath, don't proclaim it in the streets of Ashkelon, or the daughters of the Philistines will rejoice, the daughters of the uncircumcised will exult. “Ekwutela ya na Gat. Ekwusala ya nʼokporoụzọ Ashkelọn. Ka ada ndị Filistia ghara ịṅụrị ọṅụ. Ka ụmụ inyom ndị a na-ebighị ugwu ghara iti mkpu ọṅụ.
21 Mountains of Gilboa, may you have no dew or rain, no fields yielding offerings. For there the shield of the mighty was defiled, the shield of Saul, no longer rubbed with oil. “Unu ugwu Gilboa, ka igirigi maọbụ mmiri ozuzo ghara ịbịakwasị unu. Ka mmiri ozuzo gharakwa izokwasị nʼaja mbuli elu unu. Nʼihi na nʼelu unu ka a nọ merụọ ọta ndị dị ike. E, ọta Sọl, nke a na-adịghị etekwa mmanụ.
22 From the blood of the slain, from the flesh of the mighty, the bow of Jonathan did not turn back, the sword of Saul did not return unsatisfied. “Site nʼọbara ndị e gburu egbu, site nʼanụ ahụ ndị dị ike. Ụta Jonatan alọghachighị azụ. Mma agha Sọl agbaghịkwa aka lọghachi.
23 Saul and Jonathan, beloved and cherished in life, in death they were not parted. They were swifter than eagles, stronger than lions. Sọl na Jonatan, na ndụ ha bụ ndị a hụrụ nʼanya. Ndị jupụtara nʼamara. Ma nʼọnwụ, nkewa ọbụla adịghị nʼetiti ha. Ha dị gara gara karịa ugo. Ha dị ike karịa ọdụm.
24 Daughters of Israel, weep for Saul, who clothed you in scarlet and finery, who adorned your garments with ornaments of gold. “Ụmụada Izrel, kwaaranụ Sọl akwa. Onye na-eji uwe uhie uhie chọọ unu mma. Onye ji uwe na ihe ịchọ mma ọlaedo chọọ unu mma.
25 How the mighty have fallen in the thick of battle! Jonathan lies slain on your heights. “Lee ka ndị dị ike si daa nʼetiti ọgbọ agha. E gbuola Jonatan nʼelu ugwu;
26 I grieve for you, my brother Jonathan; you were very dear to me. Your love for me was wonderful, surpassing the love of women. ana m eruru gị ụjụ, gị Jonatan, nwanne m nʼihi na ihe dị oke ọnụahịa ka ị bụụrụ m. Ịhụnanya i nwere nʼebe m nọ dị omimi karịa ịhụnanya ndị nwanyị.
27 How the mighty have fallen! The weapons of war have perished." “Lee ka ndị dị ike si daa! Ngwa agha niile abụrụla ihe lara nʼiyi!”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]